TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ókwú Tinubu nyèrè n’ụ́bọ̀chị̀ ńchètá ńnwéré onwe Naijiria ọ̀ bụ̀chà ézíókwu?
Share
Latest News
No, Emefiele no return N4trn to FG
Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà
Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn
A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba
FACT CHECK: No, Emefiele didn’t return N4trn to FG
FAKE NEWS ALERT: Akume hasn’t been replaced as SGF, says presidency
Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró
Slurs, smears, slander… how gendered disinformation targets high-profile Nigerian women
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ókwú Tinubu nyèrè n’ụ́bọ̀chị̀ ńchètá ńnwéré onwe Naijiria ọ̀ bụ̀chà ézíókwu?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published October 11, 2024 13 Min Read
Share

N’ụbọchị Tuzdee, onye isi ala Bola Tinubu sonyere ndị Naijiria n’emume ụbọchị ncheta nwereonwe nke afọ iri isii n’anọ (64 years) nke Naijiria — nke bụ nsonye nke abụọ kemgbe ọ malitere ọrụ ya dịka onye isi ala n’ụbọchị iri abụọ n’itoolu nke ọnwa May 2023.

Tinubu kwuru ọtụtụ ihe mgbe ọ na-agụputa okwu ya n’ụbọchị ahụ, dịka na ụfọdụ iwu na mgbanwe o hibere amịtala ezi mkpụrụ kamgbe ọ batara n’ọchịchị.

TheCable nyochara ụfọdụ n’ime nkwupụta ya, ihe ndị a k’anyị chọpụtara.

OKWU MBỤ: Tinubu kwuru na Naijiria nwetara ego azụmahịa mba ofesi a na-akpọ foreign direct investment (FDI) ruru ihe karịrị ijeri dollar iri atọ ($30) n’afọ 2023 n’ihi iwu akụ n’ụba o hibegasịrị.

“Akụ n’ụba anyị na-agabịga ụfọdụ nwogharị iji hụ na ọ bụ ọka ibe,” onye isi ala kwuru.

“Ọ bụrụ na anyị edozighị mmejọ ego nke butere mmebi akụ na ụba a, obodo anyị agaghị enwe ọdịnihu nwere ezi ntụkwasị obi.

“Daalụ maka mgbanwe ndị a, obodo anyị nwetara ntinye ego investment si mba ọzọ nke karịrị ijeri dollar iri atọ ($30) n’afọ gara aga.”

FDI bụ ihibe ụlọ ọrụ ma ọ bụ azụmahịa n’obodo ọbụla site n’aka onye na-etinye ego akpọrọ “investor” nke si mba ọzọ.

ŃNYÒCHÁ

N’ụbọchị iri n’asaa nke ọnwa Febrụwarị nke afọ 2024, Doris Uzoka-Anite, onye minista na-ahụ maka ụlọ ọrụ, azụmahịa, na ntinye ego n’azụmahịa bụ “investment”, kwuru na Naijiria nwetara ihe ruru ijeri dollar iri atọ ($30) na nkwekọrịta ntinye ego nke si n’aka ndị na-etinye ego dị iche iche.

Uzoka-Anite kwuru na nkwenye azụmahịa ndị a ga-amịta mkpụrụ n’ime afọ ise ruo asatọ.

Na mgbakwunye, ulọ ọrụ na-ahụ maka ḿgbàkọ́ bụ Nigeria Bureau of Statistics (NBS), na-ebiputa ozi mbubata akụ nke ụlọrụ ahụ bụ “capital importation report”. Ozi na-enwe n’ime ya nkọwa ntinye ego nke si mba ọzọ bata Naijiria kwa ọnwa anọ.

Ozi a kewara mbubata ego n’ime Naijiria n’ụzọ atọ nke gụnyere ntinye ego si mba ọzọ bụ foreign direct investment (FDI), itinye ego na ngwugwu si mba ọzọ bụ foreign portfolio investment (FPI), ya na ntinye ego ndị ọzọ.

Dịka ozi anyị nwetara site n’ụlọrụ NBS, bido n’ọnwa April afọ 2023 mgbe Tinubu batara n’ọchịchị ruo ngwụcha ọnwa March nke afọ 2024, Naijiria nwetara ntụnye ego sị mba ọzọ bụ FDI dị nde dollar narị anọ n’iri anọ n’asatọ ($448.95 million).

