Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ ndị Naijiria n’ihi na ọ bụ nwanyị.
Badenoch kwuru nke a n’ụbọchị Sunday na ajụjụ ọnụ nke ya na onye nta akụkọ Fareed Zakaria nke CNN nwere, n’ụzọ igosị ndị iche dị na iwu ndị ọbịa n’obodo Naijiria na nke Britain.
Ịkọwa okwu ya ọfụma, Badenoch kwụrụ na ọ dirị ndị Naijiria mfe ịnweta ikike ịbụ ndị Britain, karịa ka ọ dịrị ndị obodo ọzọ ịnweta ikike ịbụ ndị Naijiria.
“Ọ dịghị mfe, ịma atụ, ịnweta ikike ịbụ onye Naijiria. E nwere m nya bu ikike n’ihe nne na nna m bụ ndị obodo ahụ, mana a gaghị eyefeli ya ụmụ m n’ihi na a bụ m nwaanyị,” Badenoch kwuru.
“Mana, ọtụtụ ndị Naijiria na-abia UK ma nọ ọtụtụ oge iji nweta ikike ịbụ ndị Britain. Anyị kwesịrị ịkwụsị nzuzu a.”
Okwu Badenoch kpalitere ọtụtụ ntụnye ọnụ ndị Naijiria, ebe ụfọdụ na-arụ ya aba na okwu ya bụ asị.
Badenoch onye amaburu dịka Olukemi Adegoke bụ onye a mụrụ na UK n’ezi n’ụlọ onye Yoruba, nna ya mechara kpọlata ya Naijiria ebe ọnoro tọọ tupu ọ ruo afọ iri n’isi (16 years).
Tupu ọ laghachi UK, ọ gara akwụkwọ ógó nta n’ụlọ akwụkwọ gọọmenti n’enweghị dị na Lagos, Naijiria. Amayeghị ya oge ahụ ịgosi akwụkwọ visa agụmakwụkwọ ya.
Visa agụmakwụkwọ nke a na-akpọ (R7A), bụ ndị a na-enye ụmụ akwụkwọ si mba ọzọ na-agụ na Naijiria. Ụmụ akwụkwọ bụ ndị ala Naijiria esoghị na ndị a na-enye nya bụ Visa.
Badenoch mechara lụọ Hamish Badenoch, onye mba Scotland na-arụ n’oba ego, ma bidozie ịzaa aha dị ya.
Ha nwere ụmụ atọ.
ŃNYÒCHÁ
CableCheck nyochara okwụ Badenoch site na akwụkwọ iwu ala Naijiria.
Dịka nkebi iri abụọ n’ise {25(1)(c)} nke akwụkwọ iwu ala Naịjirịa nke afo 1999 kwuru, onye ọbụla a mụrụ n’obodo ọzọ bụ onye Naijiria, ma ọ bụrụ na nne maọbụ nna ya bụ onye Naijiria.
Nke a pụtara na site n’inwe naanị nne maọbụ nna bụ onye Naijiria zuru inye nwa gi ikike ịbụ onye Naijiria. Site n’okwu Badenoch, ụmụ ya bụ ndi Naijiria.
Abia na Naijiria, ịbụ onye obodo ahụ site na ọmụmụ gị na ya bụ obodo pụtara na nne onye ahụ maọbụ nna ya bụ onye Naijiria, n’abughi naanị na amuru onye ahụ na Naijiria.
Ọnọdụ ahụ na-enye onye dị otú a ikike ịbụ onye Naijiria, nke gụnyere ịbata nya bụ obodo mgbe onye ahụ chọrọ ya na ịnweta nchekwa ọbụla ndi obodo ahụ na-erita.
Ịwụ Naijiria na-ákwàdó mmadụ ịbụ onye obodo abụọ, mana enwere ụfọdụ ọnọdụ nke o ji apụta ihe.
Nkebi iri abụọ n’asatọ nke iwu Naijiria {Section 28(1)} kwụrụ na nwafo Naijiria ọbụla nwere ike ịbụ onye obodo ọzọ na-atufughị ikike ịbụ onye Naijiria.
K’osiladị, onye obodo ọzọ nwetere ikike ịbụ onye Naijiria site n’ilu nwoke Naijiria maọbụ ịbị ogologo oge na Naijiria ga atufu ikike ịbụ onye Naijiria ma ọchọ ịbụ onye obodo ọzọ.
Na mgbakwunye, iwu amabidoghi umu onye amuru na Naijiria inweta ikike ịbụ onye obodo ahu n’ihi n’ọbụ nwaanyị.
Na onye ahụ ọbụ nwaanyị agahizi apụta ihe ebe dị otú a ma ọbụrụ na onye ahụ bụ onye obodo ọzọ.
Nkebi iri abụọ n’isi nke iwu Naijiria {section 26(2)(a)} kwụrụ na nwaanyị ọbụla nke lụrụ nwoke onye Naijiria ga abụzi onye Naijiria.
Ụmụ nwoke si mba ọzọ ndị lụrụ nwaanyị Naijiria apụghị inweta ịkịke ịbụ onye Naijiria. Ha ga-achọzi inweta ịkịke a site n’ezi omume ha na afọ ole ha biri na Naijiria.
Ya mere ọgaghị adịrị dị Badenoch mfe inweta ịkịke ịbụ onye Naijiria.
Mana nke e metutaghị ụmụ ha ndị nwere nne nakwa nna nnukwu ndị bu ndi Naijiria.
ASHLEIGH PLUMPTRE: Ọ́NỌ̀DỤ̀ ÍNWÉ ŃNÉ SÍ Ọ́BỌ́DỌ́ Ọ́ZỌ́ NÀ ŃNÀ BỤ̀ ÓNYÉ NAIJIRIA
Ashleigh Plumptre bụ onye na-akụrụ Naijiria bọọlụ dị afọ iri abụọ n’asaa (27 years).
Plumptre na-akụrụ Al-Ittihad, otu bọọlụ dị na Saudi Arabia, na Super Falcons, otu bọọlụ ụmụ nwaanyị Naijiria.
Nna ya bụ Tim Plumptre, bụ onye Naijiria, ebe nne ya bụ onye England.
N’ihu asọmpi nke ụmụnwayi nke afọ 2022 bu Women’s Africa Cup of Nations (WAFCON), Plumptre kpebiri ị kụrụ Naijiria bọọlụ.
N’ajụjụ ọnụ o nwere n’ọnwa a, Tim kwụrụ na ọ zụlitere nwa ya nwaanyị n’usoro ịhụ ebe o si n’anya, site na-ịkpọgara ya nnaya ochịe bụ Harry Dotun Plumptre, nakwa ọtụtụ ụmụnna ndị Naijiria.
Plumptre so ná ụmụ nwaanyị iri abụọ n’anọ (24 players) ndị na-akuru Naijiria bọọlụ na asọmkpi WAFCON nke afọ a.
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Okwu Badenoch na ọ gaghị enyefeli ụmụ ya ikike ịbụ ndị Naijiria n’ihi na ọ bụ nwaanyị bụ asị. Nke a nwereike bụ eziokwu ma ọbụrụ na onweghizi ikike ịbụ onye Naijiria n’onwe ya.