TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Netflix ò wépùrù íhé ńkírí Toyin Abraham màkà òmùmé áká íke?
Share
Latest News
No, Emefiele no return N4trn to FG
Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà
Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn
A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba
FACT CHECK: No, Emefiele didn’t return N4trn to FG
FAKE NEWS ALERT: Akume hasn’t been replaced as SGF, says presidency
Rárá, Nàìjíríà kò fi àwọn ọmọ iṣẹ́ ológun rán sẹ sí Ísírẹ́lì láti dá rògbòdìyàn tó ń ṣẹlẹ̀ níbẹ̀ dúró
Slurs, smears, slander… how gendered disinformation targets high-profile Nigerian women
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Netflix ò wépùrù íhé ńkírí Toyin Abraham màkà òmùmé áká íke?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 17, 2024 3 Min Read
Share

Ụfọdụ ozi na soshal mịdia ekwuola na Netflix wepuru ihe nkiri ndị Toyin Abraham, onye na-eme ihe ejije na Naijiria, mepụtara.

N’ụbọchị iri nke ọnwa Julaị, @KadunaResident, otu onye ji X ebipụta ozi, kwuru na Netflix ewepụla ihe nkiri Abraham n’asafe ha.

“OZI MGBEREDE: A nụrụ m na Netflix ewepụla ihe nkiri niile nke Toyin Abraham nwe? Biko, were nụ okwu ya nwayọ maka na ọ bụ nne mmadụ,” onye a ji X ebipụta ozi dere.

Ozi a enwetala nkiri karịrị narị puku isii na iri atọ n’isii (636,000), nkwenye pụku anọ na narị abụọ 4,200 likes, na nkesa narị asatọ n’asatọ (808).

E kesakwara ozi a ebe a n’ebe a

ḾGBÁRÌ ÁKỤ́KỌ́

Abraham bụ otu n’ime ndị a ma-ama na Naijiria akọtọrọ maka ńkwàdó hà kwàdòrò onye isiala Bola Tinubu na ntuliaka afọ 2023.

E kwuru na nya bụ onye na-eme ihe ejije kpọchiri otu onye a kpọrọ Big Ayo, onye na-akwalite ahịa ndị mmadụ (influencer), n’ụlọ nga.

“Oriaku @toyin_abraham1, ndụ gị emebiela! Ị narara Tinubu ego ka ị were rụgharịa isi nkwọcha di gi. Onye iberibe,” ozi a ewetugoro kwuru.

N’ihe onyonyo Instagram Live nke o mere n’ụbọchị Wenezde, Abraham gọnayiri nya bụ okwu, ma sị na onweghị mgbe ọ sịrị ka ndị uwe ojii kpọchie nne Ayo. Kama ihe ọ mere bụ ikpesa nya bụ okwu na cybercrime unit nke ndị uwe ojii.

Abraham kwuru na ọ gaghị anabata mkparị ọbụla nke metụtara ụmụ ya, ma ṅụọ iyi imegide ndị niile na-emekpa ya ahụ na soshal mịdia.

Okwu ya kpasuru ọtụtụ ndị mmadụ na X iwe, nke mere ka ụfọdụ degaara Netflix na Prime Video akwụkwọ ka ha wetuo ihe nkiri niile nke Toyin nwe maka “iji ike eme ihe n’ụzọ n’ezighi ezi”.

Otu onye kesara ozi ahụ nke o degaara Netflix, ma gwa ndị ọzọ ka ha mee dịka o mere. Ụfọdụ kwuru na ha ga-enye mkpesa ka ewetuo asafe soshal midia ya, ma ọ bụrụ na ọ kpọpụtaghị Big Ayo na nga.

ŃNYÒCHÁ ÓKWU

Inyocha okwu a, TheCable nere anya na Netflix ịmata ma ewetuola ihe nkiri ndị Abraham nwe.

Nnyocha a chọpụtara na ihe nkiri ndị Abraham nwe dịka ‘Ijakumo’, ‘Malaika’, ‘Prophetess’, ‘Elevator Baby’, na ọtụtụ ndị ọzọ ka nọ na Netflix.


ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Netflix éwepụ̀bèghị̀ ihe nkiri Abraham n’asafe ha.

TAGGED: fact check in Igbo, Netflix, news in Igbo, Toyin Abraham

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 19, 2024 July 17, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

No, Emefiele no return N4trn to FG

One video wey dey waka for social media show as Facebook user claim sey Godwin…

July 4, 2025

Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ti ń pín lórí àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára,…

July 4, 2025

Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn

Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru…

July 4, 2025

A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba

Wani faifan bidiyo da ke yawo a kafafen sada zumunta ya nuna wani ma’abocin Facebook…

July 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

No, Emefiele no return N4trn to FG

One video wey dey waka for social media show as Facebook user claim sey Godwin Emefiele, di forma govnor of…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

Rárá, Emefiele kò dá triliọnu mẹrin náírà padà fún ijọba àpapọ̀ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà

Fídíò kan tí àwọn ènìyàn ti ń pín lórí àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára, tí ó ṣe àfihàn ẹni…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

Ḿbà, Emefiele ènyéghàchìghị̀ FG ọ́nụ́ égó N4trn

Ótù ihe ngosị nà soshal midia egosila ebe ótù onye ji Facebook ekesa ozi kwuru na Godwin Emefiele, onye bụbu…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

A’a, Emefiele bai mayarwa FG N4trn ba

Wani faifan bidiyo da ke yawo a kafafen sada zumunta ya nuna wani ma’abocin Facebook yana ikirarin Godwin Emefiele, tsohon…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?