N’otu ízù ahụ, ntinye ego na ngwugwu si mba ọzọ bụ FPI, nke gụnyere ntịnye ego na ńgwá ahịa stocks na bonds pụtara ijeri dollar narị abụọ n’ụwa nde iri ise n’asatọ ($2.58 billion).

Nnyocha ọzọ TheCable mere gosịrị na Naijiria nwetara otu ijeri dollar na ụma nde atọ ($1.03 billion) na ngwụcha ọnwa Julai sitere na mba ọzọ, nke gụnyere FDI, ntinye ego na ngwugwu si mba ọzọ, ya na ntinye ego n’ahịa ndị ọzọ.

Ọnụ ọgụgụ a gbadara ruo nde dollar narị isi n’iri ise n’anọ n’ụma puku iri isi n’ise ($654.65 million) na ngwụcha ọnwa Septemba afọ 2023, ma gbagoo ruo otu ijeri dollar na ụma nde itoolu ($1.09 billion) na ngwụcha ọnwa December nke otu afọ ahụ.

K’osiladị n’ọnwa March 2024, ntụnye isi ego bụ́ capital investment gbagọrọ ruo ijeri dollar atọ na ụma nde iri atọ n’asatọ ($3.38 billion).

Na nchịkọta , Naijiria nwetara ijeri dollar isii na ụma nde iri n’anọ ($6.14 billion) na ntinye ego si mba ọzọ n’etiti ọnwa atọ mbụ n’afọ 2023 na ọnwa atọ mbụ nke afọ 2024.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Site n’ozi si na NBS, nkwupụta Tinubu na mba ahụ natara karịa ijeri dollar iri atọ ($30 billion) na itinye ego si mba ọzọ n’afọ 2023 abụghị eziokwu.

Dịka onye minista na-ahụ maka ụlọ ọrụ, azụmahịa, na ntinye ego kwuru, ihe Naijiria nwetara bụ nkwekọrịta ntinye ego dị ijeri iri atọ ($30 billion) n’ime afọ ise ruo asatọ, nke n’abụghị ntinye ego si mba ọzọ dịka onye isi ala kwuru.

OKWUO ABỤO: Tinubu kwuru na ọchịchị ya natara ego ndokwa si mba ọzọ bụ foreign reserve karịrị ijeri dollar iri atọ n’atọ ($33 billion), bụ nke o kwuru n’ọchịchị ya agbakwụnyela ma jide nya bụ ego n’ọnụ ijeri dollar iri atọ n’asaa ($37 billion).

“Anyị nwetara nchekwa ego karịrị ijeri dollar iri atọ n’atọ ($33 million) n’ọnwa iri n’isii gara aga. Kemgbe ahụ, anyị a kwụghachiela ụgwọ ego mba ọzọ bụ forex dị ijeri dollar asaa ($7 billion) anyị zutere oge m batara n’ọchịchị. Anyị akwughachiela ụgwọ ụtụ ways and means nke karịrị tari naira iri atọ (N30 trillion),” ọ kwuru.

“Anyị emeela ka nkwụghachi mmụba ụgwọ anyị ji gbatuo site na pasentị iri itoolu n’asaa ruo pesentị iri isii n’asatọ (97 ruo 68%). N’agbanyeghị nke a niile, anyị enweela ikike ichekwa akụ anyị si mba ọzọ bụ foreign reserve nke dị ijeri dollar iri atọ n’asaa ($37 billion). Anyị na-aga n’ihu na-emezu ọrụ anyị niile ma na-akwụ ụgwọ anyị jigasị.”

ŃYÓCHÁ

Ozi ikpeazụ ewepụtara site n’ụlọ akụ Central Bank of Nigeria (CBN) n’ụbọchị iri n’isii nke ọnwa May nke afo 2023, ụbọchị atọ tupu onye isi ala ebido ọchịchị ya, gosịrị na nchekwa akụ si mba ọzọ bụ foreign reserve dị ijeri dollar iri atọ n’ise na ụma nde iri n’anọ ($35.14 billion)—nke jiri ijeri dollar abuo na ụma otu nde ($2.1 billion) karia ihe Tinubu kwuru.

