TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ńdị́ ná-émé ńgághárị́ ị́we àgbághị ụ́lọ̀ ụ́wé ójíi dị́ nà Nyanya ọ́kụ́
Share
Latest News
No, Emefiele no return N4trn to FG
Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà
Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn
A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba
FACT CHECK: No, Emefiele didn’t return N4trn to FG
FAKE NEWS ALERT: Akume hasn’t been replaced as SGF, says presidency
Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró
Slurs, smears, slander… how gendered disinformation targets high-profile Nigerian women
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ńdị́ ná-émé ńgághárị́ ị́we àgbághị ụ́lọ̀ ụ́wé ójíi dị́ nà Nyanya ọ́kụ́

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 6, 2024 4 Min Read
Share

Ótù ihe ngosị e kesara na soshal mịdia ekwuola na ndị na-eme ngagharị iwe gbara ụlọ ndị uwe ojii dị na Nyanya ọkụ.

Ihe ngosị nkeji iri anọ n’atọ a nke ahụtara ebe niile gosịrị ótù onye ntorobịa ka ọ na-emebisi ihe n’ụlọ ndo ebe ndị uwe ojii na-enyocha ụgbọala n’okporo ụzọ Abuja gawara Keffi.

Ótù olu n’ihe ngosị ahụ kwuru na ndị na-eme ngagharị iwe maka ihe isike na Naijiria agbaala ụlọ uwe ojii nke dị na Nyanya ọkụ.

Ihe ngosị a nke otu Okezie Atani bipụtara na X enwetala nkiri karịrị puku iri n’asatọ (18,000 views), nkwenye otu narị na iri ise n’otu (151 likes), na nkesa otu narị na iri n’ise (115 reposts).

E kesakwara nya bụ ozi na Facebook nakwa WhatsApp.

ŃGÁGHÁRỊ́ IWE “End Bad Governance”

N’ụbọchị Thursday, ndị ntorobịa Naijiria bidoro ngagharị iwe ikwuputa obi ha maka oke ọnụ ihe na-ada, ọrịrị ọnụ ego a na-ere petrol, enweghị ezi nchekwa, ya na oke ego ndị na-achị obodo na-emefu.

Gọọmentị etiti yọrọ ndị ntorobịa a ka ha ghara ime ngagharị iwe ọbụla, ma yọ ha ka ha nwere ha ndidi.

Ndị uwe ojii yọkwara ka ha bịa denye aha ndị nkwado ha, iji hụ na ha nwere ezi nchekwa oge ha na-eme nya bụ ngagharị iwe.

Na Abuja, a gwara ndị na-eme ngagharị iwe ka ha nọrọ na ụlọ egwuregwu MKO Abiola Stadium, mana ndị ntorobịa a jụrụ ịnabata nya bụ arịrịọ. Ha gara n’ihu nọdụ n’ogige Eagle Square, Unity Fountain n’ụfọdụ ebe ndị ọzọ.

ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ À

Ịmata ma ndị na-eme ngagharị iwe ọ gbara ụlọ uwe ojii a ọkụ, TheCable jiri ngwa ọrụ Google Map na Google Earth mee nnyocha.

Google Map gosịrị na ụlọ uwe ojii Nyanya dị kilomita abụọ na ụma otu (2.1km), nke ruru nkeji asaa ma ọ bụrụ na i si n’ebe ndị uwe ojii na-enyo ụgbọala gawa ụlọ uwe ojii a.

—Google Map photo showing the distance between Nyanya police station and the checkpoint

— Google Earth image: There’s no police station in the vicinity

TheCable gakwara n’ihu kpọtụrụ Josephine Adeh, onye nkwuchita ọnụ ndị uwe ojii na Abuja. Adeh kwuru na agbaghị ụlọ uwe ojii ahụ ọkụ.

Ndị uwe ojii nọ na Abuja gara n’ihu kọwaa na ọ bụ obere ụlọ ndị uwe ojii na-ano n’ime ya mgbe ha na-enyocha ụgbọala ka a gbara ọkụ.

“Megide ozi a hụrụ na soshal mịdia na a gbara ụlọ uwe ojii Nyanya oku, anyị chọrọ ime ka onye ọbụla mata n’ọbụghị ụlọ uwe ojii Nyanya ka agbara ọkụ. Kama, ọ bụ obere nchedo ndo ebe ndị uwe ojii na-enyocha ụgbọala ka agbara ọkụ,” ozi a kwụrụ.

“Mmadụ anọ ndị bụ Mathias Jude (29) nke Nyanya Area D, Mohammad Ahmed (23), Abba Jibril (18), na Mohammad Haruna (18) nwara imebi ebe a na-edebe ụgbọala ndị uwe ojii, mana anwụchiri ha.”

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na a gbara ụlọ uwe ojii Nyanya ọkụ bụ asị. Ndị omekome ahụ bụ ụlọ ndo ebe ndị uwe ojii na-anọ enyocha ụgbọala ka ha gbara ọkụ.

TAGGED: fact check in Igbo, nationwide protest, news in Igbo, protest

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 6, 2024 August 6, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

No, Emefiele no return N4trn to FG

One video wey dey waka for social media show as Facebook user claim sey Godwin…

July 4, 2025

Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ti ń pín lórí àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára,…

July 4, 2025

Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn

Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru…

July 4, 2025

A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba

Wani faifan bidiyo da ke yawo a kafafen sada zumunta ya nuna wani ma’abocin Facebook…

July 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

No, Emefiele no return N4trn to FG

One video wey dey waka for social media show as Facebook user claim sey Godwin Emefiele, di forma govnor of…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ti ń pín lórí àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára, tí ó ṣe àfihàn ẹni…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn

Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru na Godwin Emefiele, onye bụbu…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba

Wani faifan bidiyo da ke yawo a kafafen sada zumunta ya nuna wani ma’abocin Facebook yana ikirarin Godwin Emefiele, tsohon…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?