TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ókwụ́ nà FIFA jị́rị́ $1.2m rụ́ọ́ stadium Talanta nké Kenya bụ̀ ásị́
Share
Latest News
Claim wey tok sey FIFA give Kenya $1.2m to build Talanta stadium no correct
Irọ́ ni pé mílíọ̀nù kan àti igba dọ́là ni wọ́n fi kọ́ pápá ìṣeré Talanta ní Kenya, FIFA kọ ló sì kọ́ọ
Da’awar cewa filin wasa na Talanta na Kenya ya ci $1.2m, wanda FIFA ta gina karya ne
DISINFO ALERT: Man in viral image NOT chairman of reps’ youth committee
Kebbi deny video wey claim sey ‘secret airport dey Argungu for cocaine trafficking’
Kebbi sị̀ n’ónwéghị́ ọ́dụ̀ ụ́gbọ́élụ́ ńzụ́zọ́ ánà-éré cocaine dị́ ná stéétị̀ áhụ́
Ìpínlẹ̀ Kebbi sọ pé irọ́ ni fídíò tó sọ pé àwọn ni ‘ibi ọkọ òfuurufú tí wọ́n ti máa ń gbé cocaine tí àwọn ènìyàn kò mọ̀’
Birnin Kebbi ya karyata faifan bidiyo yana ikirarin ‘boye filin jirgin sama a Argungu saboda safarar hodar iblis’
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ókwụ́ nà FIFA jị́rị́ $1.2m rụ́ọ́ stadium Talanta nké Kenya bụ̀ ásị́

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published October 31, 2025 4 Min Read
Share

N’ụbọchị iri abụọ n’isii nke ọnwa Ọktoba, Dino Melaye kwụrụ na FIFA nyere Naijiria na Kenya otu nde Dollar na narị abụọ   ($1.2 million) ka ha jiri ruo ogige ekwuregwu stadium n’obodo ha.

N’ozi ọ bipụtara na X, onye a zọburu  ọkwa gọvanọ na steeti Kogi, bipụtara ihe ngosi nke ụlọ egwuregwu abụọ ahụ nke a sịrị na FIFA kwadoro, ma kwụọ na ndị ndu Naijiria ejighị ego ahụ mee ihe dị mma ịle anya.

O kesara ihe ngosi nke obere ụlọ egwuregwu FIFA kwadoro dị na Birnin-Kebbi nke steeti Kebbi, n’ụlọ egwuregwu Talanta dị na Kenya.

“Ebumnuche ndị FIFA bụ ka obodo abụọ ahụ wuo ụlọ egwuregwu maka mmepe akum bọọlụ. Agbụrụ anyị efuola ọhia, anyị na-eme emume ndị ohi, anyị na-asọpụrụ ndị omekome,” ozị ahụ kwuru.

Ozị ahụ nwetara echiche ihe karịrị narị isii na iri abụọ n’otu (621k), nkwenye puku asatọ(8k), na nkesa puku abụọ na narị ise (2.5k).

N’ihe dị obere iche na ozị nke Melaye biputara, onye ọzọ na X bụ @CitizenObs kwuru na mba abụọ ahụ natara nde dollar iri  ($10 million) n’otu n’otu maka ịrụ ụlọ egwuregwu ndị ahụ. Onye ahụ kesakwara otu ihe ngosi nke Melaye kesara.

ÓKPỤ́RỤ́ ÁKỤ́KỌ́

The FIFA-funded $1.19m mini-stadium in Birnin-Kebbi

Na nso nso a, ọtụtụ ndị na soshal midia ebola ụlọ bọọlụ Naijiria bụ Nigeria Football Federation (NFF) ebubo na Naijiria mefuru ego e nyere ha ka ha jiri ruo ogige akum bọọlụ.

Ụfọdụ kwụrụ na NFF emepụtaghi ihe ahụrụ anya site n’ego FIFA nyere ha maka ịkwalite bọọlụ nke ndị ntorobịa ya na mmepe ụlọ egwuregwu.

N’obi ngbagha uka ahụ bụ ụlọ egwuregwu nta nke FIFA kwadoro ehibere na Birnin-Kebbi. A malitere iwuli ụlọ egwuregwu ahụ nke a sịrị na e jiri otu nde dollar na ụma otu narị na ịtolu ($1.19) ruo na 2020 ma mepee ya na 2023.

FIFA na-akwado oru a site na atụmatụ ya a kporo ‘Forward Programme’, nke ebumnuche ya bụ inye obodo niile nkwado zuru òkè maka mmepe ogige akum bọọlụ.

