TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra
Share
Latest News
Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya
No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party
Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀
A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro
Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI
AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa
Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á
Bidiyon da ke nuna ‘gada ta rushe a Nasarawa’ AI ce ta samar
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 11, 2025 4 Min Read
Share

Nyesom Wike, onye minista nke isi obodo Naijiria bụ FCT, kwuru na Peter Obi, onye bụ buru gọvanọ Anambra steetị na onye jiri òtù Labour Party zọ ọkwa onye isiala n’afọ 2023, ahazighị ntụliaka ọchịchị mpaghara mgbe ọ́ chị̀rị̀.

Wike kwuru nke a na Abuja n’ụbọchị Sunday, n’ụlọ ụka St. James Anglican Church dị na Asokoro, mgbe ọ gara ụka ekele maka ọrụ ngo ndị o hibere na Abuja.

Ọ pụtara ìhè na onye minista na-akọ ndị ndu partị na-ama ọchịchị onye isi ala Bola Tinubu áká n’ihu ọnụ, ma na-ebokwa ha ebubo na ha na-achọ ọdịmma nke onwe ha.

“Ị kwuru na Peter Obi ga-abụ onye isi ala. Onye isi ala na ebee? Ụfọdụ n’ime ụnụ na-akwado onye ụnụ n’amaghị, ụnu na-akwado n’ihi obi ebere,” Wike kwụrụ.

“Ọ bụ gọvanọ afọ asatọ, ọ meghị ntụliaka ọchịchị mpaghara. Iwe e nweghị ndị Naijiria na ọ jụrụ ime ntụliaka ọchịchị mpaghara. Afọ asatọ o ji bụrụ gọvanọ Anambra, ị kpọrọ nke ahụ ọchịchị onye kwa uche ya? Naanị otu nwoke bụ gọvanọ na onye isi mpaghara niile nke steeti ya.”

Okwu Wike na-abịa ka ụbọchị ole n’ole gachara dịka patị na-anọghị n’ọchịchị bịakọtara ọnụ were họpụta African Democratic Congress (ADC) dịka patị a ga-eji wepụ Tinubu n’ọchịchị n’afọ 2027.

Okwu ya kpalitere mgbagwoju anya ma Peter Obi o mere ntụliaka na Anambra mgbe ọ bụ gọvanọ.

ŃTỌ́GHÉ ÁKỤ́KỌ́

Tupu ụlọ ikpe kachasị elu na Naijiria enye iwu maka nwere onwe ọchịchị mpaghara n’ọnwa Julaị nke afọ 2024, ndị gọvanọ nwere ikikere ebe ọchịchị mpaghara nọ.

Ọ́bú ihe pụtara ìhè na ọchịchị steeti ga ejide ego ọchịchị mpaghara ma họpụtaka onye nlekọta nye ọchịchị mpaghara nọ na steeti ha.

Ụlọ ikpe dị elu nyere iwu ka ego ruru ọchịchị mpaghara bụrụ nke akwụnyere ọchịchị mpaghara, iji kwalite ọchịchị onye kwa uche ya na mpaghara niile nọ na Naijiria

Peter Obi bụ gọvanọ Anambra site n’afọ 2006 rụọ 2014, nke ọchịchị ya nwere ọtụtụ ịma aka n’ihu n’ihi nwepu ewepụrụ ya n’ọchịchị mgbe ọ bụ gọvanọ.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

CableCheck chọpụtara na n’ụbọchị iri n’abụọ nke ọnwa Januwari nke afọ 2014, ka ọ fọdụrụ ọnwa abụọ ka Obi pụọ n’ọchịchị, emere ntụliaka elu ọchịchị mpaghara iri abụọ n’otu (21LGAs) dị na steetị Anambra.

Mgbe ahụ, patị All Progressives Grand Alliance (APGA),nke nọ n’ọchịchị meriri mpaghara iri abụọ n’ime mpaghara iri abụọ n’otu (20 of 21 LGAs), nya na ọkwá ndị councilor narị atọ n’anọ n’ime narị atọ n’rie abụọ n’isii (304 of the 326 counsellorship seats).

N’ụbọchị iri n’atọ nke ọnwa Januwari nke afọ 2014, ka ụbọchị atọ gachara site n’ụbọchị e mere ntụli aka élú ọchịchị mpaghara. Obi nabatara ndị merịrị na ntuliaka ahụ, ma yọ ha ka ha na Willie Obiano, onye meriri na ntụliaka gọvanọ emere na steetị ahụ mgbe ahụ, rukọ ọfụma.

CableCheck chọpụtakwara na nya bụ okwu bụ nke enyochagoro na mbụ, mgbe Reno Omokri, onye bụ buru onye ọrụ ọchịchị otu onyeisiala, kwuru otu okwu a n’ụbọchị iri n’abụọ nke ọnwa Julaị nke afọ 2024.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na Peter Obi emeghị ntụliaka ọchịchị mpaghara na Anambra mgbe ọ bụ gọvanọ bụ asị.

TAGGED: Anambra LG election, fact check in Igbo, news in Igbo, Nyesom Wike, peter obi

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 11, 2025 July 11, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna…

August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and…

August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi…

August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru,…

August 1, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna iri abụọ n'ise (25 commissioners)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and oda appointees becos dem no…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi dá àwọn kọmisọnna marundinlọgbọn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru, gwamnan Ebonyi, ya dakatar da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?