TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńkírí ébé ńdị́ ágha nà-ègósị̀pụ̀ égbè há ésiteghị nà Niger Republic
Share
Latest News
FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated
MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńkírí ébé ńdị́ ágha nà-ègósị̀pụ̀ égbè há ésiteghị nà Niger Republic

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 8, 2023 6 Min Read
Share

Ótù ihe nkiri na-agbasà nà intanetị àkpọ́lá ndị agha na-egosịpụ égbè há ndị agha obodo Niger.

N’ime ihe nkiri nke pụtara nà TikTok, a hụrụ kà ndị agha bu egbe, ma na-eme kà ha ano n’ogbo agha, n’ihe dịka ha na-akwado ije agha.

A nụrụ kà ndị agha a na-agụ egwu agha kà ha na-azọwa ije, dịka ndị obodo ha kwụ n’ótù akụkụ na mmasị ebe ọtụtụ nọ n’ujọ.

👆👉Pray for our soliders for this battle because Niger Republic military are more than ready for face their enemy. Look at this video. Say no to War. Africa fighting Africa. This is what Western people want so that they will sale their weapons 🔪 🔫🔫. Africa why. pic.twitter.com/FWukwR6RP5

— Victor Chuks (@VictorC26525018) August 4, 2023

 

N’ụbọchị Friday, @VictorC26525018, onye ji usoro mgbasa ozi bụ Twitter ezisa ozi, bipụtara ihe ngosị a mà yọ ndị Naijiria kà há kpere ndị agha obodo anyị ekpere dịka ha na-aga ị́lụsò ndị agha Niger ọgụ, ndị “kara dị nkwado maka agha.”

“Kpere ndị agha anyị ekpere màkà ndị agha Niger Republic kàrà kwádó ịlụso ndị íro ha agha. Lee ihe ngosị a.

Ekwenyekwela n’agha. Africa ibuso onwe ya agha. Ihe a bụ ihe ndị ọcha chọrọ, ka ha nwee ike ịresị ha ńgwá agha. Africa, ọ bụzi maka gịnị?” Ihe a bụ ihe  ozia mmadụ narị kirigoro kwuru.

Gbadebo Rhodes-Vivor, onye ji òtù Labour Party (LP) zọọ ọkwa ọchịchị gọvanọ nà Lagos steeti, bipụtakwara ihe ngosị a na Twitter.

N’agbanyeghị na Rhodes-Vivour ekwughị na ndị agha a sì Niger, ozi  onye ndọrọndọrọ ọchịchị gbadoro ụkwụ na nsogbu di n’obodo dị nà West Africa.

Ihe a kà o kwuru: “N’adịghị kà ndị ọzọ, ọ bụ naanị ótù akwụkwọ ikikere ime njem passport kà m nwere. Onweghị obodo ọzọ m ṅụrụ iyi ikwado. Nigeria bụ ihe m nwere.

“ị́lụ̀ agha megide ndị ná-ákwàdó ótù ebumnuche, ná-àchọ́ nwere onwe màkà akụ n’ụba obodo ha, mà ná-àchọ́ ísi n’aka ndị ọcha na-emegbu ha pụta, ga-enwe ezigbo nsonazụ nye òtú mba ndị ọzọ sì ahụta anyị dịka isi ndụ mba Africa. Ó nwere ike ibute nnukwu ihe iyi egwu nye nchekwa obodo anyị.”

Kà anyị na-ede akụkọ a, ozi Rhodes-Vivour n’igwe Twitter enwetala ntunye ọnụ ruru ótù puku na otu narị nà atọ, ma  nwetakwa nkesa puku atọ, narị abụọ, nà iri n’asaa.

Ndị ókwú a masịrị ruru puku asaa na narị asaato n’otu. Nchekwa màkà ịgụ mgbe ọzọ nke ndị oyibo kpọrọ bookmark ruru narị ano na iri n’isii, tinyere ndị hụrụ nya bụ ókwú di ótù nde na ụma mmadu nari puku asatọ.

Unlike some, i have only one passport and have sworn no allegiance to any other state. Nigeria is all I have.

A war with a people who appear to be uniting around a common interest, seeking economic freedom and a departure from over bearing western influence will have very dire… pic.twitter.com/WJ0tmLThiT

— Gbadebo Rhodes-Vivour (@GRVlagos) August 4, 2023

Ihe ngosị a nke nwere ótù isi okwu kà anyị hụtakwara n’ọtụtụ ebe n’ọba ozi Facebook.

