TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ózí na-ekwu nà é mepụ̀tálá ìwú megidere cybercrime bụ̀ àsị́
Share
Latest News
Bidiyon AI-gyara na Peter Obi ya amfani yana tallata dandalin saka hannun jari
Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó
Dem use AI video of Peter Obi take advertise investment platform
AI ni wọ́n fi yí fídíò Peter Obi padà láti polówó ibi ìdókòwò kan
DISINFO ALERT: Obi dismisses photoshopped pictures with Donald Trump, MC Oluomo
FACT CHECK: AI-edited video of Peter Obi used to advertise investment platform
Mbà, á gághị̀ ágbáchị́bị́dó ákántụ̀ ńdị́ Naijiria n’énwéghị́ TIN sị́té Jánúwarị́ 2026
No, Nigerians without TIN no go lose dia bank accounts from January 2026
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ózí na-ekwu nà é mepụ̀tálá ìwú megidere cybercrime bụ̀ àsị́

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 30, 2025 4 Min Read
Share

Ózí a hụtara na soshal midia kwuru na ụlọ ọme iwu Naijiria emeputala iwu megidere “mpụ e ji ịntanetị eme nke afọ 2025”.

E kesara nya bụ ozị ọkachasị na X, WhatsApp, na Facebook.

Ozi ahụ kwukwara na iwu ahụ bụzi nke “pụtara ìhè na Naijiria ma bụrụkwa nke mmadu nwere ike ịga nga ma o meghe”.

“Ụlọ ome iwu nke Naịjiria n’okpuru ọchịchị Godswill Akpabio, onye isi ụlọ ome iwu senati, e meputala iwu megidere mpụ e ji ịntanetị eme nke afọ 2025. Nke a pụtara na iwu ahụ pụta ihe ọfụma na Naijiria,” ụfọdụ akụkụ ozị ahụ kwuru.

“Ọ bụrụ na ị bụ onye ji ịntanetị dịka (WhatsApp, Facebook na Telegram) ebipụta ozi, o kwesịrị ka ị mata ihe ozi ahụ na-ekwu, maka na a gaghị anabata na ị maghị ihe iwu kwuru.”

Ozi ahụ nke na-ewu ewu kwuru na onye ọbụla nke nyopuru ekwentị onye ọzọ n’ụzọ n’ezighi ezi “ga-aga nga afọ ise”.

A screenshot of the viral post

Ọtụtụ ndị na X jiri ihe ngosi Akpabio bipụta nya bụ ozị.

Daddy Freeze, onye nta akụkụ Naijiria a mara ọfụma bipụtara ihe ngosị ozi ahụ na asafe Facebook ya ma kwuo sị “ezigbo ọrụ ị na-arụ onye omeiwu Akpabio, kee nkwucha n’ụdị ozi ị na ebiputa na soshal midia. Kedu ihe ụnụ chere maka iwu a?”

A screenshot of the post with Senate President Godswill Akpabio’s picture

Otu onye na X bụ @emmaikumeh bipụtara ozị ahụ ma dee n’okpuru ya sị ” dịka m hụrụ na WhatsApp”. Ozi ahụ nke e bipụtara n’ụbọchị iri n’atọ nke ọnwa August enwetala ihe karịrị nkesa narị abụọ (200 reposts), nkesa nwere ntụnye uche iri atọ (30 quotes), na nkwenye narị anọ (400 likes).

E chekwara ugodu ozi ahụ ebe a, n’ebe a.

ŃNYÒCHÁ

Ọchịchọ CableCheck mere gosịrị na Naijiria enweghị “iwu megidere mpụ e ji ịntanetị eme nke afọ 2025”. Ihe obodo ahụ nwere bụ “iwu nke edozighariri nke megidere mpụ eji intanetị eme nke afọ 2024”.

Onye isiala Bola Tinubu bianyere aka n’iwu ahụ n’ụbọchị iri abụọ n’asatọ nke afọ 2024. E mepụtara iwu nke afọ 2024 iji dozie ụfọdụ akụkụ iwu ahụ nke afọ 2015.

CableCheck chọpụtara na ozi ahụ bidoro iwu na mbido ọnwa August — oge ndị omeiwu Naijiria gara ezumike.

N’ụbọchị iri abụọ n’atọ, ụlọ omeiwu senate gara ezumike nke afọ a, ebe a tụrụ anya na ha ga-ebido ọrụ n’ụbọchị iri abụọ n’atọ nke ọnwa Septemba.

Ụlọ omeiwu nke dị àlà gakwara ezumike nke afọ a n’ụbọchị iri abụọ n’asaa nke ọnwa July(July 27). Iwu ahụ apụghị ịbụ iwu ma ọ bụrụ na ụlọ omeiwu abụọ nke Naijiria nọ n’ezumike.

Ihe ndị anyị hutara mejupụtara nya bụ iwu abụghị ihe ndị dị n’iwu nke afọ 2024.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozi nke na-ekwu na ụlọ omeiwu Naijiria emeputala iwu megidere mpụ e ji ịntanetị eme nke afọ 2025 bụ asị.

TAGGED: Cybercrimes act 2024, fact check in Igbo, misinformation, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 30, 2025 August 30, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Bidiyon AI-gyara na Peter Obi ya amfani yana tallata dandalin saka hannun jari

Bidiyon da ke nuna Peter Obi, dan takarar shugaban kasa na jam'iyyar kwadago (LP) a…

September 24, 2025

Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó

Ị́hé ngosi ebe Peter Obi, onye jiri Labour Party zọ ọkwa onye ịsị ala na…

September 24, 2025

Dem use AI video of Peter Obi take advertise investment platform

One video wey show as Peter Obi, presidential candidate of di Labour Party (LP) for…

September 24, 2025

AI ni wọ́n fi yí fídíò Peter Obi padà láti polówó ibi ìdókòwò kan

Fídíò kan tí ó ní Peter Obi, olùdíje fún ipò Ààrẹ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà nínú…

September 24, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Bidiyon AI-gyara na Peter Obi ya amfani yana tallata dandalin saka hannun jari

Bidiyon da ke nuna Peter Obi, dan takarar shugaban kasa na jam'iyyar kwadago (LP) a zaben 2023, yana tallata wani…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó

Ị́hé ngosi ebe Peter Obi, onye jiri Labour Party zọ ọkwa onye ịsị ala na 2023, na-ágwá ndị mmadụ ka…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

Dem use AI video of Peter Obi take advertise investment platform

One video wey show as Peter Obi, presidential candidate of di Labour Party (LP) for di 2023 elections, dey allegedly…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

AI ni wọ́n fi yí fídíò Peter Obi padà láti polówó ibi ìdókòwò kan

Fídíò kan tí ó ní Peter Obi, olùdíje fún ipò Ààrẹ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà nínú ẹgbẹ́ òsèlú Labour Party (LP)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?