K’osiladị, ọnụ ọgụgụ ọhụrụ sitere na CBN nke ụbọchị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Septemba nke afọ 2024, gosịrị na nchekwa akụ si mba ọzọ gbagọrọ ruo ijeri dollar iri atọ n’asatọ na ụma nde ise ($38.05 billion).

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

N’ihi na nchekwa akụ na ụba Naijiria si mba ọzọ jiri pesentị asato na ụma iri abụọ n’asatọ gbagoo elu (8.28%), nkwuputa na ọchịchị Tinubu natara ụgwọ nchekwa akụ dị ijeri dollar iri atọ n’atọ ( $33 billion) abụchaghị eziokwu. Ezi ọnụọgụ ya bụ ijeri dollar iri atọ n’ise na ụma iri na anọ ($35.14 billion) mgbe ọ malitere ọrụ.

OKWU NKE ATO: Tinubu kwuru na ọchịchị ya akwuchala ijeri dollar asaa ($7 billion) bụ ụgwọ azụmahịa si mba ọzọ akpọrọ foreign exchange nke o zutere dịka ọ batara n’ọchịchị.

“Ka mgbe ahụ, anyị akwụchaala ụgwọ azụmahịa nke ego mba ọzọ dị ijeri dollar asaa ($7 billion),” Tinubu kwuru.

ŃNYÒCHÁ

Ụgwọ ego obodo ọzọ ndị enwebeghi ike ịkwụ ndị mmadụ bụ FX backlog bụ ayịyọ ego mba ọzọ nke obodo ọzọ n’ewebeghị ike ịkwụghachị.

N’ụbọchị ise nke ọnwa Febrụwarị, Olayemi Cardoso, onye isi ụlọ ụlọ akụ CBN, kwuru na ọ natara ụgwọ ego si mba ọzọ dị ijeri dollar asaa ($7 billion) mgbe ọ batara dịka onye isi ụlọrụ ahụ n’ọnwa Septemba nke afọ 2023.

Ngbakọta ụgwọ a na-egosị na e nwere arịrịọ ndị fọdụrụ ka nya bụ ụlọrụ lebanye anya na ya ụfọdụ ndị nke sitere na azụmahịa, ndị na-etinye ego, ma ọ bụ ndị mmadụ nkiti gbasara inweta ego si mba ọzọ iji kwado azụmahịa gbasara mba ozo — dịka ibubata ahịa na Niajiria, ịkwụhachi ụgwọ eji-eji, ma ọ bụ itinye ego mba ọzọ n’azụmahịa dị na Naijiria — nke CBN n’enwebeghị ike ịkwụcha n’ihi enweghị ego mba ọzọ bụ FX n’oge ahụ.

N’ubochi iri abụọ n’isii nke ọnwa Septemba 2023, onye isi ụlọ ọba ego CBN kwuputara na ụlọ akụ kachasị elu na-agba mbọ ịkwụghachị ụgwọ FX dị ijeri dollar asaa ($7 billion) o jibu n’ụgwọ.

N’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa March 2024, Hakama Sidi Ali, onye ntụziaka ngalaba nzipu ozi nke ụlọ aku CBN, kwuru na nya bụ ụlọ akụ emeela ka a kwụọ ụgwọ niile ego mba ọzọ bụ FX dị mkpa o ji n’ụgwọ.

N’ubọchị abụọ gachara, Kingsley Nwokeoma, onye isi òtù n’anọchịta anya ụgbọelu si mba ọzọ na Naijiria bụ Association of Foreign Airlines and Representatives in Nigeria (AFARN), kpọrọ maka ihe aka ebe gbasara ụgwọ FX a CBN kwuru na ọ kwuru.

Nwokeọma kwuru ka ụlọ akụ CBN weta akwụkwọ ikike o jiri kwụọ nya bụ ụgwọ, n’ihi na ha enwetabeghị ego ọbụla.

