TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Trump ọ̀ nà àchụ́pụ̀ ndị Naijiria 3.5 million nà US?
Share
Latest News
FACT CHECK: Viral image depicting ‘Obasanjo prostrating for Ladoja’ photoshopped
Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra
Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra
Wike yayi kuskure. Peter Obi ya gudanar da zaben LG a matsayin gwamnan Anambra
Wike make mistake. Peter Obi conduct LG election as Anambra governor
Video wey show as Thomas Partey dey blame ‘rape’ case on racism na fake
Bidiyon da ke nuna Partey yana zargin shari’ar ‘fyade’ akan wariyar launin fata da aka gyara ta hanyar lambobi
AI ni fídíò tí ó fi ẹ̀sùn ìbánifipálòpọ̀ kan Thomas Partey
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Trump ọ̀ nà àchụ́pụ̀ ndị Naijiria 3.5 million nà US?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published January 24, 2025 6 Min Read
Share

Ótù onye na soshal midia ekwuola na Donald Trump, onye isi ala mba US na-akwado ịchụpụ ndị Naijiria ruru nde atọ n’ụma narị asaa (3.7 million) na obodo US.

Onye a kwuru nke n’ụbọchị Monday — ụbọchị Trump were oche dịka onye isiala mba US — na nya bụ nchụpụ ndị Naijiria ga-abụ n’ụbọchị Tuesday.

“Trump na-achụlata ndị a niile echi. Lee onye nọ n’isi ọnụọgụgụ ndi a ga-achụpụ,” @Zaddy_Bruh, onye nwere ọkọlọtọ Russia n’akụkụ aha ya dere na X.

Naijiria bụ obodo mbụ n’ọnụ ọgụgụ nwere mmadu nde atọ n’ụma asaa (3.7 million) dịka ndị aga-achụlata. Zimbabwe, obodo sochiri ya azụ, nwere madu narị asaa n’iri isii n’ise (765,000). Ghana nwere mmadu otu nde n’ụma narị abụọ (1.2 million). Mozambique na Bangladesh nwere ótù nde narị na iri abụọ n’atọ na otu nde na ụma narị itoolu n’otu n’otu (123,000 and 1.9 million respectively).

Obodo ndị ọzọ ozi ahụ depụtara bụ Brazil nke nwere ọnụọgụgụ mmadụ nde isii n’ụma narị itoolu (6.9 million), Democratic Republic of Congo (DRC) nwere ndị mmadụ nde abụọ n’uma otu narị (2.1 million), ebe Mexico nwere nde iri na asaa n’uma narị asaato (17.8 million).

Edeputaghị obodo ndị ahụ n’usoro obodo kara nwe mmadụ a ga-achụlata n’obodo ha gasị, mana Naijiria bụ ya nọ n’isi.

Ozi a enwetala nkiri nde abụọ n’ụma asaa (2.7 million views), nkwenye pụku iri n’asaa (16,000 likes), nkesa pụku abụọ (2000 retweets), nchekwa ịgụ mgbe ọzọ puku iri n’anọ (1400 bookmarks), na ntụnye ọnụ ndị mmadụ na e kwupụta ụjọ ha gbasara ozi ahụ ruru otu puku na narị atọ ( 1300 comments).

ŃNYÒCHÁ

Tupu Trump e merie na ntuliaka ọkwa onye isialaz, o kwuru na ibelata otu ndị mmadụ si abata na US sò n’otu n’ime ihe dị ya mkpa.

Trump, ọtụtụ oge, ekwuola na ndị mba ọzọ bí na US dịka ndị bịara abịa na-akwalite mpụ n’obodo ahụ.

N’ụbọchị ọ were oche dịka onye isiala, ọ bianyegasịrị aka n’akwụkwọ maka inwogharị ọtụtụ iwu obodo ahụ.

N’ime iwu ndị ahụ bụ nkwuputa ọnọdụ mberede nke òkè ala dị n’etiti US na Mexico, ma nyekwa kwubie ka e zipu ọtụtụ ndị agha ka ha kwalịte nchekwa nya bụ ogige.

“Anyi ga-emechi ụzọ mbata niile n’ezighi ezi, ma bido usoro ichụghachi nde kwuru nde ndị ohi si mba ọzọ ebe ha si,” Trump kwuru.

Trump kwukwara na ọchịchị ya wehachitara atụmatụ akpọrọ “Remain in Mexico”, nke na-achọ ka ndị na-agabiga mmekpa ahụ n’obodo ha chere obere oge na obodo Mexico tupu a nabata ha na US.

