TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Obasanjo á gwaghị Fubara kà ó kwúpùtá ọ̀chị́chị́ m̀bèrèdé na Rivers
Share
Latest News
FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020
FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀
Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok
Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC
È nwélá ọ́nwụ́ ńdị́ ụ́kà nà Naijiria n’áfọ̀ 2025 kárị́á ọ́nụ́ ọ́gụ́gụ́ ndị́ Palestinian é gbụ́rụ́ na Gaza?
Na true sey dem kill Christians for Nigeria dis year pass Palestinians for Gaza?
Ǹjẹ́ àwọn ẹlẹ́sìn ìgbàgbọ́ tí wọ́n pa ní Nàìjíríà ju àwọn ọmọ Palestine tí wọ́n pa ní Gaza lọ ní 2025?
Yi Kiristoci da aka kashe a Nijeriya a 2025 sunfi na faltunawan dake Gaza?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Obasanjo á gwaghị Fubara kà ó kwúpùtá ọ̀chị́chị́ m̀bèrèdé na Rivers

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published March 20, 2025 5 Min Read
Share

Ótù onye na soshal midia ekwuola na onye bụbụrụ onye isiala Naijiria bụ Olusegun Obasanjo atụnyele ọnụ n’okwu ndọrọndọrọ ọchịchị nke Rivers steeti.

Dịka ozi ahụ kwụrụ, Obasanjo k’asị na ọ gara ịhụ Fubara, ma gwa ya ka o wepu ndị nche niile nke ndị omeiwu na steeti ahụ.

Ozi ahụ kwukwara na Obasanjo dụrụ Fubara ọdụ̀ ka o mechie ụlọrụ Nigeria National Petroleum Company (NNPC) na Niger-Delta Development Commission (NDDC), ya na ka ọ kụtuo ebe ọbụla a na-atụ anya ịnọ were wepu ya n’ọchịchị.

Ozi a nke e bipụtara na X n’ụbọchị Tuesday, enwetala nkwenye pụku anọ n’ụma narị atọ (4.3k likes), nkesa otu puku n’ụma narị ise (1.5k reposts), na ntụnye ọnụ narị isi n’iri abụọ (620 comments).

“OBJ e jirila iwe kwuo — mechie ụlọ omeiwu Rivers steeti, kwubie ọnọdụ mberede na steetị ahụ, Obasanjo e jee ileta Fubara,” ozi ahụ kwuru.

“Napu ndị omeiwu ahụ ndị nche ha niile, mechie NNPC, NDDC, ma mebia ogige ọbụla a na-àkwádó ịnọ were chụpụ gị n’ọchịchị.

“Ọ bụ gị bụ gọvanọ ndị steeti gị họpụtara, ị bụ̀ onye ísí nche nke steeti Rivers. Ịhe ị kwuru bụ nke ga-eme — ọ bụghị Tinubu maọbụ Wike tinyere gị n’ọchịchị, mebisie ụlọ ọbụla achọrọ ịnọ were chụpụ gị n’ọchịchị. Tinubu chọrọ ntụnye votụ ndị Rivers ịji merie na ntụli aka nke afọ 2027.”

ŃSÒGBỤ́ ǸDỌ̀RỌ̀NDỌ́RỌ́ Ọ̀CHỊ́CHỊ́ ǸKÈ RIVERS STEETI

Rivers steetị nọ n’etiti nsogbu nke ndọrọndọrọ ọchịchị n’ihi ọ́zụ́zọ́ onye ga-enwe ike ịtụ ihe ga-eme na steetị ahụ nke dị n’etiti Siminalayi Fubara na Nyesom Wike, onye minista isi ala Naịjiria.

N’ụbọchị Monday, nsogbu a bịara rịa elu dịka ndị omeiwu steeti ahụ bidoro usoro iwepu Fubara na Ngozi Odu, osote ya, n’ọchịchị n’ihi “ajọ omume ha”.

N’ụbọchị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Febụwarị, ụlọ ikpe kachasị elu bụ Supreme Court nyere iwu mabidoro ụlọ akụ Central Bank na onye ngụkọ ego Naijiria bụ accountant-general, iwu ka ha hara inye steeti ahụ ego otu afọ nke ruru ha.