Ụlọ egwuregwu ahụ bụ otu n’ime oru abụọ nke egoya si na atutumatu ahụ na Naijiria. Oru nke ọzọ bụ ụlọ egwuregwu nta dị na Ugborodo na steeti Delta.

ÓGỊ́GÉ ÉGWỤ́RÉGWỤ́ TALANTA DỊ̀ NÀ KENYA

A recent picture of the Tantala Sports Stadium shared by President William Ruto of Kenya

Stadium Talanta bụ ebe egwuregwu nke a ka na-ewulị na Nairobi, Kenya. Ana-atụ anya ịji ya hibe egwuregwu asọmpi Africa Cup of Nations (AFCON), nke Kenya, Tanzania na Uganda ga ehibe n’afọ 2027.

Stadium ahụ ga-enwe ndị na-ekiri egwuregwu ruru puku iri isii (60,000) mgbe a ruchara ya. Obu gọọmenti Kenya kwụrụ ụgwọ ọrụ ahụ niile ma nye ụlọrụ China Road and Bridge Corporation (CRBC) ka ha ruo ya bụ ụlọ egwuregwu.

Dịka ụlọ oba ozi The Times Kenya si kwuo, Talanta Sports City Stadium “ga-efu onye na-akwụ ụtụ n’obodo ahụ Shilling ijeri iri anọ n’anọ n’uma puku asaa (Sh44.7),” nke a na-atụ anya na ọ gbakọtara ihe dị ka nde narị dollar atọ n’iri anọ n’anọ n’uma puku ise ($344.5).

E gosipụtara ego a tụrụ anya n’ọrụ ahụ ga-eri na akwụkwọ e weputara na Aprel n’ihu kọmitii omeiwu obodo ahụ maka egwuregwu na omenala, nke Soipan Tuya, onye bụ onye odeakwụkwọ kabinet bụ ya wetara ya.

NCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na eji otu ọnụ ego ehibe ụlọ egwuregwu  nke dị na Birnin-Kebbi na Talanta Sports Stadium dị na Kenya, bụ asị.

Ọ bụkwa asi na FIFA kwadoro owụwụ Talanta. Gọọmenti Kenya bu ha ga-akwụ ụgwọ ịrụ stadium ahụ niile.

TAGGED: fact check in Igbo, FIFA, Kebbi state, Kenya, news in Igbo, NFF

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu October 31, 2025 October 31, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Claim wey tok sey FIFA give Kenya $1.2m to build Talanta stadium no correct

On October 26, Dino Melaye claim sey FIFA give Nigeria and Kenya $1.2 million to…

October 31, 2025

Irọ́ ni pé mílíọ̀nù kan àti igba dọ́là ni wọ́n fi kọ́ pápá ìṣeré Talanta ní Kenya, FIFA kọ ló sì kọ́ọ

Ní ọjọ́ kẹrindinlọgbọn, osù kẹwàá, ọdún 2025, Dino Melaye sọ pé FIFA fún orílẹ̀ èdè…

October 31, 2025

Da’awar cewa filin wasa na Talanta na Kenya ya ci $1.2m, wanda FIFA ta gina karya ne

A ranar 26 ga watan Oktoba, Dino Melaye ya yi ikirarin cewa FIFA ta baiwa…

October 31, 2025

DISINFO ALERT: Man in viral image NOT chairman of reps’ youth committee

An X user identified as Bash Kano has claimed that an older lawmaker in his…

October 31, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Claim wey tok sey FIFA give Kenya $1.2m to build Talanta stadium no correct

On October 26, Dino Melaye claim sey FIFA give Nigeria and Kenya $1.2 million to build stadiums for dia kontris. …

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 31, 2025

Irọ́ ni pé mílíọ̀nù kan àti igba dọ́là ni wọ́n fi kọ́ pápá ìṣeré Talanta ní Kenya, FIFA kọ ló sì kọ́ọ

Ní ọjọ́ kẹrindinlọgbọn, osù kẹwàá, ọdún 2025, Dino Melaye sọ pé FIFA fún orílẹ̀ èdè Nàìjíríà àti Kenya ní mílíọ̀nù…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 31, 2025

Da’awar cewa filin wasa na Talanta na Kenya ya ci $1.2m, wanda FIFA ta gina karya ne

A ranar 26 ga watan Oktoba, Dino Melaye ya yi ikirarin cewa FIFA ta baiwa Najeriya da Kenya dala miliyan…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 31, 2025

Kebbi deny video wey claim sey ‘secret airport dey Argungu for cocaine trafficking’

Kebbi state government don deny one viral AI-generated video wey claim sey dem dey build secret airport for Argungu forest…

CHECK AM FOR WAZOBIA
October 31, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?