K’osiladị, n’ụbọchị abụọ nke ọnwa June 2024, otu n’ahụ maka ụgbọelu si mba ọzọ bụ International Air Transport Association (IATA) kwuru na ego dị pasentị iri itoolu n’asatọ (98%) nke ego ụgbọala dị na Naijiria bụ nke akwụchagoro.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Dịka nkwupụta si n’ụlọ aku CBN bụ ụlọ ọrụ n’ahụ maka ego ndị mba ọzọ bụ FX ya na otu IATA, ndị n’anọchịta anya ụgbọelu si obodo ndị ọzọ na Naijiria, okwu onye isi ala bụ eziokwu.

OKWU NKE ANỌ: Tinubu kwuru na ọchịchị ya akwụchala ụgwọ ụtụ akpọrọ ways and means nke karịrị tari naira iri atọ (N30 trillion).

“Anyị akwụchala ụgwọ ụtụ ways and means anyị ji nke dị tari naira iri atọ,” Tinubu kwuru.

ŃNYÒCHÁ

Ways and Means bụ mgbazinye ego ụlọ akụ CBN na-enye ọchịchị etiti iji nyere ya aka ibiri ego site na ụlọ oba ego ahu, nke ga-enyere y’aka zute ụfọdụ mkpa ya n’obere oge.

Ọna-enyere gọọmenti etiti aka okachasi mgbe ego kochara ya n’akpa.

N’ụbọchị iri abụọ n’atọ nke onwa May afo 2023, ụlọ omeiwu senate kwadoro arịrịọ Tinubu ịgbanwe ụgwọ tari naira asaa n’ụma ijeri atọ (N7.3 trillion) nke obi tere n’ọnọdụ ụtụ ways and means a n’aka ụlọ akụ CBN k’oburuzie ihe ga akpata ego dịka stocks.

N’agbanyeghị na ụlọ ọrụ n’ahụ maka ụgwọ Naijiria ji bụ Debt Management Office (DMO) ewepụtabeghị akwụkwọ aka ebe mgbanwe ụgwọ tari naira asaa n’ụma ijeri atọ (N7.3 trillion) nke n’enye ego ahụ ikike ibuzi ụzọ ịkpata ego nye Naijiria, ozi gbasara ụgwọ tari naira iri abụọ n’abụọ n’ụma ijeri asaa (N22.7 trillion) ọchịchị Buhari gbanwere gosịrị n’oge nkwụghachi nya bụ ego bụ afọ iri anọ (40 years), nke pụtara na isi ego na mmụba ego ahụ bụ nke a ga-akwụghachị n’ime afọ anọ.

Na mgbakwunye, e nwere mmabido iwu afọ atọ n’isi ego ahụ nke si na onye nke na-ebiri ego ahụ nwere ike ma ya akwụghachila ụgwọ ahụ n’oge ahụ.

Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na e nwere mmụba ego pasentị itoolu dị n’elu nya bụ ego kwa afọ. Ebe ọchịchị etiti ga-abiazi kwughachie pesentị itoolu (9%) fọdụrụnu dịka mmụba nya bụ ego.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu Tinubu na ọchịchị ya a kwụghachiela ụgwọ ọjị CBN n’ụdị ways and means bụ asị, maka na akwụkwọ ozi DMO kwuru na a gbanwere nya bụ ụgwọ ka ọ buru ụzọ gọọmentị ga-esi nweta ego bụ securitisation na mgbatị afọ iri anọ.

TAGGED: fact check in Igbo, Fact check on Tinubu’s speech, news in Igbo, Tinubu’s Independence speech 2024

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu October 11, 2024 October 11, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

No, Emefiele no return N4trn to FG

One video wey dey waka for social media show as Facebook user claim sey Godwin…

July 4, 2025

Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ti ń pín lórí àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára,…

July 4, 2025

Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn

Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru…

July 4, 2025

A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba

Wani faifan bidiyo da ke yawo a kafafen sada zumunta ya nuna wani ma’abocin Facebook…

July 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

No, Emefiele no return N4trn to FG

One video wey dey waka for social media show as Facebook user claim sey Godwin Emefiele, di forma govnor of…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ti ń pín lórí àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára, tí ó ṣe àfihàn ẹni…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn

Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru na Godwin Emefiele, onye bụbu…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba

Wani faifan bidiyo da ke yawo a kafafen sada zumunta ya nuna wani ma’abocin Facebook yana ikirarin Godwin Emefiele, tsohon…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?