TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ḿbà, ICC ényeghị ìwú kà á kpọ̀chìé Akpabio nà ǹgá
Share
Latest News
FACT CHECK: Claim that Davido and Chioma are expecting their third child is false
AI ni wọ́n fi se fídíò tó sàfihàn pé àwọn ISWAP yin ìbọn fún ọ̀gá àwọn òṣìṣẹ́ ológun kan
Video wey show as ISWAP shoot army general na AI
Bidiyon da ke nuna harbin Janar na soji da ISWAP aka yi shi ne AI
DISINFO ALERT: Video showing shooting of army general by ISWAP is AI-generated
Kò sí ẹ̀rí tó sàfihàn pé Trump halẹ̀ pé òhun yóò ‘mu’ Tinubu láàárín wákàtí mẹrinlelogun
Evidence no dey sey Trump threaten to ‘capture’ Tinubu in 24 hours
Babu wata shaida da Trump ya yi barazanar ‘kama’ Tinubu a cikin sa’o’i 24
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ḿbà, ICC ényeghị ìwú kà á kpọ̀chìé Akpabio nà ǹgá

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published April 5, 2025 3 Min Read
Share

Ótù onye na soshal mịdia ekwuola na ụlọikpe ndị omekome nke mba ụwa bụ International Criminal Court (ICC) enyela iwu ka ndị uwe ojii kpọchie onye isi ụlọ omeiwu Naijiria bụ Godswill Akpabio na ǹgá.

Ozi a nke otu asafe na Facebook bụ  @VoiceUpNaija biputara enwetala nkwenye otu narị na iri anọ (140 likes), ntụnye ọnụ iri itoolu n’abụọ (92 comments), na nkesa iri isii n’abụọ (62 shares).

Ụfọdụ asafe na Facebook nakwa LinkedIn kesakwara nya bụ ozi

“Ozi mgberede: ICC enyela iwu ka a kpọchie onye ịsị ụlọ ome ịwụ Naijiria na ngá maka ebubo akwamịkọ,” ozi a kwụrụ.

“Ụlọ ikpe International Criminal Court (ICC) amabidola onye isi ụlọ omeiwu Naijiria iwu ịga obodo ọzọ, ma nye iwu ka a kpọchie ya na nga ma a hụ ya n’obodo ọbụla.”

Ozi a na-abịa n’ihi nghọtaghe nke dị n’etiti Akpabio na Natasha Akpoti-Uduaghan, onye omeiwu na-anọchite anya ndị Kogi central, n’ihi ọnọdụ oche na ụlọ omeiwu kacha elu na Naijiria.

Ka nke a gachara, ụlọ omeiwu senate wegara nya bụ okwu nye nnokọ na-ahụ maka ikpe gbasara ezi àgwà, ọnọdụ ruru onye na mkpesa ndị omeiwu, iji taa Akpoti-Uduaghan ahụhụ ruru ya.

N’ụbọchị iri abụọ n’asatọ, Akpoti-Uduaghan bòrò Akpobio ebubo na ọ kpasoro ya agwa dịka ọ chọrọ ịkwasaya iko n’ike n’ime ụlọ ọrụ ya nakwa n’ụlọ ya nke dị na Akwa Ibom steeti.

E nyere ya oche azụ ọnwa isii n’ụbọchị isii nke ọnwa March n’ihi nsogbu gbasara ọnọdụ oche n’ụlọ omeiwu nke Naijiria.

N’ụbọchị iri n’otu nke ọnwa March, onye senator nke Kogi a kpesara oche azụ a e nyere ya nye nnokọ mba ụwa nke ụlọrụ United Nations (UN) bu Inter-Parliamentary Union (IPU).

ICC Ò NYÈRÈ ÌWÚ KÀ Á KPỌ̀CHÍÉ GODSWILL AKPABIO NÀ ǸGÁ?

ICC bụ ụlọ ikpe ndị omekome mba ụwa nke na-enyoba anya ma na-emegide ndị mmadụ e bòrò ebubo arụ dị ụkwụ n’obodo ọbụla.

Inyocha okwu a, CableCheck lebara anya na webusite ICC ịmata ma ha ebiputara nya bụ ozi maka ịnwụchi onye ome iwu a, mana anyị ahụghị ihe dị otu ahụ.

Anyị chọpụtakwara na onweghị ụlọ ozi bipụtara nya bụ okwu.

CableCheck kpọtụkwara Fadi El-Abdallah, onye nkwuchita ọnụ ICC, onye kwuru na onweghị ozi ịnwụchi Akpabio maọbụ onye ọbụla si Naijiria ha bipụtara.

El-Abdallah kwuru na ọ bụ ọrụ ICC ikwuputa mbido nnyocha ọbụla ha na-akwado ime na webusite ha tupu ha enye iwu ka a kpọchie onye dị ótú ahụ.

“Enweghị iwu ịkpochi onye ọbụla na Naijiria. Ebe ndị na-eme nya bụ nchọpụta e kwupụtabeghị nya bụ ozi na webusite ha, usoro dị mkpa tupu ICC enye iwu maka ịkpochi onye dị ota a,”El-Abdallah kwara Cablecheck site na ozi email.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozi na ICC enyela iwu ka a kpọchie Akpabio na nga bụ asị.

TAGGED: arrest, Factcheck in igbo, Godswill Akpabio, ICC, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu April 5, 2025 April 5, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Claim that Davido and Chioma are expecting their third child is false

A post claims that Afrobeats star Davido and his wife, Chioma Adeleke, are expecting another…

November 24, 2025

AI ni wọ́n fi se fídíò tó sàfihàn pé àwọn ISWAP yin ìbọn fún ọ̀gá àwọn òṣìṣẹ́ ológun kan

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ń pín kiri ti sàfihàn ìgbà tí àwọn ènìyàn kan…

November 20, 2025

Video wey show as ISWAP shoot army general na AI

One viral video don allegedly show di time wey terrorists kill Musa Uba, one brigadier…

November 20, 2025

Bidiyon da ke nuna harbin Janar na soji da ISWAP aka yi shi ne AI

Wani faifan bidiyo da aka ce ya nuna lokacin da wasu mahara suka kashe Birgediya…

November 20, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

AI ni wọ́n fi se fídíò tó sàfihàn pé àwọn ISWAP yin ìbọn fún ọ̀gá àwọn òṣìṣẹ́ ológun kan

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ń pín kiri ti sàfihàn ìgbà tí àwọn ènìyàn kan pa Musa Uba, ọ̀gá àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 20, 2025

Video wey show as ISWAP shoot army general na AI

One viral video don allegedly show di time wey terrorists kill Musa Uba, one brigadier general, for Borno state. Islamic…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 20, 2025

Bidiyon da ke nuna harbin Janar na soji da ISWAP aka yi shi ne AI

Wani faifan bidiyo da aka ce ya nuna lokacin da wasu mahara suka kashe Birgediya Janar Musa Uba a jihar…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 20, 2025

Kò sí ẹ̀rí tó sàfihàn pé Trump halẹ̀ pé òhun yóò ‘mu’ Tinubu láàárín wákàtí mẹrinlelogun

Ọ̀rọ̀ kan sọ pé Donald Trump, ààrẹ orílẹ̀ èdè Amẹ́ríkà ti dúnkokò pé òhun yóò mú Bọ́lá Tinubu, ààrẹ orílẹ̀…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 14, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?