TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ruto ọ̀ bụ̀ ónyé ǹdú ìzìzì nà Afrịka ḿbà USA kpọ̀rọ̀ òkù ńlétá kámgbè áfọ̀ ìrí àbụ̀ọ́
Share
Latest News
RoundCheck to host poetry festival on media and information literacy on December 12
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ruto ọ̀ bụ̀ ónyé ǹdú ìzìzì nà Afrịka ḿbà USA kpọ̀rọ̀ òkù ńlétá kámgbè áfọ̀ ìrí àbụ̀ọ́

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published March 18, 2024 4 Min Read
Share

William Ruto, nke Kenya, kwuru na ọ́ bụ̀ onye isiala mbụ nà Afrịka nke gọọmentị mba USA kpọrọ òkù nleta, ịbịa hụ onye ndu há kamgbe afọ iri abụọ gara aga.

Ruto kwuru nke a na nnukwu ọgbakọ Benny Hinn, onye na-ezisa ozi ọma n’ihe onyonyo, hibere na Nairobi, Kenya site n’ụbọchị iri abụọ n’anọ ruo ụbọchị iri abụọ n’ise nke ọnwa Febụwarị.

“Onye isiala mba USA akpọla onyeisi ala Kenya òkù. Nke a emebeghị kamgbe afọ iri abụọ gara-aga. Onwebeghị onye ndu mba Afrika USA kpọrọ òkù,” o jiri obi aṅụrị kwuo.

Ihe ngosị ebe o kwuru nke a bụ nke e biputara n’ọba ozi Citizen TV. Ihe onyonyo a nwetara nkiri karịrị narị abụọ na iri atọ n’itoolu (239,000) n’ótù ọba ozi nwere ndị nsọnye karịrị nde anọ na narị isii (4.6 million).

Okwu Ruto nwetara ọtụtụ ntụnye ọnụ ndị Kenya na X, nke a mabụrụ dịka Twitter. Ebe ụfọdụ na-ekesa okwu Ruto, ndị ọzọ na-aṅurị n’ihi nya bụ okwu.

Otu onye ji X ezịsa ozi bụ́ Sirengo Maurice kwuru na Ruto na-àkwádó ime kà Kenya bụrụ obodo ama ama. Mana onye ntụnye ọnụ ọzọ bịara jụọ ihe kpatara Ruto ji akọ akụkọ òkù nleta n’ọgbakọ okpukpere chi.

President Ruto is set to make history as the first African President in two decades to receive a State Visit Invitation from the President of the USA. Kenya is the Gateway to Africa, this visit underscores the potential for greater achievements under President Ruto's leadership. pic.twitter.com/dmGOnJfV79

— Naipamei Kaikai (@Kaikainaipaa) February 25, 2024

GỊ́NỊ BỤ̀ ŃLÉTÁ ÓNYÉ ÍSÍÀLÀ?

Nke a bụ nleta onye isiala ótù obodo nye onyeisiala ọ̀zọ́, nke na-abụkarị na nzite onye isiala nke ọzọ.

Osita Agbu, onye professor ọka nkuzi International Relations na mahadum Baze University, kwuru na nleta onye isiala “na-adị óké mkpa” ma “zuo òkè” n’ihi na ọ bụ ohere ndị ndu ji àkpá ńkàtá dị mkpa.

Nyere mba USA, nleta onyeisi ala n’ọnọdụ dị otu a na-egosị mmekọ há nà obodo ahụ dịka enyi. Ọ na-abụkarị ụbọchị anọ, nke na-enwe mmemme.

Nleta a, na-enwekarị oriri abalị n’ụlọ ọchịchị, oriri nke ehihie, nzite ịnọ na Blair Bouse ebe ndị ndu obodo bịara ileleta Washington DC na-anọkarị. Blair House bụ ebe obibi ndị ọbịa onyeisiala mba USA.

Nleta obodo abụghị ohere itule ndọrọndọrọ ọchịchị obodo. Kama, ọ na-egosị mmekọta ọma dị n’etiti obodo na obodo ọzọ.

ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ RUTO

Ịmata eziokwu dị n’okwu Ruto, TheCable lebara anya na nleta ndị ndu mba Afrịka nye mba USA, na mbụ ruo ugbu a.

Onyeisiala Edwin Barclay, nke Liberia, bụ onye ndu mbụ na mba Afrịka inweta nzita ịga mba USA n’ọnọdụ dị otu a, n’afọ 1943, n’okpuru ọchịchị Franklin Roosevelt, onyeisiala iri atọ n’abụọ nke USA.

K’osiladi, n’afọ 2008, afọ iri na isii gara-aga, John Kuffor, onye isiala Ghana na nwunye ya nwetara nzite a ịbia USA, n’okpuru ọchịchị George Bush, onyeisiala nke iri anọ n’atọ nke USA.

Bush kelere ya na ndị so ya wee bịa nya bụ nzite, ma too ya n’ihi mgbo ọ na-agba n’ime ọchịchị onye kwuo uche ya.

Tupu Kuffor aga na nleta a n’afọ 2008, Mwai Kibaki, onyeisi ala atọ nke Kenya, bụ onye nke Bush nabatara n’ọnọdụ nleta obodo n’afọ 2003.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu onyeisi ala Ruto bụ asị. N’agbanyeghị na ọ bụ onyeisiala mbụ nke obodo Kenya inweta nzite a n’afọ iri abụọ gara-aga, ọ bughị onyeisi ala mbụ nke mba Afrịka inweta nzite mba USA n’afọ iri abụọ gara aga.

TAGGED: United States, William Ruto

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu April 3, 2024 March 18, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

RoundCheck to host poetry festival on media and information literacy on December 12

RoundCheck, a fact-checking organisation, is set to host a youth-focused poetry festival on media and…

December 8, 2025

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?