TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà ńdị́ ùwé ójíi kpọ̀chìrì Naira Marley nà Sam Larry nà ǹgá?
Share
Latest News
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà ńdị́ ùwé ójíi kpọ̀chìrì Naira Marley nà Sam Larry nà ǹgá?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 21, 2023 4 Min Read
Share

Ótù ókwu á gụ̀tàrà n’ọba ozi soshal midia ekwuola sị na ónyé na-eti égwu á màrà ọfụma bụ́ Naira Marley, yana onye na-akwalite égwu bụ́ Samson ‘Sam Larry’ Balogun, bụ ndị uwe ojii kpọchiri ụbọchị ole n’ole Mohbad, onye égwu ọzọ, nwụrụ.

“A kpochiela ha, Naira Marley nà Sam Larry! A gà-àjụ́ ha ajụjụ ọnụ gbasara ihe nkiri na-ewu ewu nke gosịrị mmegide metụtara Mohbad,” ihe à kà onye kpọrọ onwe ya @mrklassiq_ dere.

Kamgbe ihe mbipụta à pụtara, o nwetala nkiri ruru puku atọ n’ụma narị atọ. Nya bụ ókwú masịrị mmadụ iri atọ n’ụma narị anọ, nke tinyere nkesa ya nà puku abụọ, narị isii n’iri abụọ n’abuo n’ọba ozi X, nke amaburu dịka Twitter.

Ewepu X, ahụkwara mbipụta dị otu à na Facebook, ebe há sị na ndị uwe ojii anwụchiela Naira Marley nà Sam Larry.

MOHBAD

Mohbad bụbu ótù n’ime ndị òtù égwu á màrà dịka Marlian Records, nke Naira Marley nwe. Mohbad, onye gbara naanị afọ iri n’asaa, nwụrụ n’ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa September. Há liri ya n’ụbọchị sotere ọnwụ ya.

Ọnọdụ ọnwụ Mohbad agaala n’ihu ịkpali ọtụtụ ntụnye ọnụ ndị mmadụ n’ọba ozi soshal midia. Ọtụtụ ndị Nigeria na ndị hụrụ egwu Mohbad na-akụ n’anya tụnyekwara ọnụ n’okwu.

N’ụbọchị ise nke ọnwa October, ọgụ egwu a nwụ́rụ́ ànwụ́ tipuru ḿkpụ́ enyemaka n’igwe ozi X, gbasara “mmekpa ahu” ọ sị ndị òtù Marlian Records na-emeso ya.

“Nanị màkà m chọrọ ịgbanwe onye nnekwata m, onye bụ nwanne ha nwoke, lee ihe ha mere m n’ụlọ ndị Marlian,” ihe a
kà o dere na Twiter, mà jiri ihe ngosị ọnya ọbara juru n’ahụ ya sonye nya bụ ozi.

Ọ gara n’ihu ịyọ enyemaka, sị: “A nà m ànwụ́ n’ime óbì m.”

Ọtụtụ mmadụ na-asị na ọgụ egwu à bụ onye ndị òtù Marlian Record na-akụ ihe, mà na-emegide n’otutu oge dị iche-iche.

K’osiladị, mkpesa nke ekpesara n’ụbọchị iri n’asaa nke ọnwa June nke afọ 2023 apụtala n’ọba ozị soshal midia ebe Mohbad kpesara mkpesa ịma ndụ ya aka, ịma ụma ebibie ihe onwe, ikụ ihe, yana mmegbu megidere ya site n’aka Sam Larry.

Mkpesa a bụ nke ezigara ụlọ uweojii Force Criminal Investigation Department (FCID) nke Alagbon dị na Lagos.

Sam Larry agala n’ihu wezuga ásáfè Instagram ya, dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-agwa ya okwu ọjọọ kà Mohbad nwụchara.

N’ebe Naira Marley nọ, ndị na-esobu nya bụ onye égwu gara n’ihu ịkwụsị ísò ókwú ya n’ọba ozi Instagram.

ÀKPỌ́CHÌBÈGHÌ NAIRA MARLEY NÀ SAM LARRY

Nnyocha TheCable mèrè gosịrị na ndị uwe ojii akpochibeghị Naira Marley maọbụ Sam Larry màkà ajụjụ ọnụ gbasara ọnwụ onye ọgụ égwu à.

“Ozi a bụ àsị́. Ọbụghị eziokwu. Onwebeghị onye akpọchiri,” Oluniyi Ogundeyi, onye nkwuchite ọnụ ụlọrụ FCID nà Lagos, kwuru.

TheCable adịla nà m̀bụ́ bipụta na ndị uwe ojii ebidola inyocha ọnwụ onye ọgụ egwu bụ́ Mohbad, onye amatabeghị ihe kpatara ọnwụ ya.

N’ụbọchị Monday, abalị iri na asatọ nke ọnwa September afọ 2023, ehibere mmadụ iri n’atọ ga-enyocha okwu a. Ha bịara kpebie na há ga-abọlite ózú ọgụ egwu a m’ọdị ḿkpà.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu a n’asị na ndị uwe ojii akpọchiela Naira Marley na Sam Larry n’ụlọ nga bụ àsị́. Ndị uweojii ka na-enyocha ya bụ okwu. Onwebeghị onye há kpọchiri kamgbe.

TAGGED: Marlian Records, Mohbad, Naira Marley, Sam Larry

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 21, 2023 September 21, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative…

July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?