Ótù ihe ngosị ebe Seyi Tinubu, dịọkpara onyeisiala Bola Tinubu, pụtara ka ọ̀ na-enweta ihe yiri “nkwanye ùgwù” ndị mịlịtrị kpalitere ọtụtụ ntụnye ọnụ na soshal midia.
N’ụbọchị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa December, Mahdi Shehu, onye na-atụnye ọnụ n’okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, bipụtara ihe ngosị nkeji anọ nke nwere ókwú ńkátọ̀ dịka isi okwu ya.
“Ọ bụ naanị na Naijiria ka onye n’abụghị onye agha ga-enweta ụdị nkwanye ùgwù a na-enye sọ̀ ndị mịlịtrị, n’ihi na nna ya bụ onye isi ala,” Shehu dere na X.
Ozi a enwetala nkiri otu narị na isii (106k views), nkwenye narị asatọ n’iri asatọ (880 likes), nkesa narị ise n’iri asaa n’ise (575 retweets), ntụnye ọnụ narị abụọ n’iri isii n’abụọ (262 comments), na nchekwa maka ịgụ mgbe ọzọ otu narị n’ịrị ise (150 bookmarks).
N’ụbọchị Sunday, Atiku Abubakar kọtọrọ “nnabata ndị mịlịtrị” a.
Na mbipụta nke onye nkwuchita ọnụ ya bịpụtara, Abubakar kwuru sị na nnyocha maka nya bụ nnabata kwesịrị ekwesị. Ọ sị na o megidere omenala ndị mịlịtrị.
KÈDÚ ÍHÉ MÉJÙPÙTÀRÀ ŃKWÁNYÉ ÙGWÙ ŃDỊ́ MỊ́LỊTRỊ̀ NÀ NAIJIRIA?
Nkwanye ùgwù ndị mịlịtrị bụ emume ndị agha na-eme iji kwanyere onye a ma-ama maọbụ nnukwu mmadu nwụrụ-anwu ùgwù.
Nkwanye ùgwù ndị mịlịtrị na nkwanye ùgwù ndị nchekwa pụtara ihe dị iche-iche, n’agbanyeghị na ha abụọ nwere ụdị ngosị yiri onwe ha.
Nkwanye ùgwù ndị mịlịtrị, nyere ndị Federal Road Safety Corps (FRSC), bụ mbịakọta ndị agha soja ndị na-aga n’usoro ziri ezi iji gosị ike ha, ọzụzụ ha, na nkwado ha.
Ndị nchekwa pụrụ iche, nke a kpọrọ “Guard of Honour” na bekee, bụ ndị a họpụtara ịnabata ndị ọ́bị̀à nwere ùgwù maọbụ, ịchekwa ndị dị mkpa, maọbụ ịnabata ndị na-esonye na mmemme dị mkpa nke ọchịchị obodo haziri.
Ndị na-emejupụta òtù a bụ ndị a zụrụ nke ọma ime ngosị dị ótú à iji kwanyere ndị mmadụ maọbụ mmemme ùgwù.
ÍYÒCHÀ ÓKWÚ À
Òtù nke nabatara diọkpara onye isiala n’ihe ngosị ahụ bụ ndi ntorobịa na-eyi akwa uhie akpọrọ Community Auxiliary Development for Effective Transformation Network (CADETN).
N’etiti ọgbaghara gbasara nnabata a, J.G Fatoye, onye isi otu a, bipụtara ozi n’ụbọchị Monday na-akọwa na ihe Seyi nwetara bụ nnabata otu ndị nchekwa pụrụ iche. Ọ sị na ọ bụghị nke ndị agha mịlịtrị
“Dịka òtù ndị ntorobịa na-arụ ọrụ enyemaka, anyị chọrọ ịkọwa mgbagwoju anya a. O kwesịrị ka onye ọbụla mata na ọ bụ òtù ndị nchekwa pụrụ iche a kpọrọ Guard of Honour ka e jiri nabata ndị ọbịa na ọgbakọ nkwado nke ndị ntorobịa,” ozi a kwụrụ.
Fatoye gbakwunyere na nnabata ahụ abụghị naanị Seyi ka e nyere ya.
“Òtù Guard of Honour a nabatara ndị a ma-ama ọzọ, dịka onye na-enyere onye isi ala aka n’ihe gbasara ozi dị mkpa, dịka ọgbakọ ahụ nabatara minista ndị ntorobịa, minista na-ahụ maka akụ n’ụba ngalaba nka n’ụzụ, onye senior special assistant nyere onye isiala n’ihe gbasara ndị a na-achị achị, onye senior special assistant nyere onye isiala n’ihe gbasara ozi, ya na onye isi ndị ọrụ gọvanọ Ogun steeti,” Fatoye kwuru.
“CADETN bụ òtù ndị ntorobịa na-eyi uwe uhie n’abụghị uwe ndị mịlịtrị, nke n’enweghị njikọ ọbụla nye otu ndị agha mịlịtrị dịka ndị ọchọọ nganoko kwuru.
“Òtù a bụ òtù enyemaka na-arụ dịka Man O War, Peace Corps, Royal Ambassador, Man of Order, WAI Brigade, na ọtụtụ òtù enyemaka ndị ọzọ.”
Fatoye kwuru na e nweghị ndị agha mịlịtrị e jiri mee nya bụ nnabata, ma gbakwunye na egbe ndị e jiri mee nya bụ nnabata abụghị ezigbo egbe.
Onye isi òtù a gwara ndị mmadụ ka ha hapụ ikesa ozi ezighị ezi.
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Seyi Tinubu enwetaghị nnabata ndị agha mịlịtrị dịka ụfọdụ kwuru.