TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ọ́gwụ̀ m̀gbọ̀rọ̀gwụ̀ nà m̀kpákwụ́kwọ́ ọ̀ nà-àgwọ́ fibroid?
Share
Latest News
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?
FACT CHECK: Did Nigeria halt ‘mineral deal’ with US after visa restrictions?
FACT CHECK: Viral image depicting ‘Obasanjo prostrating for Ladoja’ photoshopped
Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra
Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ọ́gwụ̀ m̀gbọ̀rọ̀gwụ̀ nà m̀kpákwụ́kwọ́ ọ̀ nà-àgwọ́ fibroid?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 27, 2024 6 Min Read
Share

Ótù ozi na soshal mịdia ekwuola na ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpakwukwọ na-ewepucha fibriod n’ahụ nwaanyị.

Ozi a nke pụtara n’ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Julaị bụ nzaghachi nye ihe ngosị Ini Dima-Okojie, onye na-eme ihe ejije na Naijiria, bipụtara iji kwupụta na fibriod ya abịaghachiela ọzọ ka-awachara ya afọ, n’afọ 2020.

N’ihe ngọsi ahụ ebiputara na X, Dima-Okojie kwuru na ihe o ji e kwupụta maka ọnọdụ ya bụ ka ọgba ụmụ nwaanyị ndị ọzọ na-agabiga nya bụ nsogbu ume.

Onye ome ihe ejije a kwuru na ya anọghị na’ọsọ ịwa afọ ya ọzọ iwepu nya bụ fibroid, kama na ya chọrọ iji ụzọ ga-ewepucha fibriod ya were so nya bụ ọnọdụ.

Ire ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpakwukwo dịka naanị ụzọ esị agwọ fibriod, @HerbarlistChief, na X kwuru na usoro ịwa afọ abụghị ụzọ esị agwọ fibriod ka ọ lachaaa.

“Ọnweghị ụzọ ịwa afọ ga-agwọ fibroid ka ọ lachaa, kama ọ ga-abịaghachi ka ị wachara onye ahụ afọ. Naanị ọgwụ mgbọrọgwụ na-agwọcha fibroid,” onye a bipụtara na X.

Ozi a enwetala nkiri karịrị otu nde na pụku narị asaa (1,700,000 views), nkwenye puku isii na narị itoolu (6,900 likes), nchekwa ịgụ mgbe ọzọ puku abụọ na otu nari (2,100 bookmarks), nkesa otu puku na narị itoolu (1,900 retweets), na ntụnye ọnụ narị atọ (300 comments).

GỊ́NỊ BỤ̀ FIBROID?

Fibroid bụ ákpụ̀ n’enweghị kansa ọbụla nke na-eto n’akụkụ akpa nwa nwaanyị, ma n’esite na ụfọdụ akwara akpa nwa.

Onweghị onye ma ihe kpatara fibroid ji apụta, mana o na-eto site na ịnata homonu na-enyere nwanyị aka inwe mmekọ nwoke na nwaanyị, nke bekee na-akpọ estrogen.

Dịka nke a, anaghị ahụta fibroid oge ntolite nwanyị bụ puberty, na mgbe nwaanyi kwụsịrị ịhụ nsọ ya bụ menopause.

K’osiladi, fibroid na-egosị naanị na ihe ruru ọkara mmadụ ndị nwere nya bụ ọnọdụ.

Alex Ades, dọkịta na-ahụ maka ụmụ aka na ụmụ nwaanyị dị ime, onye nwere ńkwàdó ụlọrụ Health Insurance Commission nya na uloru Medical Board of Australia, kwuru na ótù n’ime ụmụ nwaanyị ise ga-ahụrịrị dọkịta maka ọnọdụ fibroid n’oge ndụ ha.

Fibroid a nwere ike ịkpata óké ịgba ọbara na nnukwu ụfụ site n’ọnọdụ ya maọbụ otu ọ ha n’afọ.

Onweghị otu o siri metụta ikike ịtụ ime, mana o nwere ike ịkpata ọnwụ nnwa n’afọ nwaanyị, nke bekee kpọrọ miscarriage.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ

Otu n’ime okwu pụtara na X gbasara ọgwụ ọdịnala na Fibroid kọwara na onweghị usoro ịwa afọ ọbụla ga-agwọ ọnọdụ fibroid.

Ozi a gbakwunyere na e mechaa nya bụ ịwa afọ, fibroid ahụ ga-abịaghachi ọzọ.

Fehintola Akintunde, onye dọkịta na-ahụ maka ụmụaka na ụmụ nwaanyị dị ịme n’ụlọ ogwụ Obafemi Awolowo University (OAU) Teaching Hospital, kọwara na e nwere ihe dị iche n’etiti “ọgwụgwọ ọrịa” na “ịbelata ọrịa”.