Nya bụ onye isi ala US akpoghị obodo ọzọ aha, mana uche óbì ya nye ndị si mba ọzọ abata US bụ nke pụtara ìhè.

Dịka ozi nke ụlọ ọrụ ndekọ ọnụọgụgụ mmadụ bụ Migration Policy Institute (MPI) nke afọ 2024 kwuru, ndị mmadụ si mba ọzọ bi na US ruru nde iri anọ n’isi n’ụma narị puku abụọ (46.2 million).

Ozi ahụ sitere n’ụlọọrụ ndekọ ọnụọgụgụ mmadụ na obodo ahụ bụ US Census Bureau na ụlọrụ nchekwa akpọrọ US Department of Homeland Security (DHS).

Ozi si n’ụlọ ọrụ nchekwa DHS gosịrị na ọnụọgụgụ ndị Mexico nọ na US dị nde anọ n’ụma iri asatọ n’otu (4.81 million) n’afọ 2022, nke bukarichara ọnụgugu ndị batara US n’ụzọ n’ezighị ezi.

A gụcha Mexico, obodo ọzọ nwere ọtụtụ ndị batara US n’ụzọ n’ezighi ezị bụ Guatemala, El Salvador, na Honduras.

Ndị ọzọ gụnyere, Philippines, Venezuela, Colombia, Brazil, India, na China.

Dịka n’afọ 2023, ozi sị̀ na ụlọ ọrụ ndekọ ọnụọgụgụ mmadụ bụ United States Census Bureau gosịrị na ọnụogugu ndị Naijiria nọ na mba US dị puku narị isii n’anọ na iri asaa m’asaa (604,077).

Ọ dị mkpa ịmata na usoro ịchụlata mmadụ site na mba US abụghị nke a na-eme n’otu ụbọchị, dịka ozi ahụ kwuru.

Onye obodo ọzọ a chọrọ ịchụlata n’obodo site na US bụ nke e nwere ike ijide na ogige ụlọrụ US Immigration and Customs Enforcement (ICE) tupu oge atụrụ anya eruo.

Ka e jide onye ahụ n’ogige ụlọrụ ICE, a ga-abịazi kpọpụ ya n’ụlọ ikpe ka okaipke kpee ha ikpe.

Na mgbakwunye, onwebeghị ozi mba US maọbụ nke ụlọ mgbasa ozi kwuru na ọnụọgụgụ ndị Naijiria nde atọ n’ụma narị asaa (3.7 million) ka a na-akwado ịchụlata n’obodo ha.

ḾKPÉBÌ

Onweghị ihe aka ebe na-egosị na Trump enyela iwu ka a chụlata ụfọdụ ndị obodo ọzọ bi na US.

TAGGED: Donald Trump, fact check in Igbo, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu January 24, 2025 January 24, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Viral image depicting ‘Obasanjo prostrating for Ladoja’ photoshopped

An image showing a person prostrating for Rashidi Ladoja, the Olubadan-in-waiting and former governor of…

July 11, 2025

Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra

Nyesom Wike, onye minista nke isi obodo Naijiria bụ FCT, kwuru na Peter Obi, onye…

July 11, 2025

Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra

Nyesom Wike, minisita fún Federal Capital Territory (FCT), Abuja, olú ìlú orílẹ̀ èdè Nàìjíríà, sọ…

July 11, 2025

Wike yayi kuskure. Peter Obi ya gudanar da zaben LG a matsayin gwamnan Anambra

Nyesom Wike, ministan babban birnin tarayya Abuja, ya ce Peter Obi, tsohon gwamnan Anambra kuma…

July 11, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra

Nyesom Wike, onye minista nke isi obodo Naijiria bụ FCT, kwuru na Peter Obi, onye bụ buru gọvanọ Anambra steetị…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 11, 2025

Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra

Nyesom Wike, minisita fún Federal Capital Territory (FCT), Abuja, olú ìlú orílẹ̀ èdè Nàìjíríà, sọ pé Peter Obi, ẹni tí…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 11, 2025

Wike yayi kuskure. Peter Obi ya gudanar da zaben LG a matsayin gwamnan Anambra

Nyesom Wike, ministan babban birnin tarayya Abuja, ya ce Peter Obi, tsohon gwamnan Anambra kuma dan takarar shugaban kasa na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 11, 2025

Wike make mistake. Peter Obi conduct LG election as Anambra governor

Nyesom Wike, minister of di Federal Capital Territory (FCT), tok sey Peter Obi, forma govnor of Anambra and 2023 Labour…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 11, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?