TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ókwú nà Kaduna ádọtàbèghị̀ àkụ̀ ḿbà òfèsí kámgbè el-Rufai pụ̀rụ̀ n’ọ̀chị́chị́ bụ̀ àsị́
Share
Latest News
Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya
No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party
Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀
A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro
Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI
AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa
Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á
Bidiyon da ke nuna ‘gada ta rushe a Nasarawa’ AI ce ta samar
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ókwú nà Kaduna ádọtàbèghị̀ àkụ̀ ḿbà òfèsí kámgbè el-Rufai pụ̀rụ̀ n’ọ̀chị́chị́ bụ̀ àsị́

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published March 6, 2025 3 Min Read
Share

Ótù onye na X bụ @xagreat kwuru na Kaduna steeti adọtabeghị akụ mba ofesi, nke bekee na-akpọ foreign direct investment (FDI), kamgbe Nasir el-Rufai, onye bụburu gọvanọ steeti ahụ, pụrụ n’ọchịchị.

Onye a kwuru na a ga-ewepu Uba Sani, gọvanọ steeti ahụ, n’ọchịchị na ntụli aka a ga-eme n’afọ 2027.

“Kamgbe el-Rufai pụrụ n’ọchịchị, Kaduna enwetabeghị ntinye ego si mba ọzọ bụ foreign direct investment. Nke a bụ ihe a na-akpọ obodo ịnaghachi azụ,” ozi ahụ kwuru.

“Anyị ga-achụpu Ụba Sani n’afọ 2027, iji zọpụta Kaduna n’ịda mbà.”

Ozi a enwetala nkiri karịrị puku iri na anọ (14,000 views), nkwenye narị abụọ n’iri atọ n’abụọ (232 likes), na nkesa iri asaa n’asatọ (78 reposts), dịka n’ụbọchị anọ nke ọnwa March.

GỊ́NỊ KÀ FDI JÌRÌ DỊ́ ḾKPÀ?

FDI bụ ntinye ego sitere n’aka otu onye bànyé azụmahịa n’obodo ọzọ, nke ebumn’uche yá bụ̀ írite úrù n’ogologo oge.

Ọ bụ ísí n’ime ọtụtụ ihe na-akwalite akụ n’ụba obodo, site na ịkepụta ọrụ, ịmụba azụmahịa, ịkwalite ego obodo na-anata n’ụtụ tax, nkwalite obodo, ya na mmụba nchekwa akụ obodo ọbụla.

Na mgbakwunye, FDI na-akwalite akụnụba obodo ọbụla n’anya mba ndị ọzọ, n’ihi na ọbọdo ọbụla n’enweghị ntínyé ego sí mba ọzọ ka a na-ahuta dịka ndị n’etozughị oké ka ndị azụmahịa tinye ego ha.

ŃNYÒCHÁ

Sani batara n’ọchịchị dịka gọ́vánọ̀ n’ụbọchị iri abụọ n’itoolu nke ọnwa May nke afọ 2023.

Cable Check nyochara isi ego si mba ọzọ steeti ahụ webatara na webusite National Bureau of Statistics (NBS), site n’ọnwa June ruo August nke afọ 2023, ruo ọnwa atọ ikpeazụ nke afọ ahụ.

Ozi ahụ gosịrị na Kaduna enwetaghị ntinye ego si mba ọzọ site n’ọnwa June ruo August nke afọ 2023, ya na n’ọnwa April ruo June nke afọ 2024.

N’ozi ikpeazụ nke nwebata ego nke sitere na mba ọzọ NBS bipụtara, Kaduna nwetara otu nde dollar n’ụma puku iri itoolu n’ise ($1.95 million) n’ọnwa Julaị ruo September nke afọ 2024.

NBS sị na Kaduna sò otu n’ime steeti ise ndị nwere nwebata ego si mba ọzọ site n’ọnwa Julaị ruo September nke afọ ahụ, nke nwere otu nde dollar n’ụma pụku iri itoolu n’ise ($1.95 million), nke bụ ụma pasentị iri n’isii (0.16%) n’ime ego niile si mba ọzọ Naijiria nwetara na ntinye ego n’ọnwa ahụ.

ḾKPÉBÌ

Okwu na Kaduna enwetabeghị ntinye ego si mba ọzọ kámgbè el-Rufai pụrụ n’ọchịchị bụ asị.

TAGGED: Factcheck in igbo, FDI, Kaduna, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu March 6, 2025 March 6, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna…

August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and…

August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi…

August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru,…

August 1, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna iri abụọ n'ise (25 commissioners)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and oda appointees becos dem no…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi dá àwọn kọmisọnna marundinlọgbọn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru, gwamnan Ebonyi, ya dakatar da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?