TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ńtùlíaká ḿbà South Africa ọ̀ bụ̀ ǹké ènwéghị ńsògbú tèknụ́zụ́ ọ̀bụ́là dị́kà Obi kwùrù?
Share
Latest News
No, Emefiele no return N4trn to FG
Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà
Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn
A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba
FACT CHECK: No, Emefiele didn’t return N4trn to FG
FAKE NEWS ALERT: Akume hasn’t been replaced as SGF, says presidency
Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró
Slurs, smears, slander… how gendered disinformation targets high-profile Nigerian women
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ńtùlíaká ḿbà South Africa ọ̀ bụ̀ ǹké ènwéghị ńsògbú tèknụ́zụ́ ọ̀bụ́là dị́kà Obi kwùrù?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published June 19, 2024 5 Min Read
Share

Peter Obi, onye jiri òtù Labour Party (LP) zọ ọkwa onyeisiala Naijiria n’afọ 2023, sị na ntuliaka nso nso mba South Africa bụ nke enweghị nsogbu ọbụla.

Obi kwuru nke a n’ụbọchị Satọde mgbe ọ na-atụnyere ntuliaka South Africa na nke Naijiria.

“Ndapụta ntulịaka nke South Africa bụ ngosị ótú ntuliaka ọchịchị onye kwuo uche ya kwesịrị ịdị,” Obi, onye bụburu gọvanọ steeti Anambra, dere na X.

“Ọnụ ọgụgụ ndị tụrụ vootu pụtara pasentị iri isii (60%). Pasentị iri itoolu (90%) ebe a na-atụgasị vootu mepere n’oge. Nya bụ ntuliaka nyere ndị bi mba ofesi ohere ịtụ vootu ha n’oge na ịntanetị, n’enweghị nsogbu teknụzụ ọbụla.

“Nke a gosịrị usoro ịkwụba aka ọtọ nke ntuliaka obodo ahụ. Ngwa-ngwa ha ji depụta nsonazụ ntulịaka gosịrị mkpebi obodo ahụ inwe ọchịchị onye kwuo uche ya nà ịkwalite teknụzụ.”

Ntuliaka nke ụfọdụ akụkụ South Africa na nke nya bụ obodo n’ogbe bụ nke emere n’ụbọchị iri abụọ n’itoolu nke ọnwa May.

Na mgbede ụbọchị ahụ, ndapụta ntuliaka ahụ bidoro pụtaba ihe. E mechara kwupụta ndị meriri na nya bụ ntuliaka n’ụbọchị abụọ nke ọnwa June.

Ntuliaka ahụ nwetara ọtụtụ ntụnye ọnụ nke mba ndị ọzọ. Nke a bụ maka na a napụrụ òtù African National Congress (ANC) nọ n’ọchịchị ikike oche ole ha nwe na nzuko parliament. Nke a mere ANC na òtù ọzọ jiri biakọta ọnụ.

Nke a bụ oge izizi òtù ANC ga-ada n’inweta oche kachasị ri nne na nzukọ parliament kamgbe afọ 1994 á kwụsịrị mmegide ndị ojii bụ apartheid regime na South Africa.

Onye isi ala Cyril Ramaphosa nabatara ndepụta nya bụ ntuliaka, ma kwuo sị n’ọbụ uche ndị mmadụ.

Nnabata Ramaphosa nabatara ndapụta ntuliaka ahụ mere ka o nweta otuto nke ọtụtụ ndị ǹdú, dịka Obi.

Mana, ihe Obi kwuru maka nya bụ ntuliaka ọ̀ bụ̀ eziokwu?

ÓKWÚ MBỤ: ŃTÙLÍÁKA SOUTH AFRICA ÉNWEGHỊ ŃSÒGBÚ TÈKNỤ́ZỤ́ Ọ̀BỤ́LÀ

ḾKPÉBÌ: Asị.

Ótù n’ime okwu Obi bụ na ntuliaka ahụ enweghị nsogbu teknụzụ ọbụla.

Nke a abụghị eziokwu.