Dọkịta a kwuru na e nwere ike ibelata fibroid, mana nya bú ọrịa enweghị ọgwụgwọ ọbụla. Ọ sị na nke a bụ maka na ákpụ̀ tọrọ na’akụkụ akpa nwa nwaanyị nwere ike itoghachị ọzọ.

“Naanị ịwa afọ eji ewepu ákpụ̀, bụ myomectomy, ga-ewepụ nya bụ fibriod ma mee ka ngosị ya laa,” Akintunde gwara TheCable.

“Ọ nwere ike bụrụ na ihe ozi ndị ahụ na-ekwu bụ na o nwere ike ịbịaghachi. Ọ bụrụ na nwaanyị nwee fibroid, e nwere ọ́nyá anaghị ahụ anya ga-abịaghachi ọzọ n’áfọ̀ ise, isii, asaa maọbụ iri.

“Ọ ga-abịaghachi, mana a ga-agwọ onye ahụ ka ngosị ya belata.”

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ GBÀSÁRÁ ÍJI Ọ́GWỤ̀ M̀GBỌ̀RỌ̀GWỤ̀ ÀGWỌ́ FIBROID

Funsho Abdul, onye ọkankuzi maka nlekọta ụmụaka na ụmụ nwaanyị dị ime nke ngalaba clinical sciences na mahadum University of Ilorin, kwuru na ndị dọkịta ka na-achọ ọgwụgwọ fibroid.

“Anyị amaghị maka ọgwụgwọ ọbụla dịka mụ na gị na-ekwu,” Abdul kwuru.

“A bụ m onye dọkịta kámgbè afọ 1994, ahụbeghị m ọgwụgwọ ọbụla, mana ahụlam enyemaka site n’usoro ịwa afọ.”

Akintunde bụkwa nnukwu onye nkụzi nke ụmụaka na nleta nwaanyi dị ime na ụlọ mmụta nnukwu College of Health Sciences, OAU.

Dọkịta a kwụrụ na ọtụtụ ọnọdụ fibroid ndị ejiri mgbọrọgwụ gwọ na-ebute ọtụtụ nsogbu.

“Ihe ha na-eme bụ ime ka nya bụ fibroid belata, mana ọ ga-ebute nsogbu ọzọ nye nwaanyị ahụ,” Akintunde kwuru.

“Fibroid ndị a e jiri mgbọrọgwụ belata na-bịa gbaa mmiri-mmiri, maọbụ ha esie ike. Nke a pụtara na ákpụ̀ a ga-akpọ nkụ ma kpọnwụọ. Mana ha na-ebute nnukwu ụfụ yana atụghị-atụ na amụghị-amụ.

“A hụla m ọtụtụ n’ime ụmụ nwaanyị ndị a, ebe ha n’enwe oke ụfụ n’ihi ọgwụ mgbọrọgwụ ndị a ha ṅụrụ,” dọkịta a kwụrụ.

“Ọgwụ mgbọrọgwụ anaghị a rụcha ọrụ dịka ọgwụ oyibo si arụ.”

Abdul, onye nnyocha agụmakwụkwọ ya bụ n’ihe gbasara ịtụ ime na fibroid, kwuru na ịṅụ ọgwụ, ịwa afọ na ịkwụsị ọbara ịga ebe ákpụ̀ a nọ n’afọ bụ ụfọdụ ụzọ e sị ebelata ọnọdụ fibroid.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ ÓKWU

Okwu na usoro ịwa afọ anaghị agwọ ọnọdụ fibroid bụ asị. A na-eji usoro ịwa afọ ebelata ọnọdụ fibriod. Nya bụ fibroid nwere ike ịbịaghachi, ma awachaa afọ. O nwekwara ike mà yá abịaghachila.

Na mgbakwunye, okwu na ọgwụ mgbọrọgwụ na-agwọ fibroid enweghị ńkwàdó ọbụla. Ndị ọkachamara enyochabeghị ya.

TAGGED: Factcheck in igbo, fibriod, Igbo news in igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 27, 2024 July 27, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?

Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n'ịkwụsị…

July 18, 2025

Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára ti sọ pé…

July 18, 2025

Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?

One Facebook user claim sey Nigeria revenge against di recent United States visa restriction by…

July 18, 2025

Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa Najeriya ta mayar da martani…

July 18, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?

Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n'ịkwụsị nkwekọrịta azụmahịa akụ ọnatarachi dị…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára ti sọ pé orílẹ̀ èdè Nàìjíríà hùwà sí…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?

One Facebook user claim sey Nigeria revenge against di recent United States visa restriction by stopping one alleged mineral deal…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa Najeriya ta mayar da martani ne kan takunkumin da Amurka…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?