TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ọ́kọ̀lọ̀tọ̀ nọ́ n’àzụ́ Tinubu m̀gbè ọ́ nà-àgụ́pụ̀tá ózí ya ábụghị ǹkè Russia
Share
Latest News
FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020
FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀
Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok
Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC
È nwélá ọ́nwụ́ ńdị́ ụ́kà nà Naijiria n’áfọ̀ 2025 kárị́á ọ́nụ́ ọ́gụ́gụ́ ndị́ Palestinian é gbụ́rụ́ na Gaza?
Na true sey dem kill Christians for Nigeria dis year pass Palestinians for Gaza?
Ǹjẹ́ àwọn ẹlẹ́sìn ìgbàgbọ́ tí wọ́n pa ní Nàìjíríà ju àwọn ọmọ Palestine tí wọ́n pa ní Gaza lọ ní 2025?
Yi Kiristoci da aka kashe a Nijeriya a 2025 sunfi na faltunawan dake Gaza?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ọ́kọ̀lọ̀tọ̀ nọ́ n’àzụ́ Tinubu m̀gbè ọ́ nà-àgụ́pụ̀tá ózí ya ábụghị ǹkè Russia

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 12, 2024 2 Min Read
Share

Ọtụtụ ozi na soshal mịdia ekwuola na ọkọlọtọ dị n’azụ onyeisi ala Bola Tinubu m̀gbè ọ na-agụpụta ozi n’ụbọchị Sunday bụ nke obodo Russia.

N’ozi ọ gụpụtara n’igwe onyonyo, Tinubu gwara ndị Naijiria ka ha kwụsị ngagharị iwe nke “End Bad Governance” ma nye ohere maka mkpakọrịta.

Tinubu kwuru na ndị ji ohere áhụ̀ eme ọgbaghara ga-enweta ezigbo ntaramahụhụ, ma gbakwunye na ọchịchị ya agaghị anabata okwu mmegide ọbụla nye agbụrụ ọbụla.

Nya bụ onyeisi ala kwuru ogologo okwu gbasara ihe ndị ọchịchị ya mepụtara. Ọ gbachitere iwu ndị ọ mere, ma kwuo na mkpebi ndị o nyere dị mkpa nye ọnọdụ akụ n’ụba Naijiria.

A hụtara nya bụ onyeisiala n’etiti ọkọlọtọ abụọ, ótù bụ nke Naijiria. Nke abụọ dị iche.

“Gịnị mere e jiri nwe ọkọlọtọ ọzọ n’akụkụ nke Naijiria? Tinubu ọ nọ na Russia, ka ọ bụ gịnị?” ótù onye na X dere.

Ụfọdụ ntụnye n’okpuru ozi a kwuru na ọ bụ nke obodo Russia, ebe ọtụtụ kwuputara ụjọ ha.

Nke a na-abịa dịka a hụtara ka ụfọdụ ji ọkọlọtọ ndị Russia, dịka ha na-eme ngagharị iwe.

A hụtara ka ụfọdụ nà-èfé ọkọlọtọ Russia na Kano, Jos, na Abuja n’ụbọchị Thursday.

Ndị ngagharị iwe ahụ kpọkuru Vladimir Putin, onyeisi ala Russia, ka ọ gbatara Naijiria ọsọ enyemaka. Ha bóró Tinubu ebubo na ọ na-emenyere obodo ndị ọcha.

KÈDÚ Ọ́KỌ̀LỌ̀TỌ̀ NỌ̀ N’ÁKỤ̀KỤ̀ TINUBU?

Ọkọlọtọ nọ n’akụkụ nke Naijiria nwere àgwà atọ — ọbara-ọbara, anụnụ-anụnụ, ọcha, ya na akwụkwọ ndụ. Ndị a bụ àgwà e ji mara onyeisiala Naijiria.

Àgwà anọ ndị ahụ bụ nke ndị agha Naijiria. Ọ na-egosị na Tinubu bụ onye isi ndị agha, ma bụrụkwa onye isi ala Naijiria.

O kwesịghị ka ọ gbagwojuo gị anya nye ọkọlọtọ nke ndị Russia nke nwere àgwà atọ — ọcha, anụnụ-anụnụ, ya na ọbara-ọbara.

TAGGED: fact check in Igbo, nationwide protest, news in Igbo, protest, Tinubu

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 12, 2024 August 12, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020

Ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) akọwala n'ihe ngosi ebe onye ọ̀kwà ụgbọala ụkwụ atọ…

August 22, 2025

FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀

Àjọ tó ń rí sí ààbò àwọn awakọ̀, àwọn tí wọ́n ń rìn lójú ọ̀nà…

August 22, 2025

Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok

The Federal Road Safety Corps (FRSC) don describe one viral video wey show as keke…

August 22, 2025

Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC

Hukumar kiyaye hadurra ta kasa (FRSC) ta bayyana wani faifan bidiyo da ke nuna wani…

August 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020

Ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) akọwala n'ihe ngosi ebe onye ọ̀kwà ụgbọala ụkwụ atọ na ndị ọrụ ya na-enwe…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀

Àjọ tó ń rí sí ààbò àwọn awakọ̀, àwọn tí wọ́n ń rìn lójú ọ̀nà tí ọkọ̀ ń rìn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok

The Federal Road Safety Corps (FRSC) don describe one viral video wey show as keke rider dey open eye for…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC

Hukumar kiyaye hadurra ta kasa (FRSC) ta bayyana wani faifan bidiyo da ke nuna wani direban babur mai uku yana…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?