TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ọ́kọ̀lọ̀tọ̀ nọ́ n’àzụ́ Tinubu m̀gbè ọ́ nà-àgụ́pụ̀tá ózí ya ábụghị ǹkè Russia
Share
Latest News
Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya
No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party
Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀
A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro
Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI
AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa
Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á
Bidiyon da ke nuna ‘gada ta rushe a Nasarawa’ AI ce ta samar
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ọ́kọ̀lọ̀tọ̀ nọ́ n’àzụ́ Tinubu m̀gbè ọ́ nà-àgụ́pụ̀tá ózí ya ábụghị ǹkè Russia

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 12, 2024 2 Min Read
Share

Ọtụtụ ozi na soshal mịdia ekwuola na ọkọlọtọ dị n’azụ onyeisi ala Bola Tinubu m̀gbè ọ na-agụpụta ozi n’ụbọchị Sunday bụ nke obodo Russia.

N’ozi ọ gụpụtara n’igwe onyonyo, Tinubu gwara ndị Naijiria ka ha kwụsị ngagharị iwe nke “End Bad Governance” ma nye ohere maka mkpakọrịta.

Tinubu kwuru na ndị ji ohere áhụ̀ eme ọgbaghara ga-enweta ezigbo ntaramahụhụ, ma gbakwunye na ọchịchị ya agaghị anabata okwu mmegide ọbụla nye agbụrụ ọbụla.

Nya bụ onyeisi ala kwuru ogologo okwu gbasara ihe ndị ọchịchị ya mepụtara. Ọ gbachitere iwu ndị ọ mere, ma kwuo na mkpebi ndị o nyere dị mkpa nye ọnọdụ akụ n’ụba Naijiria.

A hụtara nya bụ onyeisiala n’etiti ọkọlọtọ abụọ, ótù bụ nke Naijiria. Nke abụọ dị iche.

“Gịnị mere e jiri nwe ọkọlọtọ ọzọ n’akụkụ nke Naijiria? Tinubu ọ nọ na Russia, ka ọ bụ gịnị?” ótù onye na X dere.

Ụfọdụ ntụnye n’okpuru ozi a kwuru na ọ bụ nke obodo Russia, ebe ọtụtụ kwuputara ụjọ ha.

Nke a na-abịa dịka a hụtara ka ụfọdụ ji ọkọlọtọ ndị Russia, dịka ha na-eme ngagharị iwe.

A hụtara ka ụfọdụ nà-èfé ọkọlọtọ Russia na Kano, Jos, na Abuja n’ụbọchị Thursday.

Ndị ngagharị iwe ahụ kpọkuru Vladimir Putin, onyeisi ala Russia, ka ọ gbatara Naijiria ọsọ enyemaka. Ha bóró Tinubu ebubo na ọ na-emenyere obodo ndị ọcha.

KÈDÚ Ọ́KỌ̀LỌ̀TỌ̀ NỌ̀ N’ÁKỤ̀KỤ̀ TINUBU?

Ọkọlọtọ nọ n’akụkụ nke Naijiria nwere àgwà atọ — ọbara-ọbara, anụnụ-anụnụ, ọcha, ya na akwụkwọ ndụ. Ndị a bụ àgwà e ji mara onyeisiala Naijiria.

Àgwà anọ ndị ahụ bụ nke ndị agha Naijiria. Ọ na-egosị na Tinubu bụ onye isi ndị agha, ma bụrụkwa onye isi ala Naijiria.

O kwesịghị ka ọ gbagwojuo gị anya nye ọkọlọtọ nke ndị Russia nke nwere àgwà atọ — ọcha, anụnụ-anụnụ, ya na ọbara-ọbara.

TAGGED: fact check in Igbo, nationwide protest, news in Igbo, protest, Tinubu

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 12, 2024 August 12, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna…

August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and…

August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi…

August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru,…

August 1, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna iri abụọ n'ise (25 commissioners)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and oda appointees becos dem no…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi dá àwọn kọmisọnna marundinlọgbọn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru, gwamnan Ebonyi, ya dakatar da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?