Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru na Godwin Emefiele, onye bụbu gọvanọ ụlọ akụ etiti Naijiria, weghachiri tari Naira anọ (N4 trillion) nye gọọmentị etịtị.
N’ime ihe ngosị ahụ ruru nkeji iri n’ise (15 minutes), onye ahụ kwuru n’ọbụ na ‘ọ́bá nzisa ozị’ ka o nwetara akụkọ ya.
“A gụtara m na akụkọ na Emefiele eweghachiela tari Naira anọ (N4 trillion). Ọ bụghị nde Naira anọ (N4 million), ọ bụghị nde Naira iri n’anọ (N40 million), maọbụ nde nari Naira anọ (N400 million). Ọ bụghị otu ijeri Naira(N1 billion), ijeri Naira anọ( N4 billion), ijeri naira iri anọ( N40 billion), ijeri narị Naira itolu( N900 billion) otu tari Naira ( N1 trillion) maọbụ tari Naira abụọ(N2 trillion),” onye ahụ kwụrụ.
“Ótù onye dịka onye bụ bụrụ gọvanọ… weghachitara ya na òbá ege Naijiria, onye dị otú a bụ onye otu okpukperechi n’ụlọ ụka.”
Ọ jụrụ ma ndị Naịjirịa a ma ego ole onye ọbụla ga-eketa ma ekee nya bụ ego.
Onye a gara n’ihu kwuo na a chọpụtara nya bụ ego achọpụta, tinyere na ego ahụ esoghị na ndị na na òbá ego dị na mba ofesi.”
CableCheck chọpụtara na ọ bụ asafe Facebook akpọrọ @Gio TV bipụtara nya bụ ozị n’ubochi ịrị abụọ n’itolu nke ọnwa June (June 29).
Ozi ahụ e nwetala nkirị karịrị puku itolu (9,000 views), nkwenye otu narị n’ịrị n’abuo (112 likes), na ntụnye ọnụ iri abụọ n’itoolu (29 comments) nke n’ekwuputa mgbagwoju anya ha ma nya bụ ozi o ziri ezi.
ŃTỌ́GHÉ ÁKỤ́KỌ́
Emefiele na-agabiga ọtụtụ ebubo, nke gụnyere ịji ọnọdụ ya dịka onye gọvanọ CBN nweta ọtụtụ ụlọ nya na ego nke a siri n’ositere n’ụzọ n’ezighi ezị nweta.
N’ụbọchị mbụ nke ọnwa Novemba nke afọ 2024, Deinde Dipeolu, onye ọ̀kà ịkpe ụlọ ikpe high court dị na Lagos, nyere ịwụ ka Emefiele hapụru gọọmenti ego niile nke gụnyere nde dollar abụọ n’uma pụku iri anọ n’ise ($2.045 million), ụlọ nọ ọbasara ala asaa (seven choice landed properties), na asambodo o jị nwere òkè n’ụlọ nchekwa ego Queensdorf Global Fund Limited Trust.
Akụ n’ụba ndị ahụ, ka e kwuru na o nwetara site n’ego ọ kpatara n’ụzọ n’ezighi ezị.
Òkè ndị ahụ ọ hapụrụ gọọmenti gụnyere ụlọ abụọ nọchapụrụ onwe ya dị na No. 17b n’okporo ụzọ Hakeem Odumosu na Lekki Phase 1, nke Lagos; àlà ana emetubeghi áká ọbasara ya rụrụ square meter otu pụku na narị itoolu n’ịrị n’itolu n’uma narị ise n’iri itoolu n’abuo (1919.592 sqm) nke akara nyocha ya bu (No. DS/LS/340) di na Oyinkan Abayomi Drive (nke a maburu dika Queens Drive), na Ikoyi, Lagos; ulo bungalow nke di na No. 65a Oyinkan Abayomi Drive (nke a maburu dika Queens Drive), nokwa na Ikoyi, Lagos, ya na ọnụ ulo duplex anọ nke dị na 12a n’okporo ụzọ Probyn na Ikoyi.
Ndị ọzọ bụ ụlọrụ industrial complex nke aka na-arụ aru nọ na obosara ala ruru iri abụọ n’abuo na Agbor, Delta steeti; ọnụ ụlọ asatọ nokọtara ọnụ n’àlà obosara ya dị square meter pụku abụọ na narị anọ n’iri ise n’asaa n’uma iri isii (2457.60sqm) dị na No. 8a n’okporo ụzọ Adekunle Lawal, di na Ikoyi, tinyere ulo duplex na ihe niile e jiri chọọ ya mmá nke nọ n’àlà obosara ya rụrụ square meter pụku abụọ na narị abụọ n’iri n’asaa (2217.87sqm) dị na 2a n’okporo ụzọ Bank Road, dị na Ikoyi, Lagos.
K’osiladị, ụlọ ikpe kachasị elu nyere iwu ka Emefiele ghara iweghachiri gọọmenti akụ n’ụba ndị ahụ.
ŃNYÒCHÁ
CableCheck jiri ị́gwé nyocha reverse image search were nyocha akụkụ ihe ngosị ahụ.
Ihe anyị chọpụtara kwụrụ na nya bụ ihe ngosị pụtara ihe kamgbe afọ 2023.
Ótù onye na X a kpọrọ @Gen_Buhar, bipụtara nya bụ ozi n’onwa Novemba nke afọ 2023.
Nya bụ ozi pụtara ìhè ọzọ n’onwa Januwari nke afọ 2024, May 2024 nakwa na June 2024.
CableCheck nyochara ozi si ụfọdụ oba ozi amara ofuma n’ebiputa ozi gbasara nya bụ okwu, ma chọpụta na enweghị ozi dị otu a ebipụtara.
Na mgbakwunye, anyị jiri ígwè nyocha Google were mee mfokasi ma chọpụta na nya bụ ozi ezighị ezị, kama ọ bụ ozi nke a na ebipụta dịka ozi ọhụrụ kwa afọ nke n’abughi eziokwu.
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Ozi na Emefiele weghachiri gọọmenti etiti tari Naira anọ bụ asị.