N’ụbọchị iri abụọ n’isii nke ọnwa Ọktoba, Dino Melaye kwụrụ na FIFA nyere Naijiria na Kenya otu nde Dollar na narị abụọ ($1.2 million) ka ha jiri ruo ogige ekwuregwu stadium n’obodo ha.
N’ozi ọ bipụtara na X, onye a zọburu ọkwa gọvanọ na steeti Kogi, bipụtara ihe ngosi nke ụlọ egwuregwu abụọ ahụ nke a sịrị na FIFA kwadoro, ma kwụọ na ndị ndu Naijiria ejighị ego ahụ mee ihe dị mma ịle anya.
O kesara ihe ngosi nke obere ụlọ egwuregwu FIFA kwadoro dị na Birnin-Kebbi nke steeti Kebbi, n’ụlọ egwuregwu Talanta dị na Kenya.
“Ebumnuche ndị FIFA bụ ka obodo abụọ ahụ wuo ụlọ egwuregwu maka mmepe akum bọọlụ. Agbụrụ anyị efuola ọhia, anyị na-eme emume ndị ohi, anyị na-asọpụrụ ndị omekome,” ozị ahụ kwuru.
Ozị ahụ nwetara echiche ihe karịrị narị isii na iri abụọ n’otu (621k), nkwenye puku asatọ(8k), na nkesa puku abụọ na narị ise (2.5k).
N’ihe dị obere iche na ozị nke Melaye biputara, onye ọzọ na X bụ @CitizenObs kwuru na mba abụọ ahụ natara nde dollar iri ($10 million) n’otu n’otu maka ịrụ ụlọ egwuregwu ndị ahụ. Onye ahụ kesakwara otu ihe ngosi nke Melaye kesara.
ÓKPỤ́RỤ́ ÁKỤ́KỌ́

Na nso nso a, ọtụtụ ndị na soshal midia ebola ụlọ bọọlụ Naijiria bụ Nigeria Football Federation (NFF) ebubo na Naijiria mefuru ego e nyere ha ka ha jiri ruo ogige akum bọọlụ.
Ụfọdụ kwụrụ na NFF emepụtaghi ihe ahụrụ anya site n’ego FIFA nyere ha maka ịkwalite bọọlụ nke ndị ntorobịa ya na mmepe ụlọ egwuregwu.
N’obi ngbagha uka ahụ bụ ụlọ egwuregwu nta nke FIFA kwadoro ehibere na Birnin-Kebbi. A malitere iwuli ụlọ egwuregwu ahụ nke a sịrị na e jiri otu nde dollar na ụma otu narị na ịtolu ($1.19) ruo na 2020 ma mepee ya na 2023.
FIFA na-akwado oru a site na atụmatụ ya a kporo ‘Forward Programme’, nke ebumnuche ya bụ inye obodo niile nkwado zuru òkè maka mmepe ogige akum bọọlụ.
Ụlọ egwuregwu ahụ bụ otu n’ime oru abụọ nke egoya si na atutumatu ahụ na Naijiria. Oru nke ọzọ bụ ụlọ egwuregwu nta dị na Ugborodo na steeti Delta.
ÓGỊ́GÉ ÉGWỤ́RÉGWỤ́ TALANTA DỊ̀ NÀ KENYA

Stadium Talanta bụ ebe egwuregwu nke a ka na-ewulị na Nairobi, Kenya. Ana-atụ anya ịji ya hibe egwuregwu asọmpi Africa Cup of Nations (AFCON), nke Kenya, Tanzania na Uganda ga ehibe n’afọ 2027.
Stadium ahụ ga-enwe ndị na-ekiri egwuregwu ruru puku iri isii (60,000) mgbe a ruchara ya. Obu gọọmenti Kenya kwụrụ ụgwọ ọrụ ahụ niile ma nye ụlọrụ China Road and Bridge Corporation (CRBC) ka ha ruo ya bụ ụlọ egwuregwu.
Dịka ụlọ oba ozi The Times Kenya si kwuo, Talanta Sports City Stadium “ga-efu onye na-akwụ ụtụ n’obodo ahụ Shilling ijeri iri anọ n’anọ n’uma puku asaa (Sh44.7),” nke a na-atụ anya na ọ gbakọtara ihe dị ka nde narị dollar atọ n’iri anọ n’anọ n’uma puku ise ($344.5).
E gosipụtara ego a tụrụ anya n’ọrụ ahụ ga-eri na akwụkwọ e weputara na Aprel n’ihu kọmitii omeiwu obodo ahụ maka egwuregwu na omenala, nke Soipan Tuya, onye bụ onye odeakwụkwọ kabinet bụ ya wetara ya.
NCHỊ́KỌ́TÁ
Okwu na eji otu ọnụ ego ehibe ụlọ egwuregwu nke dị na Birnin-Kebbi na Talanta Sports Stadium dị na Kenya, bụ asị.
Ọ bụkwa asi na FIFA kwadoro owụwụ Talanta. Gọọmenti Kenya bu ha ga-akwụ ụgwọ ịrụ stadium ahụ niile.