TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ónyé ísíàlà ọ́hụ́rụ Senegal ọ̀ kọ́tọ̀rọ̀ France n’ímé íhé ńkírí na-ewù èwù
Share
Latest News
FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated
MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ónyé ísíàlà ọ́hụ́rụ Senegal ọ̀ kọ́tọ̀rọ̀ France n’ímé íhé ńkírí na-ewù èwù

Ousmane Sonko and Senegal’s president-elect are members of the same political party

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published April 5, 2024 5 Min Read
Share

Ọ bụrụ na ị na-eso ihe na-eme na soshal midia nke ọma n’izu ụka abụọ gara-aga, o nwere ike bụrụ na ị kiriela ihe ngosị ebe Bassirou Diomaye Faye nke mba Senegal na-akọtọ obodo France.

Ihe ngosị a, nke gazugoro ebe niile na soshal midia nke Naijiria n’ufọdụ obodo na Afrika, bụ nke ekesara na TikTok, X (nke a maburu dịka Twitter), Facebook, LinkedIn, na WhatsApp.

“Oge eruola mgbe France ga-akwụsị imekpa obodo anyị ahụ. Ọtụtụ afọ ịchị n’ike na mmekpa ahụ ebutela óké afụfụ nye obodo anyị. Oge eruola ịkwụsị mmekpa ahụ dị ótú a,” onye a kwụrụ n’ihe ngosị ahụ.

Ọtụtụ ndị kesara nya bụ ihe ngosị na-aṅụrị na Faye, onye nọ n’ụzọ ịbụ onye ntorobịa mbụ kacha nta ịbụ onye isi àlà na Afrịka, kwụ chịm n’okwu ya ebe France nọ.

Ótù onye ji X ezisa ozi bụ @von_Bismack, onye nke nwere ndị nsonye karịrị otu puku (100,000), biputara ihe ngosị a n’ehihie ụbọchị Tuesday. Kámgbè e biputara nya bụ ozi, ihe ngosị ahụ enwetala narị ise (500), nkesa narị atọ na iri atọ n’atọ (333), ntụnye ọnụ iri atọ n’abụọ ya na nkiri karịrị puku iri abụọ (20,000). Pịa aka ebe a ka ị fụ ya.

“Oge eruola mgbe France ga-ahapụ Afrịka áká… …Maazi Bassirou Diomaye Faye onye bụ onye isiala ọhụrụ Senegal họpụtara. Nke a gosịrị ịda mba nke mmekpa ahụ France n’ebe Afrịka nọ,” onye a na X dere n’okpuru ihe ngosị a.

Na Facebook, O’Kay Kanayo bipụtara ihe ngosị a, ma dee sị “Afrịka etetala n’ụra, ka Chineke chekwaa onye isiala ọhụrụ mba Senegal. Ọzọ ga-abụ Nigeria n’afọ 2027. Agaghị enwezi ọchịchị ndị nrụrụ aka. Oge eruola mgbe anyị ga-esonye n’ime obodo ndị ji akụ n’ụba edu ụwa niile.”

Na Whatsapp, nya bụ ihe nkiri bụ nke ekesagoro ọtụtụ mgbe, nke mere ejiri dọọ ndị mmadụ aka na ntị na “ekesaala ya ọtụtụ mgbe”.

ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ À

TheCable jiri ńgwá ọrụ Reverse Image Search nyochaa akụkụ niile dị na ihe ngosị ahụ, ma chọpụta na ọ bụ nke si n’okwu Ousmane Sonko, onye nọ n’isi ịma ọchịchị Senegal aka n’ótù nzukọ nya na ndị nta akụkọ nwere n’afọ 2021 na Dakar, Senegal.

Sonko kwuru na asụsụ French, n’abụghị na n’asụsụ bekee dịka ihe nkiri ahụ gosịrị.

N’ọgbakọ ahụ, nya bụ́ onye ndu ndị na-ama ọchịchị Senegal aka kwuru okwu imegide mkpebi Senegal ịnabata iwu ịnuso ndị ji egbe egbu ndị ọzọ n’obodo ha.

Ọ kọtọkwara France n’ihe ọ kpọrọ “ekweghị ka obodo há chịburu nwere onwe ha nke ọma”.

Ọgbakọ a bụ nke e kiriri ka ọ na-eme, ma bipụta ya n’asafe YouTube Senegal 7, ọba ozị mba Senegal nke bụ obodo na-asụ French. N’ime otu áwà Sonko kwuru n’ogbako ahụ, ọsuru n’asụsụ French.

O bịpụtakwara nya bụ okwu ya na n’asafe X nke edekwara na French.

Thecable chọpụtara na ejiri teknuzu wogharịa ólú Sonko ka ọ dịka ò kwuru n’asụsụ bekee.

Ịgbakwunye, anyị chọpụtara na ihe ngosị a na-ewu ewu, nke onye isiala ọhụrụ Senegal nọ na ya, bụ nke ebipụtagoro kámgbè afọ 2023 na YouTube.

1

ÒNWÈRÈ ÍHÉ JÍKỌ́TÁRÁ SANKO NÀ FAYE?

Sanko bụ onye ǹdú òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Patriots of Senegal (PASTEF), òtù kwadoro Faye na ntuliaka onye isiala e mere.

Ọtụtụ ndị nnyocha ndọrọ-ndọrọ ọchịchị na-ekwu na ọ bụ Sanko zụpụtara Faye. Ụmụ nwoke abụọ a bụ ndị akpọchiri na nga ka a na-akwado maka ntuliaka, ma e mechara hapụ ha n’izu ụka ole n’ole tupu e me nya bụ ntuliaka.

Ụlọikpe okpechaa ọ̀gwụ́ mabidoro Sanko ịzọ ọ́kwá onye isiala, nke mere ka PASTEF họpụta Faye dịka onye ji otu ha azọ ọkwa onye isiala.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Onye nọ n’ihe nkiri ahụ na-akọtọ France abụghị Faye, onye isiala ọhụrụ ndị Senegal. Kama, ọ bụ Sanko, onye ndu òtù PASTEF.

Ihe ngosị ahụ akụgharịrị bụ nke si n’ọgbakọ Sanko na ndị nta akụkọ nwere n’afọ 2021.

  1. ↩︎
TAGGED: Bassirou Faye, France, Senegal

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu April 8, 2024 April 5, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated

A video showing a bridge collapse incident is circulating across social media platforms, especially on…

July 24, 2025

MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army

The Nigerian Army says a viral video claiming the arrest of a foreign arms dealer…

July 24, 2025

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?