TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Share
Latest News
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 22, 2025 6 Min Read
Share

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ ndị Naijiria n’ihi na ọ bụ nwanyị.

Badenoch kwuru nke a n’ụbọchị Sunday na ajụjụ ọnụ nke ya na onye nta akụkọ Fareed Zakaria nke CNN nwere, n’ụzọ igosị ndị iche dị na iwu ndị ọbịa n’obodo Naijiria na nke Britain.

Ịkọwa okwu ya ọfụma, Badenoch kwụrụ na ọ dirị ndị Naijiria mfe ịnweta ikike ịbụ ndị Britain, karịa ka ọ dịrị ndị obodo ọzọ ịnweta ikike ịbụ ndị Naijiria.

“Ọ dịghị mfe, ịma atụ, ịnweta ikike ịbụ onye Naijiria. E nwere m nya bu ikike n’ihe nne na nna m bụ ndị obodo ahụ, mana a gaghị eyefeli ya ụmụ m n’ihi na a bụ m nwaanyị,” Badenoch kwuru.

“Mana, ọtụtụ ndị Naijiria na-abia UK ma nọ ọtụtụ oge iji nweta ikike ịbụ ndị Britain. Anyị kwesịrị ịkwụsị nzuzu a.”

Okwu Badenoch kpalitere ọtụtụ ntụnye ọnụ ndị Naijiria, ebe ụfọdụ na-arụ ya aba na okwu ya bụ asị.

Badenoch onye amaburu dịka Olukemi Adegoke bụ onye a mụrụ na UK n’ezi n’ụlọ onye Yoruba, nna ya mechara kpọlata ya Naijiria ebe ọnoro tọọ tupu ọ ruo afọ iri n’isi (16 years).

Tupu ọ laghachi UK, ọ gara akwụkwọ ógó nta n’ụlọ akwụkwọ gọọmenti n’enweghị dị na Lagos, Naijiria. Amayeghị ya oge ahụ ịgosi akwụkwọ visa agụmakwụkwọ ya.

Visa agụmakwụkwọ nke a na-akpọ (R7A), bụ ndị a na-enye ụmụ akwụkwọ si mba ọzọ na-agụ na Naijiria. Ụmụ akwụkwọ bụ ndị ala Naijiria esoghị na ndị a na-enye nya bụ Visa.

Badenoch mechara lụọ Hamish Badenoch, onye mba Scotland na-arụ n’oba ego, ma bidozie ịzaa aha dị ya.

Ha nwere ụmụ atọ.

ŃNYÒCHÁ

CableCheck nyochara okwụ Badenoch site na akwụkwọ iwu ala Naijiria.

Dịka nkebi iri abụọ n’ise {25(1)(c)} nke akwụkwọ iwu ala Naịjirịa nke afo 1999 kwuru, onye ọbụla a mụrụ n’obodo ọzọ bụ onye Naijiria, ma ọ bụrụ na nne maọbụ nna ya bụ onye Naijiria.

Nke a pụtara na site n’inwe naanị nne maọbụ nna bụ onye Naijiria zuru inye nwa gi ikike ịbụ onye Naijiria. Site n’okwu Badenoch, ụmụ ya bụ ndi Naijiria.

Abia na Naijiria, ịbụ onye obodo ahụ site na ọmụmụ gị na ya bụ obodo pụtara na nne onye ahụ maọbụ nna ya bụ onye Naijiria, n’abughi naanị na amuru onye ahụ na Naijiria.

Ọnọdụ ahụ na-enye onye dị otú a ikike ịbụ onye Naijiria, nke gụnyere ịbata nya bụ obodo mgbe onye ahụ chọrọ ya na ịnweta nchekwa ọbụla ndi obodo ahụ na-erita.

Ịwụ Naijiria na-ákwàdó mmadụ ịbụ onye obodo abụọ, mana enwere ụfọdụ ọnọdụ nke o ji apụta ihe.

Nkebi iri abụọ n’asatọ nke iwu Naijiria {Section 28(1)} kwụrụ na nwafo Naijiria ọbụla nwere ike ịbụ onye obodo ọzọ na-atufughị ikike ịbụ onye Naijiria.

K’osiladị, onye obodo ọzọ nwetere ikike ịbụ onye Naijiria site n’ilu nwoke Naijiria maọbụ ịbị ogologo oge na Naijiria ga atufu ikike ịbụ onye Naijiria ma ọchọ ịbụ onye obodo ọzọ.

Na mgbakwunye, iwu amabidoghi umu onye amuru na Naijiria inweta ikike ịbụ onye obodo ahu n’ihi n’ọbụ nwaanyị.

Na onye ahụ ọbụ nwaanyị agahizi apụta ihe ebe dị otú a ma ọbụrụ na onye ahụ bụ onye obodo ọzọ.

Nkebi iri abụọ n’isi nke iwu Naijiria {section 26(2)(a)} kwụrụ na nwaanyị ọbụla nke lụrụ nwoke onye Naijiria ga abụzi onye Naijiria.

Ụmụ nwoke si mba ọzọ ndị lụrụ nwaanyị Naijiria apụghị inweta ịkịke ịbụ onye Naijiria. Ha ga-achọzi inweta ịkịke a site n’ezi omume ha na afọ ole ha biri na Naijiria.

Ya mere ọgaghị adịrị dị Badenoch mfe inweta ịkịke ịbụ onye Naijiria.
Mana nke e metutaghị ụmụ ha ndị nwere nne nakwa nna nnukwu ndị bu ndi Naijiria.

ASHLEIGH PLUMPTRE: Ọ́NỌ̀DỤ̀ ÍNWÉ ŃNÉ SÍ Ọ́BỌ́DỌ́ Ọ́ZỌ́ NÀ ŃNÀ BỤ̀ ÓNYÉ NAIJIRIA

Ashleigh Plumptre bụ onye na-akụrụ Naijiria bọọlụ dị afọ iri abụọ n’asaa (27 years).

Plumptre na-akụrụ Al-Ittihad, otu bọọlụ dị na Saudi Arabia, na Super Falcons, otu bọọlụ ụmụ nwaanyị Naijiria.

Nna ya bụ Tim Plumptre, bụ onye Naijiria, ebe nne ya bụ onye England.

N’ihu asọmpi nke ụmụnwayi nke afọ 2022 bu Women’s Africa Cup of Nations (WAFCON), Plumptre kpebiri ị kụrụ Naijiria bọọlụ.

N’ajụjụ ọnụ o nwere n’ọnwa a, Tim kwụrụ na ọ zụlitere nwa ya nwaanyị n’usoro ịhụ ebe o si n’anya, site na-ịkpọgara ya nnaya ochịe bụ Harry Dotun Plumptre, nakwa ọtụtụ ụmụnna ndị Naijiria.

Plumptre so ná ụmụ nwaanyị iri abụọ n’anọ (24 players) ndị na-akuru Naijiria bọọlụ na asọmkpi WAFCON nke afọ a.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu Badenoch na ọ gaghị enyefeli ụmụ ya ikike ịbụ ndị Naijiria n’ihi na ọ bụ nwaanyị bụ asị. Nke a nwereike bụ eziokwu ma ọbụrụ na onweghizi ikike ịbụ onye Naijiria n’onwe ya.

TAGGED: Factcheck in igbo, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 22, 2025 July 22, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative…

July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za…

July 22, 2025

FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false

Kemi Badenoch, leader of the United Kingdom’s Conservative Party, has claimed that she cannot pass…

July 21, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?

Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n'ịkwụsị nkwekọrịta azụmahịa akụ ọnatarachi dị…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?