TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Seyi Tinubu ò nwètàrà ńkwányé ùgwù ńdị́ mị́lịtrị̀ dị́kà Mahdi Shehu kwùrù?
Share
Latest News
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?
FACT CHECK: Did Nigeria halt ‘mineral deal’ with US after visa restrictions?
FACT CHECK: Viral image depicting ‘Obasanjo prostrating for Ladoja’ photoshopped
Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra
Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Seyi Tinubu ò nwètàrà ńkwányé ùgwù ńdị́ mị́lịtrị̀ dị́kà Mahdi Shehu kwùrù?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published December 31, 2024 5 Min Read
Share

Ótù ihe ngosị ebe Seyi Tinubu, dịọkpara onyeisiala Bola Tinubu, pụtara ka ọ̀ na-enweta ihe yiri “nkwanye ùgwù” ndị mịlịtrị kpalitere ọtụtụ ntụnye ọnụ na soshal midia.

N’ụbọchị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa December, Mahdi Shehu, onye na-atụnye ọnụ n’okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, bipụtara ihe ngosị nkeji anọ nke nwere ókwú ńkátọ̀ dịka isi okwu ya.

“Ọ bụ naanị na Naijiria ka onye n’abụghị onye agha ga-enweta ụdị nkwanye ùgwù a na-enye sọ̀ ndị mịlịtrị, n’ihi na nna ya bụ onye isi ala,” Shehu dere na X.

Ozi a enwetala nkiri otu narị na isii (106k views), nkwenye narị asatọ n’iri asatọ (880 likes), nkesa narị ise n’iri asaa n’ise (575 retweets), ntụnye ọnụ narị abụọ n’iri isii n’abụọ (262 comments), na nchekwa maka ịgụ mgbe ọzọ otu narị n’ịrị ise (150 bookmarks).

N’ụbọchị Sunday, Atiku Abubakar kọtọrọ “nnabata ndị mịlịtrị” a.

Na mbipụta nke onye nkwuchita ọnụ ya bịpụtara, Abubakar kwuru sị na nnyocha maka nya bụ nnabata kwesịrị ekwesị. Ọ sị na o megidere omenala ndị mịlịtrị.

KÈDÚ ÍHÉ MÉJÙPÙTÀRÀ ŃKWÁNYÉ ÙGWÙ ŃDỊ́ MỊ́LỊTRỊ̀ NÀ NAIJIRIA?

Nkwanye ùgwù ndị mịlịtrị bụ emume ndị agha na-eme iji kwanyere onye a ma-ama maọbụ nnukwu mmadu nwụrụ-anwu ùgwù.

Nkwanye ùgwù ndị mịlịtrị na nkwanye ùgwù ndị nchekwa pụtara ihe dị iche-iche, n’agbanyeghị na ha abụọ nwere ụdị ngosị yiri onwe ha.

Nkwanye ùgwù ndị mịlịtrị, nyere ndị Federal Road Safety Corps (FRSC), bụ mbịakọta ndị agha soja ndị na-aga n’usoro ziri ezi iji gosị ike ha, ọzụzụ ha, na nkwado ha.

Ndị nchekwa pụrụ iche, nke a kpọrọ “Guard of Honour” na bekee, bụ ndị a họpụtara ịnabata ndị ọ́bị̀à nwere ùgwù maọbụ, ịchekwa ndị dị mkpa, maọbụ ịnabata ndị na-esonye na mmemme dị mkpa nke ọchịchị obodo haziri.

Ndị na-emejupụta òtù a bụ ndị a zụrụ nke ọma ime ngosị dị ótú à iji kwanyere ndị mmadụ maọbụ mmemme ùgwù.

ÍYÒCHÀ ÓKWÚ À

Òtù nke nabatara diọkpara onye isiala n’ihe ngosị ahụ bụ ndi ntorobịa na-eyi akwa uhie akpọrọ Community Auxiliary Development for Effective Transformation Network (CADETN).

N’etiti ọgbaghara gbasara nnabata a, J.G Fatoye, onye isi otu a, bipụtara ozi n’ụbọchị Monday na-akọwa na ihe Seyi nwetara bụ nnabata otu ndị nchekwa pụrụ iche. Ọ sị na ọ bụghị nke ndị agha mịlịtrị

“Dịka òtù ndị ntorobịa na-arụ ọrụ enyemaka, anyị chọrọ ịkọwa mgbagwoju anya a. O kwesịrị ka onye ọbụla mata na ọ bụ òtù ndị nchekwa pụrụ iche a kpọrọ Guard of Honour ka e jiri nabata ndị ọbịa na ọgbakọ nkwado nke ndị ntorobịa,” ozi a kwụrụ.

Fatoye gbakwunyere na nnabata ahụ abụghị naanị Seyi ka e nyere ya.

“Òtù Guard of Honour a nabatara ndị a ma-ama ọzọ, dịka onye na-enyere onye isi ala aka n’ihe gbasara ozi dị mkpa, dịka ọgbakọ ahụ nabatara minista ndị ntorobịa, minista na-ahụ maka akụ n’ụba ngalaba nka n’ụzụ, onye senior special assistant nyere onye isiala n’ihe gbasara ndị a na-achị achị, onye senior special assistant nyere onye isiala n’ihe gbasara ozi, ya na onye isi ndị ọrụ gọvanọ Ogun steeti,” Fatoye kwuru.

“CADETN bụ òtù ndị ntorobịa na-eyi uwe uhie n’abụghị uwe ndị mịlịtrị, nke n’enweghị njikọ ọbụla nye otu ndị agha mịlịtrị dịka ndị ọchọọ nganoko kwuru.

“Òtù a bụ òtù enyemaka na-arụ dịka Man O War, Peace Corps, Royal Ambassador, Man of Order, WAI Brigade, na ọtụtụ òtù enyemaka ndị ọzọ.”

Fatoye kwuru na e nweghị ndị agha mịlịtrị e jiri mee nya bụ nnabata, ma gbakwunye na egbe ndị e jiri mee nya bụ nnabata abụghị ezigbo egbe.

Onye isi òtù a gwara ndị mmadụ ka ha hapụ ikesa ozi ezighị ezi.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Seyi Tinubu enwetaghị nnabata ndị agha mịlịtrị dịka ụfọdụ kwuru.

TAGGED: Factcheck in igbo, military parade, news in Igbo, Seyi Tunubu

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu December 31, 2024 December 31, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?

Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n'ịkwụsị…

July 18, 2025

Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára ti sọ pé…

July 18, 2025

Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?

One Facebook user claim sey Nigeria revenge against di recent United States visa restriction by…

July 18, 2025

Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa Najeriya ta mayar da martani…

July 18, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?

Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n'ịkwụsị nkwekọrịta azụmahịa akụ ọnatarachi dị…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára ti sọ pé orílẹ̀ èdè Nàìjíríà hùwà sí…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?

One Facebook user claim sey Nigeria revenge against di recent United States visa restriction by stopping one alleged mineral deal…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa Najeriya ta mayar da martani ne kan takunkumin da Amurka…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?