TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Onyonyo zikọrọ ìgwé mmadụ ebe ha na-akparị gọvanọ Kwara bụ nke 2018 
Share
Latest News
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Evidence no dey sey Davido and Chioma dey expect dia third pikin
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Onyonyo zikọrọ ìgwé mmadụ ebe ha na-akparị gọvanọ Kwara bụ nke 2018 

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published August 17, 2022 3 Min Read
Share

[tps_footer][/tps_footer]

Onyonyo nke zikọrọ Abdulrahman Abdulrazaq, gọvanọ Kwara steeti, ébé ìgwé mmadụ na-akpari ya pụtara ọzọ na mgbasa ozi ọha.

A nụrụ ka ìgwé mmadụ na-akpọ nya bụ gọvanọ onye ohi n’asụsụ Yoruba.

Ndị na-eke onyonyo a sị̀ nà nke a mere nso nso, oge gọvanọ na ụfọdụ ndị òtù All Progressive Congress (APC) gàrà na polytechnic nke dị na Kwara steeti màkà ḿgbákọ̀, nke ndị bekee na-akpo rally.

Ha kèrè akụkọ a na akaụntụ Facebook ndị na-ákwàdó Peter Obi ụbọchị Monde.

Ndị lere ya ruru puku abụọ na narị isii.

Ibe ọzọ nke aha ya bụ Nigeria Youth Movement kèrè onyonyo ọzọ nke ndepụta isiokwu ya bụ: “Kwara Steeti gọvanọ, onye ndị hapụrụ APC ịga PDP chụrụ ọsọ. Ha na-abụ abụ, na-akpọ aha ya Sai Buky Bukola Saraki.”

Ndị lere onyonyo a kemgbe ọ pụtara n’ụbọchị Tuzdee ruru otu puku na narị abụọ.

Anyị wepu Facebook, onyonyo a pụtakwara na YouTube, WhatsApp na TikTok.

Onwere ibe dị na YouTube aha ya bụ E-vibez TV. Ha kere onyonyo a ụbọchị Monde, sị na Abdulrahman na-eme kampeenu màkà ntụlị aka ọzọ n’afọ 2023. E lere onyonyo a na ibe a ugboro puku asaa na narị itoolu.

Nchọpụta

The Cable ji ngwá ọrụ a na-akpọ InVID wee nyochaa onyonyo a. Anyị chọpụtara na ebe mbụ etinyere nya bụ onyonyo bụ na YouTube n’afọ 2018.

E buru ụzọ tinye onyonyo a na ibe YouTube na-aza Kwara Gist ụbọchị iri abụọ na ise n’ọnwa Desemba n’afọ 2018.

Ọ nwere nkọwa so ya wee bịa. Ọ gụrụ sị: “Ogbaaghara na-eme na Ilorin na ḿgbákọ̀ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke iri ise na asato nke ndi Ilorin Emirate Progressive Descendant Union (IEPDU) na-eme. Nke a bụ màkà ndị na-akwado onye bụbụ onyeisi oche sineti, Dr. Bukola Saraki, kwụsịrị omume ahụ”.

Ụbọchị ịtoolu n’ọnwa Ọgọstụ, Kwara steeti gọọmenti meghachiri omume gbasara onyonyo site na edemede ha dere na ibe Facebook.

Bashir Adigun, onye ndụmọdụ gọvanọ pụrụ iche, si na onyonyo a bụ nke ụbọchị iri abụo na isii n’ọnwa Desemba na afọ 2018, oge ndị omempụ na ndị na-ákwàdó Bukola Saraki gbasasiri mmemme ndị Ilorin Emirate Descendants Progressive Union (IEDPU) haziri.

Adigun sị na esere onyonyo a mgbe gọvanọ bụ̀ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, wéé gaa mmemme nke ọ bụ onye ọbịa pụrụ iche na obodo ya.

Ọ sị na mmemme ahụ mere na Kwara Polytechnic ụbọchị asaa n’ọnwa Ọgọstụ na afọ 2022, ime ka gọvanọ nọrọ ebe ahụ.

“Ndị gbasara onyonyo a na-achosi ike ka ha ziko na a na-akọ gọvanọ ọnụ,” ihe a ka o kwuru.

Ikpe

Onyonyo nke na-egosị igwe mmadụ ka ha na-akpari gọvanọ Kwara steeti na-eduhie eduhie. Esere ihe nkiri ochie a n’afọ 2018. Ọbughị onyonyo esere nso nso a.

TAGGED: Abdulrahman Abdulrasaq, Bashir Adigun, bukola saraki, Ilorin, Kwara State

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora August 17, 2022 August 17, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?