TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ọ̀ bụ̀ gọvanọ ńdị́ south-east kèrè ESN dị́ kà Obi sìrì kwúó?
Share
Latest News
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ọ̀ bụ̀ gọvanọ ńdị́ south-east kèrè ESN dị́ kà Obi sìrì kwúó?

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published November 1, 2022 4 Min Read
Share

Peter Obi, onye ndọrọ ndọrọ Labour Party (LP), kwuru nso nso a sị na ọ bụ gọvanọ ndị nọ na south-east kere Eastern Security Network (ESN).

O kwuru okwu a n’ụbọchị iri na ise n’ọnwa October na afọ 2022, na mmekọrịta nke Arewa Joint Committee na Kaduna haziri.

Na onyonyo pụtara màkà nya bụ mgbakọ̀, otu onye na-ege ntị jụrụ sị: “kedu ihe ga-eme ka ndị ugwu Hausa tụkwasa gị obi, mgbe ị kwubeghị okwu otu ugboro maka mmanye iwu inọ n’ụlọ ụbọchị Monde na south-east?

“Kedu ihe ga-eme ka ndị nọ na ugwu Hausa tụkwasa gị obi, ebe nso nso a, kansụl mkpọsa ndọrọ ndọrọ ọchịchị gị na Sokoto na steeti ndị ọzọ dị na ugwu Hausa, na onyeisi oche mkpọsa gị bụ ụmụ nwoke Igbo?

“Kedu ihe ga-eme ka ndị nọ na ugwu Hausa tụkwasa gị obi, ebe anyị anụbeghị gị ebe ị na-akatọ otu dịka IPOB na ESN, ma ihe omume ha?”

Na nzaghachi ajụjụ ahụ, Obi sị na onweghị ka ọ ga-esi katọ omume ndị ESN maka na ọ bụ gọọmenti steeti ndị ọwụwa anyanwụ kere ya.

“Ị naghị eso mkpọsa ndọrọ ndọrọ ọchịchị m. E kwuola m okwu maka mmanye iwu ịnọdụ n’ụlọ na ọwụwa anyanwụ. Gaa chọpụta,” ihe a ka Obi kwuru.

Mana kedu ka nkwupụta ahụ siri bụrụ eziokwu banyere nguzobe nke ESN?

NCHỌPỤTA

Nnyocha TheCable mere kpughere na ESN bụ òtù Nnamdi Kanu, onyeisi Indigenous People of Biafra (IPOB), kere n’ọnwa Desemba na afọ 2020. 

IPOB nke Nnamdi Kanu kere na 2012 na-agbalị ka ha mee ka ala Igbo bụrụ obodo nọrọ onwe ya.

Ụbọchi iri na atọ n’ọnwa Desemba na afọ 2022, Kanu kwupụtara okwu gbasara okike nya bụ òtù ndị nchekwa. Ọ sị na isi ọrụ ha bụ ichekwa ndị ọwụwa anyanwụ màkà ndi omempụ na-eyi ọha égwù.

Tupu nke a eme, o nwere akụkọ pụtara maka ndị Fulani na-achị ehi, ma jide egbe ha ji awakpo ndị mmadụ ebe ha na-arụ ọrụ na ala ubi ha.

Kanu jiri òtù nchekwa ndị ọzọ dịka Amotekun nọ na ndịda ọdịda anyanwụ na Miyetti Allah nọ na mpaghara ugwu were maa àtụ̀.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọdịda nke gọvanọ ndi ndịda ọwụwa anyanwụ màkà ichekwa ndụ na ihe onwunwe ndi igbo bụ ihe kpatara o jiri kee ndị nche a.

Chetakwa na, n’afọ 2021, ndị isi ndịda ọwụwa anyanwụ niile bịakọrọ ọnụ wee kee ndị nchekwa ha kpọrọ Ebube Agụ, iji gboo maka enweghị nchebe na mpaghara ahụ.

Dave umahi, onye kwuchitere ọnụ gọvanọ ndị ọzọ, sị na e kere ndị nchekwa a maka nsogbu nchekwa na-akawanye njọ na mpaghara ahụ.

Umahi sị: “Nzukọ ahụ kpebiri ijikọta òtù nchekwa maka ndịda ọwụwa anyanwụ, nke anyị ga-akpọ Ebube Agụ. Isi ụlọ ọrụ ya ga adị n’Enugu.”

IKPE

Okwu Obi kwuru sị na ọ bụ gọvanọ ndịda ọwụwa anyanwụ niile kere ESN bụ okwu adịgboroja.

Ọ bụ IPOB kere ndị nchekwa a. Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị LP mere mgbagwoju ESN na Ebube Agụ.

TAGGED: Dave Umahi, Eastern Security Network, Fact Check, Nnamdi Kanu, peter obi

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora November 1, 2022 November 1, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative…

July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?