TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Nwúnyè TB Joshua ò Kwèrè Peter Obi ńkwà vótù ǹdè àsátọ
Share
Latest News
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Evidence no dey sey Davido and Chioma dey expect dia third pikin
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Nwúnyè TB Joshua ò Kwèrè Peter Obi ńkwà vótù ǹdè àsátọ

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published August 4, 2022 4 Min Read
Share

Ọtụtụ mbiputa ndị mmadụ na-eke na mgbasa ozi ọha na-akọwa na Evelyn Joshua, nwunye TB Joshua, kwere Peter Obi, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour Party (LP), nkwa votu nde asatọ.

Ha na-ekwu na Evelyn kwadosiri Obi ike maka ntụlị aka onyeisi oche nke na-abia na 2023.

E biputara akụkọ a na onyonyo nke e tinyere na YouTube akaụntụ News Express Nigeria TV. Nya bụ akụkọ pụtara ụbọchị iri na asaa n’onwa July.

Isi okwu nya bụ onyonyo gụrụ sị: “2023 onyeisi oche: Evelyn TB Joshua kwere Peter Obi nkwa inye ya votu nde asatọ.”

Ndị lere ya gáfèrè narị ise na iri atọ.

Akụkọ a zikoro na ọtụtụ akaụntụ Facebook.

O nwere onye akụkọ nọ na Facebook áhà ya bụ Nolly Roll  dere màkà yá. Ndị na-eso ya karịrị nde atọ. Ndị mbiputa a masịrị karịrị puku iri. Ndị dere okwu maka ya ruru otu puku na narị atọ. Ndị kere ya ruru narị asaa na iri abụọ na anọ.

Ọtụtụ mmadụ na Facebook kere mbiputa a nwere okwu yiri onwe ha. Ihe sonyere ya na-abụ foto TB Joshua, ma ọ bụ nke nwunye ya, ma ọ bụ nke ha abụọ.

Okwu edere ugboro ugboro màkà nya bụ akụkọ na Facebook kọwara na Evelyn kwuru sị: “M ga-enye Peter Obi votu nde asatọ si na uno ụka m. Adịghị m akwado ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mana Peter Obi karịrị onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ ije n’onwe ya, onye Naijiria ga-eji dị nnukwu ọzọ.”

E kerekwara mbiputa a na Twitter.

Nchoputa 

TheCable kpọtụrụ Synagogue Church of All Nations (SCOAN) ịchọpụta mmeghachi omume ha gbasara nya bụ ókwú, ma jụọ ha ma ọ bụ uno ụka ha gbasara mgbarakwa a.

Ha azaghị ma ekwentị ha, ma ozi anyị zigara.

Anyị nyoro anya na mgbasa ozi ọha nke nya bụ uno uka, ma nke TV Joshua n’onwe ya.

Nnyocha a gosịrị na TB Joshua Ministries biputara ókwú mmeghachi omume gbasara ebubo wuru ewu na mgbasa ozi ọha nke kwuru na Evelyn Joshua buru amụma na ótù onye ndọrọ ndọrọ ga-enwe mmeri na ntụlị aka 2023.

Nya bụ ókwú mmeghachi omume pụtara na ụbochị iri na ise n’onwa July site na Facebook na Instagram akaụntụ ha.

Mbiputa ahụ kwuru sị: “Anya anyị eruola ihe edere na mgbasa ozi oha nke na-ekwu na Pastor Evelyn Joshua  kwuru na onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-enwe mmeri na ntụlị aka Naijiria na 2023.

“Biko leghara mbiputa a anya. Onweghị mgbe Pastor Evelyn Joshua ji buo amụma a. Anyị chọrọ ichetara gị na ezigbo ozi si na The SCOAN na-eziko so na Emmanuel TV na mgbasa ozi anyị”.

Anyị chọrọ na Facebook TB Joshua ministries wee chọpụta, na ụbọchị iri abụọ na ọnwa June, ekere  kpọmkwem mbiputa a.

Otu ọ dị, onweghi okwu edere na ya.

TheCable kpọtụrụ Julius Abure, onye isi LP.

Dịka ọ si kwuo: “Ndị mmadụ na-akwado Peter Obi na udi nke ha. Anyị agaghị emegide ezigbo nkwado. N’eziokwu, ndị Naijiria chọrọ mgbanwe”.

Iza mgbarakwa banyere nkwa inye nde asatọ, Abure sị na ụka synagogue akpotubeghi Labour Party ma ọ bụ Peter Obi na ụzọ ọbula.

Ikpe

Mgbarakwa na Evelyn Joshua kwere nkwa inye onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Labour Party votu nde asatọ bụ okwu adịgboroja.

TAGGED: Emmanuel TV, Evelyn Joshua, Julius Abure, peter obi, TB JOshua

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora August 4, 2022 August 4, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?