TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà Nasarawa ébibèghị̀ égó ọ̀bụ́là kámgbè Tinubu bàtàrà ọ̀chị́chị́?
Share
Latest News
FACT CHECK: Viral image depicting ‘Obasanjo prostrating for Ladoja’ photoshopped
Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra
Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra
Wike yayi kuskure. Peter Obi ya gudanar da zaben LG a matsayin gwamnan Anambra
Wike make mistake. Peter Obi conduct LG election as Anambra governor
Video wey show as Thomas Partey dey blame ‘rape’ case on racism na fake
Bidiyon da ke nuna Partey yana zargin shari’ar ‘fyade’ akan wariyar launin fata da aka gyara ta hanyar lambobi
AI ni fídíò tí ó fi ẹ̀sùn ìbánifipálòpọ̀ kan Thomas Partey
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà Nasarawa ébibèghị̀ égó ọ̀bụ́là kámgbè Tinubu bàtàrà ọ̀chị́chị́?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published December 10, 2024 3 Min Read
Share

N’ụbọchị Monday, Abdullahi Sule, gọvanọ Nasarawa, kwuru na steeti ya ebiribeghị̀ ego ọbụla kamgbe onye isiala Bola Tinubu batara ọchịchị.

Sule kwuru nke na nzukọ ịkọwa atụmatụ iwu inwogharị usoro ịna ụtụ na Naijiria, nke bekee kpọrọ “Tax reform bill townhall meeting”, nke Channels Television hibere.

“A nụrụ m ka mmadụ na-ekwu na kamgbe Tinubu batara n’ọchịchị na ndị gọvanọ enweela mgbanwe pụrụ iche na ego na-abata na steeti ha,. Onye a gara n’ihu kwuo na ha chọrọ ịma ihe ndị gọvanọ ji nya bụ ego eme,” Sule kwuru.

“Gaa na steeti ndị ọzọ, ị ga-ahụ ihe ndị gọvanọ a ji nya bụ ego eme.

“Na steeti Nasarawa, ebiribeghị m ego ọbụla kamgbe Tinubu batara n’ọchịchị. Mana n’agbanyeghị nkea, anyị nwere obosara àlà ruru puku iri (10,000 hectares) nke anyị ji ákọ̀ ụ́gbo, ngwọ ọrụ niile anyị zụrụ maka ọrụ ụ́gbo, ụgwọ anyị kwụrụ ndị ọrụ… E nwere m ike ikwuru gawa.

ŃNYÒCHÁ

Tinubu meriri ntuliaka n’ọnwa Febrụwarị. Mana ọ were oche dịka onyeisi ala n’ụbọchị ịrị abụọ n’isii nke ọnwa May nke afọ 2023 (May 29, 2023).

Inyọcha okwu Sule, TheCable lebara anya na ndekọ ụgwọ steeti ji site n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụgwọ Naijiria bụ Debt Management Office (DMO) site na mbido ọchịchị Tinubu ruo ugbua.

Ụ́GWỌ́ NASARAWA JỊ̀ NAIJIRIA

N’ọnwa June nke afọ 2023, ka otu ọnwa gachara site n’oge Tinubu were oche dịka onye isi ala, DMO kwuru na ụgwọ steeti Nasarawa ji bụ ijeri Naira iri asaa n’otu na ụma nde iri n’otu (N71.11 billion).

Nasarawa’s domestic debt as of June 2023

N’ọnwa June, nya bụ ọnụ ọgụgụ agbatuola ruo ijeri Naira iri abụọ n’atọ na ụma nde iri itoolu n’anọ (N23.94 billion).

Nasarawa’s domestic debt as of June 2024

Nke a pụtara ngbatu pasentị iri isii n’isii (66%) na ụgwọ steeti ahụ jì Naijiria.

Ụ́GWỌ́ NASARAWA JÌ ḾBÀ ÒFÈSÍ

Nnyocha ụgwọ Nasarawa ji mba ndị ọzọ na weebụsaịtị ụlọrụ DMO gosịrị na steeti ahụ ji ụgwọ ọnụ ego dị nde Naira iri ise n’abuo na ụma puku iri atọ n’atọ (N52.33 million).

Nasarawa’s external debt as of June 2023

N’ọnwa June, nya bụ ọnụ ego agbagọla ruo nde Naira iri ise n’abụọ na ụma puku iri atọ n’isii (N52.36 million).

Nasarawa’s external debt as of June 2024

Nke a pụtara mmụba n’erughị otu pasentị (1%) kámgbè Tinubu batara n’ọchịchị.

ḾKPÉBÌ

Okwu Sule na ọchịchị ya ebiribeghị ego ọbụla kamgbe Tinubu batara dịka onyeisi ala abụchaghị eziokwu. Mana o ziri ezi nke ukwuu, dịka ozi anyi hụrụ na DMO gosịrị.

TAGGED: Abdullahi Sule, fact check in Igbo, Nasarawa state, news in Igbo, tax reform

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu December 10, 2024 December 10, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Viral image depicting ‘Obasanjo prostrating for Ladoja’ photoshopped

An image showing a person prostrating for Rashidi Ladoja, the Olubadan-in-waiting and former governor of…

July 11, 2025

Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra

Nyesom Wike, onye minista nke isi obodo Naijiria bụ FCT, kwuru na Peter Obi, onye…

July 11, 2025

Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra

Nyesom Wike, minisita fún Federal Capital Territory (FCT), Abuja, olú ìlú orílẹ̀ èdè Nàìjíríà, sọ…

July 11, 2025

Wike yayi kuskure. Peter Obi ya gudanar da zaben LG a matsayin gwamnan Anambra

Nyesom Wike, ministan babban birnin tarayya Abuja, ya ce Peter Obi, tsohon gwamnan Anambra kuma…

July 11, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra

Nyesom Wike, onye minista nke isi obodo Naijiria bụ FCT, kwuru na Peter Obi, onye bụ buru gọvanọ Anambra steetị…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 11, 2025

Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra

Nyesom Wike, minisita fún Federal Capital Territory (FCT), Abuja, olú ìlú orílẹ̀ èdè Nàìjíríà, sọ pé Peter Obi, ẹni tí…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 11, 2025

Wike yayi kuskure. Peter Obi ya gudanar da zaben LG a matsayin gwamnan Anambra

Nyesom Wike, ministan babban birnin tarayya Abuja, ya ce Peter Obi, tsohon gwamnan Anambra kuma dan takarar shugaban kasa na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 11, 2025

Wike make mistake. Peter Obi conduct LG election as Anambra governor

Nyesom Wike, minister of di Federal Capital Territory (FCT), tok sey Peter Obi, forma govnor of Anambra and 2023 Labour…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 11, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?