TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà Nasarawa ébibèghị̀ égó ọ̀bụ́là kámgbè Tinubu bàtàrà ọ̀chị́chị́?
Share
Latest News
FACT CHECK: Video attributed to ‘security operatives’ breaking into apartment isn’t from south-east
FAKE NEWS ALERT: WAEC denies viral list showing schools affected by results cancellation
Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya
No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party
Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀
A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro
Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI
AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà Nasarawa ébibèghị̀ égó ọ̀bụ́là kámgbè Tinubu bàtàrà ọ̀chị́chị́?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published December 10, 2024 3 Min Read
Share

N’ụbọchị Monday, Abdullahi Sule, gọvanọ Nasarawa, kwuru na steeti ya ebiribeghị̀ ego ọbụla kamgbe onye isiala Bola Tinubu batara ọchịchị.

Sule kwuru nke na nzukọ ịkọwa atụmatụ iwu inwogharị usoro ịna ụtụ na Naijiria, nke bekee kpọrọ “Tax reform bill townhall meeting”, nke Channels Television hibere.

“A nụrụ m ka mmadụ na-ekwu na kamgbe Tinubu batara n’ọchịchị na ndị gọvanọ enweela mgbanwe pụrụ iche na ego na-abata na steeti ha,. Onye a gara n’ihu kwuo na ha chọrọ ịma ihe ndị gọvanọ ji nya bụ ego eme,” Sule kwuru.

“Gaa na steeti ndị ọzọ, ị ga-ahụ ihe ndị gọvanọ a ji nya bụ ego eme.

“Na steeti Nasarawa, ebiribeghị m ego ọbụla kamgbe Tinubu batara n’ọchịchị. Mana n’agbanyeghị nkea, anyị nwere obosara àlà ruru puku iri (10,000 hectares) nke anyị ji ákọ̀ ụ́gbo, ngwọ ọrụ niile anyị zụrụ maka ọrụ ụ́gbo, ụgwọ anyị kwụrụ ndị ọrụ… E nwere m ike ikwuru gawa.

ŃNYÒCHÁ

Tinubu meriri ntuliaka n’ọnwa Febrụwarị. Mana ọ were oche dịka onyeisi ala n’ụbọchị ịrị abụọ n’isii nke ọnwa May nke afọ 2023 (May 29, 2023).

Inyọcha okwu Sule, TheCable lebara anya na ndekọ ụgwọ steeti ji site n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụgwọ Naijiria bụ Debt Management Office (DMO) site na mbido ọchịchị Tinubu ruo ugbua.

Ụ́GWỌ́ NASARAWA JỊ̀ NAIJIRIA

N’ọnwa June nke afọ 2023, ka otu ọnwa gachara site n’oge Tinubu were oche dịka onye isi ala, DMO kwuru na ụgwọ steeti Nasarawa ji bụ ijeri Naira iri asaa n’otu na ụma nde iri n’otu (N71.11 billion).

Nasarawa’s domestic debt as of June 2023

N’ọnwa June, nya bụ ọnụ ọgụgụ agbatuola ruo ijeri Naira iri abụọ n’atọ na ụma nde iri itoolu n’anọ (N23.94 billion).

Nasarawa’s domestic debt as of June 2024

Nke a pụtara ngbatu pasentị iri isii n’isii (66%) na ụgwọ steeti ahụ jì Naijiria.

Ụ́GWỌ́ NASARAWA JÌ ḾBÀ ÒFÈSÍ

Nnyocha ụgwọ Nasarawa ji mba ndị ọzọ na weebụsaịtị ụlọrụ DMO gosịrị na steeti ahụ ji ụgwọ ọnụ ego dị nde Naira iri ise n’abuo na ụma puku iri atọ n’atọ (N52.33 million).

Nasarawa’s external debt as of June 2023

N’ọnwa June, nya bụ ọnụ ego agbagọla ruo nde Naira iri ise n’abụọ na ụma puku iri atọ n’isii (N52.36 million).

Nasarawa’s external debt as of June 2024

Nke a pụtara mmụba n’erughị otu pasentị (1%) kámgbè Tinubu batara n’ọchịchị.

ḾKPÉBÌ

Okwu Sule na ọchịchị ya ebiribeghị ego ọbụla kamgbe Tinubu batara dịka onyeisi ala abụchaghị eziokwu. Mana o ziri ezi nke ukwuu, dịka ozi anyi hụrụ na DMO gosịrị.

TAGGED: Abdullahi Sule, fact check in Igbo, Nasarawa state, news in Igbo, tax reform

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu December 10, 2024 December 10, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video attributed to ‘security operatives’ breaking into apartment isn’t from south-east

A Facebook user has claimed that a video showing hooded armed security operatives breaking into…

August 5, 2025

FAKE NEWS ALERT: WAEC denies viral list showing schools affected by results cancellation

The West African Examinations Council (WAEC) has dismissed a viral list which claimed that results…

August 5, 2025

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna…

August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and…

August 1, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna iri abụọ n'ise (25 commissioners)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and oda appointees becos dem no…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi dá àwọn kọmisọnna marundinlọgbọn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru, gwamnan Ebonyi, ya dakatar da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?