TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ḿbà, íhé ńkírí à ábụghị ǹké gosịrị ọ̀gụ̀ ḿmégwárá ńdị́ ágha ímegide Okuama
Share
Latest News
Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró
Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal
No, Nigeria no send peace support mission go Israel
A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba
Ǹjẹ́ Tinubu àti Alexander Zingman lọ sí ilé-ìwé kan náà? Èyí ni ohun tí a mọ̀
Tinubu nà Alexander Zingman ọ̀ gàrà ótù ụ́lọ̀ákwụ́kwọ́? Lèé íhé ányị́ mà
Tinubu go di same school wit Alexander Zingman? Na wetin we sabi be dis
Shin Tinubu ya halarci makaranta daya da Alexander Zingman? Ga abin da muka sani
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ḿbà, íhé ńkírí à ábụghị ǹké gosịrị ọ̀gụ̀ ḿmégwárá ńdị́ ágha ímegide Okuama

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published March 31, 2024 4 Min Read
Share
Screenshot

Ótù ihe nkiri e biputara na soshal midia na-akọwa na ndị agha Naijiria busoro ndị Okuama nà Delta ọgụ mmegwara màkà ogbugbu ndị soja iri na isii n’obodo ahụ.

Ndị mmadụ ejila ihe ngosị à bóó ndị agha ebubo ọgụ mmegwara.

N’ụbọchị iri na anọ nke ọnwa March, ọtụtụ ndị agha—nke mejupụtara onye lieutenant colonel, ndị major captain abụọ, na ndị agha iri n’abụọ—ezigara ọrụ na Okuama ka ndị ntorobịa obodo ahụ gburu.

Ọnwụ ndị agha a kpaliri iwe ọtụtụ ndị—ya na ọtụtụ ebubo. Otu n’ime ebubo ndị a bụ na ndị agha nụsoro ndị Okuama ọgụ mmegwara site n’ịgba obodo ahụ ọkụ.

“Okuama nke dị na Delta steeti bụ nke ndị agha soja na-agba ọkụ n’ụtụtụ a. Ndị agha Naijiria ekwupụtala agha n’ogige ahụ,” ótù onye na-aza Emekagift100 na X dere, ma jiri ihe ngosị ahụ sochie okwu ya.

Onye a ji X ezịsa ozi kwuru na ọ bụ onye na azọtara ndị mmadụ ọnụ ha, bụ human rights activist, ma bụrụkwa “onye nchekwa ùgwù” ndị Indegenious People of Biafra (IPOB), òtù nkewa obodo a mapụrụ amapụ.

Ozi a, nke ebiputara n’ụbọchị iri n’asatọ nke ọnwa March, enwetala nkiri puku iri itoolu n’asaa na narị abụọ (97,200), nkesa narị asaa n’isii (706), nkwenye narị ise na iri asatọ n’otu (581), na ntụnye ọnụ otu narị na iri asatọ n’otu (181).

Ihe ngosị nke ịhe nkịrị ahu @EmekaGift100 bịputara

N’ime ihe ngosị nkeji iri ise n’anọ a, a hụrụ ka ọ́kụ́ na-agba ụgbọ mmiri n’elu mmiri ebe nnukwu aṅụrụ si na ya abanye n’elu ígwe.

“Ọ dị mma?” otu nwoke jiri asụsụ pidgin jụọ ugboro-ugboro, dịka ọkụ à nà-àgbá.

“Lee, nnukwu mmanụ fuel na-agba ọkụ. Ihe a bụ ihe anyị n’agabiga n’afọ ọbụla, mana ndị mmadụ amaghị. Ha chere na anyi na-enwe obi aṅụrị. Obi adịghị anyị mma.”

Dịka EmekaGift100 kwuru, ndị agha soja mụnyere ọkụ a iji “gba ụmụ aka, ụmụ nwanyị, na ndị kara nka n’enweghị enyemaka” ọkụ.

Somto Okonokwo, onye ọzọ ji X ezisa ozi, kwuru sị́ na ndị agha na-eji ụzọ n’ezighi ezi emegide ndị mpaghara ọdịda anyanwụ ma na-echekwa ndị Naijiria bi n’ugwu.

Mgbe anyị dere akụkọ a, ozi a enwetala nkiri otu narị na iri atọ n’atọ (133,600), nkesa otu puku na narị anọ (1,400), nkwenye otu puku na narị abụọ (1,200), ntụnye ọnụ narị abụọ na iri ise n’isii (256), ya na nchekwa ịgụ mgbe ọzọ iri asatọ n’isii (86).

ŃNYÒCHÁ

TheCable jiri ńgwá ọrụ Reverse Image Search nyochaa ya bụ ihe ngosị, ma chọpụta na ebiputala otu ihe ngosị a na TikTok na ngwụcha ọnwa Januwari—ihe chọrọ iru ọnwa abụọ tupu e gbuo ndị agha a na Delta.

Mgbe ebiputara nya bụ ihe ngosị, a sịrị na ọbụ ọkụ ọgbụgba na Nembe Waterside n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Port Harcourt na Rivers steeti.

“Ọkụ ọgbụgba ọzọ na Nembe Waterside nke dị so na Creek Road, n’ime Port Harcourt,” edere n’okpuru ihe ngosị a.

Ihe ngosị a nwere ótù okwu n’ime ya, dịka nke a na-ekesa na Twitter k’egbuchara ndị agha a na Delta.

Nnyocha okwu anyị mere gosịrị na ebiputala ozi ọkụ ọgbụgba a n’onwa Junuwarị nke afọ 2024 nke mebiri ọtụtụ ahịa ndị mmadụ na Rivers steeti.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe nkiri a egosịghị na ọ bụ ọgbụgba ọkụ obodo Okuama na Delta steeti.

TAGGED: Bassirou Faye, Ousmane Sonko, Senegal

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu April 9, 2024 March 31, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí…

June 28, 2025

Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal

Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa…

June 28, 2025

No, Nigeria no send peace support mission go Israel

One Facebook video claim sey Nigeria send soldiers go Israel for joint peace support mission.…

June 28, 2025

A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba

Wani faifan bidiyo na Facebook ya nuna cewa Najeriya ta tura dakaru domin aikin hadin…

June 28, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró

Ìròyìn lati inú fídíò Facebook kan sọ pé Nàìjíríà fi àwọn ọmọ ogun ránṣẹ́ sí orílẹ̀ èdè Ísírẹ́lì kí rògbòdìyàn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

Ḿbà, Naijiria ézipụ̀ghị̀ ńdị́ ágha ńkwàdó ùdó nà òbòdò Isreal

Ótù ihe ngosị si na Facebook kwuru na Naijiria zipụrụ ndị agha ka ha gaa kwàdó udo na mba Isreal.…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

No, Nigeria no send peace support mission go Israel

One Facebook video claim sey Nigeria send soldiers go Israel for joint peace support mission. One male broadcaster wey dey…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

A’a, Najeriya ba ta tura tawagar taimakon zaman lafiya zuwa Isra’ila ba

Wani faifan bidiyo na Facebook ya nuna cewa Najeriya ta tura dakaru domin aikin hadin gwiwa na tallafawa zaman lafiya…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 28, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?