TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Tinubu nà Alexander Zingman ọ̀ gàrà ótù ụ́lọ̀ákwụ́kwọ́? Lèé íhé ányị́ mà
Share
Latest News
HOAX ALERT: Cross River disowns viral Cally Air ‘boobs safety’ assurance advert
Seven ways to detect an AI-generated video
BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams
The rise of deepfakes and the fight for digital truth
DISINFO ALERT: Health ministry debunks AI video claiming free nationwide diabetes treatment
Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east
Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east
Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Tinubu nà Alexander Zingman ọ̀ gàrà ótù ụ́lọ̀ákwụ́kwọ́? Lèé íhé ányị́ mà

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published June 28, 2025 5 Min Read
Share

N’ụbọchị Monday mgbe e hibere atụmatụ ńkwàdó ọrụ ubi a kpọrọ renewed hope mechanisation programme na Abuja, onye isi ala Bola Tinubu kwuru na Alexander Zingman, onye azụmahịa a mara ọfụma sí mba Belarus, bụ ọ̀gbọ́ ya mgbe ha gara akwụkwọ na mahadum Chicago State University (CSU).

Dịka Zingman nọ na nya bụ ọgbakọ, Tinubu kọwara ya dịka “ezigbo enyi ya” na “agbata obi ya” mgbe ha nọ na CSU.

“Nye ụnụ niile, Alex bụ ezigbo agbata obi m, anyị  gakwara ótù ụlọakwụkwọ,” Tinubu kwụrụ.

“E ji m aka nà ụlọ akwụkwọ anyị ga-enwe obi aṅụrị na anyị na-eme ihe a n’ebe a taa.”

Okwu Tinubu bịara kpalie mkparịta ụka gbasara agụma akwụkwọ ya n’azụmahịa  Zingman na Afrika.

Ọtụtụ n’ime okwu ndị ahụ bụ gbasara agumakwụkwọ Tinubu.

GỊ́NỊ KÀ ÀNYỊ́ MÀ GBÀSÁRÁ ZINGMAN?

Zingman bụ onye azụmahịa si obodo Belarus.

N’ọnwa Januwari nke afọ 2019, mba Zimbabwe họpụtara ya dịka onye nnọchite anya ha n’ihe gbasara azụmahịa na obodo Belarus. Zingman banyere na ọtụtụ nkwekọrịta azụmahịa ọkachasị n’obodo Zimbabwe and Congo.

O nwekwara aka n’azụmahịa nke AFTRADE DMCC, ụlọrụ Dubai nke na-emepụta ngwa ọrụ e ji akọ úgbó.

E kwuru na ọ bụ ótù n’ime ndị nwe nnukwu òkè n’ụlọ ọrụ ahụ.

N’ụbọchị Tuesdae, otu asafe X nke nwere aha ụlọ ahụ kesara ihe ngosị e sere na mmemme ahụ nke emere na Abuja.

Ozi ya gụrụ: “Nke a bụ nukwu agamn’ihu nye AFTRADE DMCC! Ụnyahụ, anyị hibere atụmatụ Renewed Hope Mechanization Programme ńké mba Naijiria. Ihe a bụ nnukwu njem n’ihe gbasara ọrụ ubi n’obodo ahụ. Anyị nwere aṅụrị isonye na nya bụ nwoghari!”

A screenshot of the X post

N’ọnwa March 2021, a nwụchiri Zingman  n’obodo Democratic Republic of Congo (DRC) maka ebubo ire na ịzụ égbè. E mechara tọghapụ ya ka ụbọchị iri n’abụọ gachara n’enweghị ebubo ọbụla e boro ya, dịka ọ gọnayịchara ha niile.

E nweghị ọtụtụ akụkọ gbasara nwamadị a pụtara ihe. Mana ótù ozi anyị hụtara nke echekwara si na Day Night TV, ụlọ ozi nke nọ na mba Ukrainian, nyere anyị ihe anyị kwesịrị ịmata gbasara Zingman. Ozi ahụ adịghịzi na website ụlọ mgbasa ozi ahụ, mana CableCheck chọtara nya bụ ozi na asafe Zingman nke dị na Wikipedia.

