TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ọ̀chị́chị́ ètítì éwèlìghị̀ ụ́gwọ́ ákwụ́kwọ́ sékọndrị̀ ruo N380k
Share
Latest News
BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams
The rise of deepfakes and the fight for digital truth
DISINFO ALERT: Health ministry debunks AI video claiming free nationwide diabetes treatment
Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east
Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east
Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà
Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne
FACT CHECK: Video attributed to ‘security operatives’ breaking into apartment isn’t from south-east
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ọ̀chị́chị́ ètítì éwèlìghị̀ ụ́gwọ́ ákwụ́kwọ́ sékọndrị̀ ruo N380k

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 1, 2024 4 Min Read
Share

Ótù ozi na soshal midia ekwuola na ọchịchị etiti gbanwere ụlọ akwụkwọ sekọndrị ndị gọọmentị etiti nwe, ka ọ bụrụ nke ótù onye nwe.

Nya bụ onye kọwara onwe ya dịka Olorunyemi Kehinde Patrick na Facebook kwuru sị na onye isi ala Bola Tinubu “na-enweghị ijuanya ọbụla” kwuputara nke a dịka atụmatụ iji “webata ụzọ ịna ụtụ ọzọ.”

Na ozi ahụ, onye a kwuru na ụmụ akwụkwọ niile nọ na ogo sekọndrị nke gọọmentị etiti nwe ga-akwụ ụgwọ akwụkwọ ruru puku narị naira atọ na iri asatọ (N380,000), kwa oge ọmụmụ.

Onye a gara n’ihu deputa nkọwa ịgosị ihe mejuputara ụgwọ akwụkwọ ahụ na ihe o jiri ruo puku narị naira atọ na iri asatọ, nke ọ sị na puku iri itoolu na asaa (N97, 000) bụ maka ụgwọ akwụkwọ; puku naira iri (N10,000) bụ maka ụgwọ ịbị n’ụlọ akwụkwọ; puku naira iri na ise (N45,000) bụ maka ụgwọ akwụkwọ ọgụgụ; ebe puku naira iri n’atọ bụ maka ego akwụkwọ e ji ede ihe.

Ụgwọ ndị ọzọ gụnyere puku naira iri ise (N50,000) maka akwa akwụkwọ; puku naira iri (N10,000) bụ maka insurance; puku naira ise bụ maka mkpịsị edemede na ihe ndị ọzọ eji ede ihe, tinyere puku naira iri nke bụ maka ọ̀mụ̀mụ̀ ihe ndị ọzọ.

“Ọ bụrụ na o si n’ọnụ Tinubu pụta, ọ bụghị akụkọ ọhụrụ. Ọ bụrụ na ọ bụghị n’ọchịchị ya ka nke a mere, mgbe ahụ ka ọ ga-abụ akụkọ,” onye a dere.

“Ikekwe ọ bụrụ ụzọ ọzọ o ji ana ụlọ akwụkwọ sekọndrị ụtụ tax, iji nweta ego ọ ga-eji zụtara Akpabio na Abbas ụgbọ elu ọhụrụ, maka “nkwado” ha niile n’ịhụ na e mebiri Naijiria.”

Ozi a enwetara nkwenye ruru iri asaato (80 likes), ntụnye iri asaa n’asaa (77 comments ), ya na nkesa iri abụọ n’isii (26 reposts).

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

TheCable hụrụ ọtụtụ ihe n’ezighi ezi na okwu a, dị ka amaghị were dee nya bụ okwu, tinyere adresị nke na-ezighi ezi.

Nke mbu bụ otu n’ime ụgwọ ndị okwu a sịrị na-a na-akwụ, nke bu ụgwọ “school media” na bekee, bụ nke onye a deghere dịka “skool media”.

Ọzọkwa, onye a kwuru na ụgwọ ndị ahụ bụ nke sitere na ngalaba “office of the director, senior secondary school education operatives” ńké kwesịrị ịbụ “office of the director, senior secondary school department” — adreesị ziri ezi.

TheCable chọpụtakwara na e nwere ọdịiche dị n’etiti akara signature dị na ozi a, na nke Binta Abdulkadir, onye bụ onye ndu nke ọmụmụ sekọndrị.

Anyị chọpụtara na ụfọdụ ụlọ ozi amara ọfụma e bipụtaghị nya bụ ozi, kama naanị ụfọdụ ndị na-ede blọgụ ka a hụtara kesara ya bụ ozi.

Minisitri nke agụmakwụkwọ nke ọchịchị etiti ekwuola na ozi ahụ ezighị ezi.

Minisitri ahụ kwuru na ego kachasị elu nke ụmụ akwụkwọ federal unity colleges (FUCs) na-akwụ bụ puku narị naira (N100,000), nke bụ maka ụmụ akwụkwọ ọhụrụ, nke bụ maka akwa akwụkwọ ọhụrụ ha na ihe ndị ọzọ e ji ede ihe.

Minisitri a kwuru na nkwupụta a bụ mbọ “ịweta ọgbaghara n’etiti ndị nne na nna ụmụ akwụkwọ.”

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na gọọmentị etiti eweliele ụgwọ akwụkwọ nke Federal Unity Schools ruo puku narị naira atọ na iri asatọ (N380,000) bụ asị.

TAGGED: fact check in Igbo, Fees increase for unity schools, news in Igbo, Unity schools

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 1, 2024 September 1, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams

It sounded exactly like her, but it was not. Adeola Fayehun was thousands of miles…

August 12, 2025

The rise of deepfakes and the fight for digital truth

BY PRUDENCE OKEOGHENE EMUDIANUGHE On May 30, 2025, a 49-minute video surfaced on a YouTube…

August 12, 2025

DISINFO ALERT: Health ministry debunks AI video claiming free nationwide diabetes treatment

The ministry of health and social welfare has dismissed a viral claim alleging the launch…

August 12, 2025

Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east

One Facebook user don claim sey video wey show as hooded armed security operatives dey…

August 7, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east

One Facebook user don claim sey video wey show as hooded armed security operatives dey break into residential apartment hapun…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east

Ótù onye na Facebook ekwuola na ihe ngosị ebe mmadụ na-agbaka ụlọ obibi mmadụ mere na south-east. N'ụbọchị iri abụọ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára sọ pé fídíò tí ó se afihan àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa wani faifan bidiyo da ke nuna jami’an tsaro dauke da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?