Ụlọ ikpe ahụ jụrụkwara ịnabata ntulịaka elu e mere na mpaghara ime obodo steeti ahụ bụ LGA, n’ụbọchị ise nke ọnwa October nke afọ 2024. N’otu aka ahụ, Fubara kwetara ịsonye na iwu ụlọ ikpe ahụ iji beleta nsogbu dị na steeti ahụ.

K’osiladị ụlọ omeiwu wegara nnọkọ ha ihu, dịka Fubara degaara ha akwụkwọ ị mata mgbe ọ ga-eweta akwụkwọ edere ego atụrụ anya na steeti ahụ ga-emefu n’otu afọ nke a kpọrọ appropration bill.

E nwela ọtụtụ oku olu ndị na-akpọ maka iweghachita udo na steeti ahụ.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

CableCheck kpọtụrụ Kehinde Akinyemi, onye nkwuchita ọnụ Obasanjo, onye kwụrụ na nya bụ ozi bụ asị.

Akinyemi kwụrụ na Obasanjo a gaghị ịhụ Fubara maọbụ gwa ya ka ọ napụ ndị omeiwu steeti ahụ ndị nchekwa ha.

“Dika ị mara, Obasanjo enweghị asafe na soshal mịdia, o kwughị ihe dị otu a,” Akinyemi kwuru.

Anyị chọpụtakwara na onweghi ụlọ ozi ma nke ha riri bipụtara nya bụ ozi.

Na mgbakwunye, Rivers steetị kwupụtara na ozi ahụ abụghị eziokwu, ma sịkwa na uche óbì ndị bipụtara ya bụ iji “bute nsogbu na ọgbaghara na steeti ahụ”.

Na ozi nke Nelson Chukwudi, onye nkwuchita ọnụ Fubara, bipụtara n’ụbọchị Tuesday, kwuru na Obasanjo maọbụ onye ọzọ abịaghị ịhụ Fubara gbasara okwu ndọrọndọrọ ọchịchị nke steeti ahụ.

Chukwudi gbakwunyere na gọvanọ steeti ahụ ekwupụtala obi ya ime ihe ụlọ ikpe kachasị elu na Naijiria kpebiri.

“Ka onye ọbụla mara na òtù PANDEF maọbụ Chief Olusegun Obasanjo a abịaghị ịhụ gọvanọ Fubara gbasara nsogbu nke dị na Rivers, dịka ndị ọchọnganọkọ kwuru,” ozi ahụ kwuru.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na Obasanjo gara ịhụ Fubara, ma gwa ya ka o mechie ụlọ omeiwu steeti ahụ, ma napụ ndị omeiwu Rivers ndị nche ha, bụ asị.

Obasanjo ekwughị ka e mechie NNPC maọbụ NDDC.

TAGGED: fact check in Igbo, news in Igbo, Obasanjo, Rivers crisis, rivers state

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu March 20, 2025 March 20, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020

Ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) akọwala n'ihe ngosi ebe onye ọ̀kwà ụgbọala ụkwụ atọ…

August 22, 2025

FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀

Àjọ tó ń rí sí ààbò àwọn awakọ̀, àwọn tí wọ́n ń rìn lójú ọ̀nà…

August 22, 2025

Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok

The Federal Road Safety Corps (FRSC) don describe one viral video wey show as keke…

August 22, 2025

Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC

Hukumar kiyaye hadurra ta kasa (FRSC) ta bayyana wani faifan bidiyo da ke nuna wani…

August 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020

Ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) akọwala n'ihe ngosi ebe onye ọ̀kwà ụgbọala ụkwụ atọ na ndị ọrụ ya na-enwe…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀

Àjọ tó ń rí sí ààbò àwọn awakọ̀, àwọn tí wọ́n ń rìn lójú ọ̀nà tí ọkọ̀ ń rìn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok

The Federal Road Safety Corps (FRSC) don describe one viral video wey show as keke rider dey open eye for…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC

Hukumar kiyaye hadurra ta kasa (FRSC) ta bayyana wani faifan bidiyo da ke nuna wani direban babur mai uku yana…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?