N’ụtụtụ ụbọchị iri n’atọ nke ọnwa May, asafe ebe a na-egosị ndapụta ntuliaka ahụ nke ụlọrụ Independent Electoral Commission (IEC) n’obodo South Africa kwụsịrị igosị ihe ọbụla ruo awa abụọ.

IEC yọrọ mgbaghara maka nsogbu ahụ, mana ha ekwughị ihe kpatara ya. Ha gara n’ihu kwuo sị na ndaputa ntuliaka ahụ enweghị nrụrụ aka ọbụla.

Ozi a adabaghị ọfụma nye òtù uMkhonto we Sizwe (MK) nke Jacob Zuma kwadoro. Zuma boro IEC ebubo “nnukwu mmeghe”.

Zuma kwuru na òtù MK nwere “ihe akaebe” gosịrị na e nwere nrụrụ aka mgbe nya bụ usoro nzisa ndaputa ntuliaka obodo ahụ nyụrụ ọkụ. Ọ gara n’ihu kwuo na ndị nkwado òtù ahụ ga-ewe iwe ma ọ bụrụ na e mezighị ndaputa ntuliaka ahụ.

ÓKWÚ ǸKÉ ÀBỤ̀Ọ́: ŃDỊ́ TỤRỤ VOOTU RÙRÙ PASENTỊ ÌRÍ ÌSÍÌ, ŃSÒNYÉ ŃDỊ́ ḾBÀ ÒFÈSÌ

ḾKPÉBÌ: Ọ bụchaghị asị.

Obi kwuru na ntuliaka ahụ nwere ndị tụrụ vootu ruru pasentị iri isii (60%).

Dịka ụlọ mgbasa ozi nke obodo ahụ bụ South African Government News Agency kwuru, ọnụ ọgụgụ mmadụ tụrụ vootu dị pasentị iri ise n’asatọ n’ụma iri ise n’asaa (58.57%).

Ọnụ ọgụgụ ahụ gosịrị ḿgbádà ndepụta ndị tụrụ vootu site n’ihe ọ pụtra n’afọ 2019 bụ pasentị iri isii n’isii n’ụma otu (66.05%).

Ya mere okwu Obi maka ndị si mba ọzọ tụrụ vootu na ntuliaka ahụ bụ eziokwu.

Kamgbe afọ 2009, South Africa mere ya iwu ka IEC ka mee ntuliaka gụnyere ndị mba ofesi. E jiri usoro a mee ntuliaka nke ọnwa gara-aga.

Nwafọ South Africa ọbụla chọrọ isi mba ọzọ tụọ vootu ya ga-abụ onye edebara aha ya n’akwụkwọ ndị ga-atụ vootu. Ọ ga-ewetakwa akwụkwọ ikike nke a mara dịka identity document (ID) tupu o nwee ikike isi obodo ọzọ tụọ vootu.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu Obi na ntuliaka South Africa enweghị nsogbu teknụzụ ọbụla bụ asị. Ntuliaka ahụ nwere ọtụtụ ịma aka n’ihu. Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ ndị tụrụ nya bụ vootu erughị pasentị iri isii.

Mana isi obodo ọzọ tụọ vootu bụ nke pụtara ire na ntuliaka ahụ.

TAGGED: claim, hitch-free election, peter obi, South Africa election

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 21, 2024 June 19, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

No, Emefiele no return N4trn to FG

One video wey dey waka for social media show as Facebook user claim sey Godwin…

July 4, 2025

Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ti ń pín lórí àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára,…

July 4, 2025

Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn

Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru…

July 4, 2025

A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba

Wani faifan bidiyo da ke yawo a kafafen sada zumunta ya nuna wani ma’abocin Facebook…

July 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

No, Emefiele no return N4trn to FG

One video wey dey waka for social media show as Facebook user claim sey Godwin Emefiele, di forma govnor of…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ti ń pín lórí àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára, tí ó ṣe àfihàn ẹni…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn

Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru na Godwin Emefiele, onye bụbu…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba

Wani faifan bidiyo da ke yawo a kafafen sada zumunta ya nuna wani ma’abocin Facebook yana ikirarin Godwin Emefiele, tsohon…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?