Gọọmenti steeti Kebbi si na ihe ngosi AI na-ekwu na a na-arụ ụgbọelu n’óké ọhịa dị na Argungu ebe a na-ere ọgwụ ike cocaine, bụ asị.
Charley Boy, onye ọgụ-egwu a mara ofuma, bipụtara ihe ngosi ahu na asafe Instagram ya na Monday.
K’osiladi n’ubochi Thursday, Rabiu Sokoto, onye isi ngalaba National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) na Kebbi, kwuru na nyocha ha mere gosiri n’okwu ahụ bụ asị.
Enweghị ihe dị otú ahụ na-eme na steeti a. Anyị gara ebe niile anyị kwesịrị ịga, anyị emeela nyocha anyị, enweghikwa ihe dị otú ahụ,” Sokoto kwuru.
Yakubu Birnin Kebbi, onye isi nzisa ozi na omenala nke steeti ahu, kwuru na ihe ngosi ahụ bụ ihe ndị parti ndoro ndọrọ ọchịchị na-emegide ọchịchị steeti ahụ meputara iji mee ka enwee ọgbaghara na steeti ahụ.
“Okwu a bụ ihe na-adịghị mma ma bụrụkwa mpụ nke ukwuu. Nke a pụtara na ụfọdụ ndị, dịka m kwụrụ na mbụ, enweghị mmasị na ihe ga-eme na steeti a ma ọ bụrụ na ebumnuche ha mezuo,” onye isi ozi ahụ kwuru.
“Iji gbochie mgbagwoju anya, ọdụ ụgbọ elu naanị dị na steeti Kebbi bụ Sir Ahmadu Bello International Airport, Birnin Kebbi. Argungu enweghị, ma ọ dịghị mgbe ọ nwere, ọdụ ụgbọ elu ọ bụla, ụzọ ụgbọ elu, ma ọ bụ ihe ndị yiri ya,” gọọmenti steeti kwuru na nkwupụta dị iche.
“Ọzọkwa, aha na ndị a kpọrọ n’ihe ngosi ahụ abụghị ezigbo aha ndị mmadụ, enweghi ndekọ gọọmenti ma ọ bụ nyocha site na Nigeria Customs Service, National Drug Law Enforcement Agency, ma ọ bụ ụlọ ọrụ nchekwa ọ bụla iji kwado nkwupụta ndị a na-enweghị isi.”
Gọọmenti steeti Kebbi na-echegbu onwe ya nke ukwuu banyere mgbasa ozi ụgha a nke e mere iji mee ka ndị mmadụ ghara ịghọta eziokwu ma tinye egwu n’ọbụ ndị mmadu.”
Steeti ahụ yọri ndị mmadụ ka ha ghara ịtinye obi na ozi ahụ.