Open Nigeria, ótù asafe nọ nà Facebook nke uche óbì ha abụghị ikpata ego, bipụtara ihe ngosị a, ma kwuo sị na ndị obodo Niger enweghị ihe ha ga atufu mà ha gaa agha.

Ọ dere sị: “Ebu m n’obi na Seyi Tinubu, Yusuf Bichi, Umar Ganduje, Hope Uzordinma, Festus Keyamo, Muhamadu Buhari, Femi Gbajabiamila, Tony Elumelu, Aliko Dangote, Akpabio, Orji Uzor Kalu na ụmụ ndị niile kwadoro ọchịchịrị ga-anọ n’ogbo agha, megide obodo Niger ndị n’eweghị ihe ha ga atufu n’agha a, dị ka nke ndị ocha na-alụ imegide ndị Africa.”

Ihe nkiri a n’abia dika  onye isi-ala bụ Bola Tinubu kwuputara ebumnuche ya izipu ndị agha obodo Naijiria ịga Niger n’etiti ogbaghara dị na nya bụ obodo.

Tinubu, onye bụ onye isi oche ndị Economic Community of West African States (ECOWAS), kwuru na mkpebi iji ike eweta udo bụ nke òtù ECOWAS kwekoritara site n’ogbako ha nwere n’ụbochị Sunday na Abuja.
ECOWAS enyela Niger ótù izu ụka, bido n’ụbọchị Sunday, itighachi onye isi-ala ha bụ Mohamed Bazoum n’ọchịchị. Mà ha emeghị nke a, o nwere ike ibute ntaramahụhụ siri ike.

K’osidị, ọtụtụ obodo gunyere Russia na ndị ọnụ na-eru n’okwu dịka ndị isi ECOWAS akpọla mkparitụka dịka ụzọ iganihu, karịa ibido ọgụ na mgba.

ŃCHỌ́PỤ̀TÁ

Thecable nyochara akụkụ niile nke ihe ngosị a nwere, iji chọpụta mgbe izizi ihe nkiri a pụtara na ịntanetị.

Nchọpụta nnyocha a gosịrị na ihe nkiri a bu ụzọ pụta n’ọba ozi YouTube n’ubọchị anọ nke ọnwa April. Ụbọchị obodo Senegal na-eme mmeme màkà ncheta ụbọchị nwere onwe.

Ihe ngosi a nke isi okwu ya bụ “April 4: Commandos ensures show | Ubochi nwere onwe ndi Senegal | 2023” gosịrị ebe ndị agha site na ńkwàdó ndị obodo ha, na-egosị ọtụtụ amansi ndị agha, iji kwàdó mmemme ncheta nwere onwe obodo ha.

Ngagarị ndị agha a, iji kwàdó ụbọchị nwere onwe obodo ha, bụ nke mbụ ha na-enwe na Darkar, nke bụ isi obodo Senegal, n’ime ọnwa anọ kamgbe ntiwapụ ọria COVID-19 n’ụwa nille.

Enwela akụkọ ọgbaghara n’etiti ndị nchekwa obodo na ndị na-ámà gọọmenti nọ n’ọchịchị aka n’obodo Senegal izu ụka gara aga, tupu mmemme ncheta nwere onwe afọ iri isii na atọ, n’aka obodo France.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Ozi ndị ahụ na-egosị ndị agha nọ n’ime ihe nkiri a dịka ndị agha Niger bụ asị.

Ndị agha nọ n’ime ihe ngosị ahụ bụ ndị agha Senegal na-eme ngagarị dịka ha n’echeta ụbọchị nwere onwe obodo ha. Ọzọkwa, okoloto ndị oyibo kpọrọ flag dị nnọọ n’ihe ngosị ahụ abụghị nke ndị Niger. Kama, ọ bụ nke ndị Senegal.

TAGGED: cableigbo factcheck, factcheck, Niger coup, Nigerian soldiers

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 8, 2023 August 8, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated

A video showing a bridge collapse incident is circulating across social media platforms, especially on…

July 24, 2025

MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army

The Nigerian Army says a viral video claiming the arrest of a foreign arms dealer…

July 24, 2025

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?