TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńkírí na-akọwa nà á kpọ̀chìrì ónyé ísí senate n’òbòdó Gabon dị̀ óchíè
Share
Latest News
Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró
Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal
No, Nigeria no send peace support mission go Israel
A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba
Ǹjẹ́ Tinubu àti Alexander Zingman lọ sí ilé-ìwé kan náà? Èyí ni ohun tí a mọ̀
Tinubu nà Alexander Zingman ọ̀ gàrà ótù ụ́lọ̀ákwụ́kwọ́? Lèé íhé ányị́ mà
Tinubu go di same school wit Alexander Zingman? Na wetin we sabi be dis
Shin Tinubu ya halarci makaranta daya da Alexander Zingman? Ga abin da muka sani
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńkírí na-akọwa nà á kpọ̀chìrì ónyé ísí senate n’òbòdó Gabon dị̀ óchíè

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 12, 2023 4 Min Read
Share

Íhé nkiri pụtara nà Facebook na-egosị kà ndị ọchịchị nà-emepe àkpà ego, mà sị́ nà onye bụbu onye isi oche senate n’obodo Gabon chọ̀rọ̀ ísi n’obodo ya gbapụ ozugbo ndị agha napụrụ ọchịchị ha n’ike.

Ókwú à bụ nke ekesara site n’ọba ozi á na-akpọ Nigeria News Update. Nya bụ ozi nwetara nkiri ruru ótù nde na puku narị ise. O nwetara ntunye ọnụ puku narị atọ na narị abụọ.

Ihe ngosi à, nke wuru èwù n’ọba ozi soshal midia nke gunyere WhatsApp, X, yana TikTok gosịrị ebe ndị uwe ojii nà ìgwé mmadụ na-emepe ụfọdụ àkpà juputara n’ego.
Ńgwùgwù ego ndị à bụ nke eji akwụkwọ mgbado ego edere “BEAC”, nke pụtara Bank Of Central Africa, were jikọta ọnụ.

BEAC na-àrụ́rụ́ obodo isii nọ́ n’etiti ḿbà Africa, nke mejupụtara òtù Economic and Monetary Community of Central Africa, ọrụ. Obodo ndịa gụnyere Cameroon, Gabon, Central Africa Republic, Chad, Republic of Congo, yana Equatoria Guinea.

Ọ́ bụ̀ Central African Franc (CFA) bụ ego á màrà nà BAEC nwèrè.

ŃNÁGHÁRÁ Ọ̀CHỊ́CHỊ́ N’íKÉ ǸKÉ ÒBÒDÓ GABON

Gabon, ótù n’ime obodo na-emepụta mmanụ crude ọfụma, bànyèrè nà òtù Commonwealth n’ọnwa Julaị nke afo 2022, n’agbanyeghị nà ọ bụbu France chịrị há n’ike tupu ha enwere onwe ha. Òké àlà ruru pasentị iri itoolu nà etiti ḿbà Africa bụ nke óké ọhịa kpuchiri, ma n’anata ọtụtụ aṅụrụ carbon karịrị ihe obodo ahụ na-enyepụta.

N’ubọchị iri atọ nke ọnwa August, ndị agha army naghara ọchịchị n’ike n’obodo Gabon, kamgbe onye isi obodo há bụ Ali Bongo laghachitara n’ọchịchị nke ugboro atọ.

Nnagharara ọchịchị n’íké à wetara ọchịchị afọ iri ise nà ise nke Bongo na ezinụlọ ya ná njedebe.

Òtù ndị agha bịara kwupụta Brice Oligui Nguema dịka onye isi òtù à naghara ọchịchị n’ike. Há kpochiri onye isi ala há napụrụ ọchịchị n’ụlọ. Há kpochikwara ótù n’ime nwa ya nwoke.

“Anyị ekpebiela ichekwa udo site n’iweta na njedebe ọchịchị nke ugbua n’obodo Gabon,” ótù n’ime ndị agha à kwuru n’ọwa ígwè onyonyo á na-akpọ Gabon 24.

Mgbe ha mere nkwupụta à, ọ bụ ndị agha iri na abụọ nọ kwuo sị na há ga-akagbu mpụta ntulika ahụ ndị naghara ọchịchị obodo Gabon jụ̀rụ̀. Há gbakwunyere na “há agbasago ngalaba ọchịchị niile obodo ahụ nwere.”

N’ụbọchị asaa nke ọnwa September, ụbọchị asatọ kà achụpụchara Bongo n’ọchịchị mà debekwa ya ụlọ, ndị agha mechara hapụ ya màkà “ọnọdụ ahụ ike ya”.

N’otu ozi há bipụtara na ihe onyonyo obodo ha, Ulrich Manfoumbi, onye nkwuchite ọnụ nyere òtù ndị agha à kwuru sị: “O nwèrè íké gaa obodo ọzọ gá nara ọgwụ, mà ọbụrụ na ọ chọ̀rọ̀.”

ŃNYÒCHÁ

TheCable jiri ngwa ọrụ nnyocha bụ Yandex were nyocha akụkụ n’ile nọ na ihe ngosị a, mà chọpụta na e mepụtara ihe ngosị ahụ n’ọnwa 2022.

Ihe ngosị ochie a bụ nke ebipụtara mgbe akpochiri Guy Nzouba Ndama, onye bụbu onye isi senate mà bụrụkwa onye isi òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ama ọchịchị obodo ahụ aka, n’oke ala Gabon na Congo ebe o bu ego ruru nde Euro abụọ agbapụ n’obodo ya.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe ngosị nke na-ekwu na onye bụbu onye isi senate Gabon na-achọ ịgbapụ n’obodo ya, ka ndị agha naghara ọchịchị bụ̀ àsị́. Ihe ngosị à bụ nke ebipụtara ọtụtụ afọ gara aga tupu ndị agha anara ọchịchị.

TAGGED: Gabon coup, igbo cable, igbofactcheck

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 12, 2023 September 12, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí…

June 28, 2025

Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal

Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa…

June 28, 2025

No, Nigeria no send peace support mission go Israel

One Facebook video claim sey Nigeria send soldiers go Israel for joint peace support mission.…

June 28, 2025

A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba

Wani faifan bidiyo na Facebook ya nuna cewa Najeriya ta tura dakaru domin aikin hadin…

June 28, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí orílẹ̀ èdè Ísírẹ́lì kí rògbòdìyàn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal

Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa kwàdó udo na mba Isreal.…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

No, Nigeria no send peace support mission go Israel

One Facebook video claim sey Nigeria send soldiers go Israel for joint peace support mission. One male broadcaster wey dey…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba

Wani faifan bidiyo na Facebook ya nuna cewa Najeriya ta tura dakaru domin aikin hadin gwiwa na tallafawa zaman lafiya…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?