Dịka Zingman gwara  Day Night TV, nya bụ ozi kwuru na a mụrụ Zigman n’ụbọchị iri abụọ n’isii nke ọnwa Novemba n’afọ 1966 (November 26, 1966) na Minsk, isi obodo  Belarus. Nke a pụtara na ọ ga-adị afọ iri ise n’itoolu (59 years) n’ọnwa November nke afọ 2025.

Na nya bụ ozi, ha kwuru na Zingman gara mahadum na Belarusian National Polytechnic University ebe ọ gụrụ na ngalaba Robots and Robotic Systems site n’afọ 1985 ruo 1989.

Ọ gbakwunyere na ọ gụrụ business marketing na University of Illinois nke dị na Chicago, United States site n’afọ 1991 ruo 1995. Ọ nwetakwara asambodo Master’s ya n’otu mahadum ahụ.

O kwuru na ọ rụrụ n’ụlọ agha ndị Soviet Union site n’afọ 1983 ruo 1985.

Ị́TỤ̀LÉ ÀGỤ̀MÁKWỤ́KWỌ́ ZINGMAN NA NKE TINUBU

Agumaakwụkwọ Tinubu gosịrị na ọ gara Chicago State University (CSU) n’afọ 1979 ma nweta asambodo na business administration, accounting, na management. K’osiladị, e nweela ọtụtụ okwu gbasara agumaakwụkwọ onye isi ala.

Okwu Tinubu na ya na Zingman gara otu ụlọ akwụkwọ nke bụ CSU, bụ nke ihe aka ebe pụtara ìhè na akwadoghị. Onye azụmahịa a si mba Belarus kwuru na ọ gara mahadum na University of Illinois, Chicago (UIC).

CSU na UIC bụ ụlọakwụkwọ abụọ dị na Chicago n’ime Illinois, mana ha abụghị ótù ụlọ akwụkwọ.

N’agbanyeghị na Tinubu ekwughị na ya na Zingman gara akwụkwọ otu mgbe, onye azụmahịa a ga-adị ihe dịka afọ iri n’abụọ (11 years) mgbe Tinubu bara mahadum n’afọ 1977, ma dịkwa afọ iri n’atọ (13 years) mgbe ọ gụchara.

Dịka ozi nke anyị hutara kwuru, Zingman abatabeghị US mgbe Tinubu nọ CSU. K’osiladị, onweghị ozi ịmata mgbe Zingman batara US.

Ozị Tinubu kwuru na o bidoro ọrụ dịka onye nnyocha akwụkwọ ndekọ ego ụlọọrụ Mobil Oil Nigeria PLC na ngwụcha afọ 1983.

Mgbe Zingman nọ na afọ nke abụọ ya na UIC, Tinubu bụ onye senator na-anọchite anya Lagos West na Naijiria.

CableCheck degara mahadum UIC ozi ịmata ma Zingman ọ gara nya bụ ụlọ akwụkwọ, mana ruo mgbe anyị bipụtara ozi a, ha azaghachibeghị ozi ahụ.

TAGGED: Alexander Zingman, Bola Tinbu, fact check in Igbo, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu June 28, 2025 June 28, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

HOAX ALERT: Cross River disowns viral Cally Air ‘boobs safety’ assurance advert

The Cross River state government has disowned a viral image of a purported Cally Air…

August 15, 2025

Seven ways to detect an AI-generated video

A video announcing the launch of a free nationwide diabetes treatment recently went viral across Nigerian…

August 13, 2025

BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams

It sounded exactly like her, but it was not. Adeola Fayehun was thousands of miles…

August 12, 2025

The rise of deepfakes and the fight for digital truth

BY PRUDENCE OKEOGHENE EMUDIANUGHE On May 30, 2025, a 49-minute video surfaced on a YouTube…

August 12, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east

One Facebook user don claim sey video wey show as hooded armed security operatives dey break into residential apartment hapun…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east

Ótù onye na Facebook ekwuola na ihe ngosị ebe mmadụ na-agbaka ụlọ obibi mmadụ mere na south-east. N'ụbọchị iri abụọ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára sọ pé fídíò tí ó se afihan àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa wani faifan bidiyo da ke nuna jami’an tsaro dauke da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?