TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ńgághárị́ íwe é gòsị̀rị̀ n’íhé ńkírí à ábụghị nà Ibadan kà ó mèrè
Share
Latest News
Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya
No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party
Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀
A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro
Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI
AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa
Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á
Bidiyon da ke nuna ‘gada ta rushe a Nasarawa’ AI ce ta samar
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ńgághárị́ íwe é gòsị̀rị̀ n’íhé ńkírí à ábụghị nà Ibadan kà ó mèrè

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published October 23, 2024 3 Min Read
Share

N’ụbọchị Tuesday, ụfọdụ ndị mmadụ na soshal midia kwuru na ndị na-eme ngagharị iwe na Ibadan gwara ndị mịlịtrị ka ha nara onye isi ala Bola Tinubu ọchịchị.

N’ihe nkiri otu nkeji ahụ, a hụrụ ka ụgbọala bù ụfọdụ ndị mịlịtrị ji nwayọ anyagharị n’okporo ụzọ, ebe ụfọdụ ndị na-eme ngagharị iwe nọ n’ihu ha.

A nụrụ ka otu olu nwoke na-ekwu “Tinubu ga-àlá. Anyị chọrọ ka ndị agha mịlịtrị were ọchịchị. A maghị m ihe égwù ji atụ ha.”

E kesaala nya bụ ihe nkiri na Facebook, Twitter, na WhatsApp.

Ótù onye na X, @SabinaNkiru, onye nwere ndị na-eso ya ruru puku iri n’otu (11,000) bipụtara nya bụ ihe ngosị nke isi okwu ọ dere bụ “Ndị ngagharị iwe na Ibadan agbabichiela ndị mịlịtrị ụzọ ha si agafe, ma jụọ ha ihe mere égwù ji atụ ha ịnara Tinubu ọchịchị.”

Mbiputa a enwetala nkiri karịrị otu puku na narị asaa (1,700) na ntụnye ọnụ iri n’asaa (17 quotes). Gụọ ya eba.

Onye ọzọ na X, @PrinceUjay, nwere ndị na-eso ya ruru puku iri anọ n’ise (45,000) biputakwara otu ihe nkiri ahụ, ma dee sị na “ọnọdụ ihe na Ibadan nwere ka ọ dizi, dịka ndị na-eme ngagharị iwe gbabichiri ụgbọala ndị mịlịtrị Naijiria, ma na-ayọ ha ka ha nara ọchịchị maka na ahụhụ akariala n’ọchịchị Tinubu.”

Ozi ahụ enwetala nkiri karịrị puku abụọ (2,000) ya na ntụnye ọnụ iri abụọ n’asaa (27 quotes), nke e chekwabara ebe a.

Ụfọdụ mbipụta otu okwu a bụ ndị e chekwabara ebe a n’ebe a.

ŃNYÒCHÁ

Nnyocha mbipụta ahụ gosịrị na otu onye na TikTok bụ @Mikkyforlife0 bụ onye mbụ bipụtara nya bụ ozị.

Ọchịchọ anyị mere n’otu asafe ahụ na TikTok gosịrị na onye a biputere nya bụ ihe ngosị n’ụbọchị abụọ nke ọnwa August nke afọ 2024, mgbe e mere ngagharị iwe EndBadGovernace na Naijiria.

Ngagharị iwe a megidere agụụ bụ nke e mere bido n’ụbọchị mbụ ruo ụbọchị iri nke ọnwa August nke afọ 2024 (August 1 -10).

Ọzọ kwa, ihe ngosị ndọrọndọrọ ọchịchị nke Asue Ighodalo, onye jiri parti PDP zọọ ọkwa gọ́vanọ̀ na Edo steeti, bụ nke a hụtara n’ihe ngosị ahụ.

Ndị a na-eme ngagharị iwe a nwere ngagharị ha n’okporo ụzọ gbara abụọ n’ihu ụlọ mmanụ Total Energies lorry park filling station nke dị na Benin.

Ụlọ mmanụ filling station bụ nke dị n’okporo ụzọ upper mission nke dị na Benin, Edo steeti.

 Ị́hé ngósị́ Google Earth nkè ókpóró úzò ébé ńyá bụ́ ńgághárị́ ị́wé mèrè nà Benin.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na ndị na-eme ngagharị iwe na Ibadan gwara ndị mịlịtrị ka ha nara ọchịchị bụ àsị́. Nya bụ ihe nkiri bụ nke e sere na Benin mgbe e nwere ngagharị iwe EndBadGovernace na ọnwa August.

TAGGED: #EndBadGovernance protest, Edo state, fact check in Igbo, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu October 23, 2024 October 23, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna…

August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and…

August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi…

August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru,…

August 1, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna iri abụọ n'ise (25 commissioners)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and oda appointees becos dem no…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi dá àwọn kọmisọnna marundinlọgbọn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru, gwamnan Ebonyi, ya dakatar da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?