TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ńdị́ ùwé ójíi inspektọ émeghị ńgághárị́ íwe nà Akwa Ibom
Share
Latest News
Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east
Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east
Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà
Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne
FACT CHECK: Video attributed to ‘security operatives’ breaking into apartment isn’t from south-east
FAKE NEWS ALERT: WAEC denies viral list showing schools affected by results cancellation
Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya
No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ńdị́ ùwé ójíi inspektọ émeghị ńgághárị́ íwe nà Akwa Ibom

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 23, 2024 5 Min Read
Share

Ótù ozi na soshal midia ekwuola na ụfọdụ ndị uwe ojii inspektọ na-eme ngagharị iwe na Akwa Ibom steeti gbasara ụgwọ ọnwa afọ iri na otu e ji ha.

Ozi a, nke e biputara na X, bụ nke e jiri ihe ngosị ebe ndị uwe ojii jì akwụkwọ edere “ụfọdụ anwụọla” na ya.

Ekesaala nya bụ ozi na ụfọdụ ọba ozi soshal mịdia dị ka Facebook nke nwetaragoro nkwenye karịrị otu puku na otu narị (1.1k likes), nkesa iri isii na isii (662 reposts), na ntụnye ọnụ narị abụọ na iri atọ na asatọ (238 comments).

Nke a na-abịa ụfọdụ ụbọchị ka a kwụsịrị ngagharị iwe “EndBadGorvernance” na Naijiria, dịka e nwere ọtụtụ ozi gbasara iji aka ike megide ndị na-eme nya bụ ngagharị iwe.

“A kpọrọ ya oge kwa oge! Ihe isi ike — ndị uwe oji emee ngagharị iwe gbasara akwụghi ụgwọ ọnwa iri n’otu,” ozi a kwuru.

“Ụfọdụ ndị uwe ọjị inspektọ mere ngagharị iwe na Uyo, isi obodo Akwa Ibom, gbasara akwụghi ụgwọ ọnwa iri na otu.

“Ndị uwe ọjị ndị a ewegolitere site n’ógó inspektọ nke abụọ ruo ógó nke mbụ ndị ruru otu puku na narị ise (1,500) ndị nke si ụfọdụ akụkụ obodo na steeti nọ na Naijiria.

“Ha kpọkuru onye ịsị ndị uwe ọjị bụ inspector-general of police ka ọ gba mbọ hụ na akwụrụ ha ụgwọ ọnwa ha nke ha siri n’odị oké mkpa maka ọdịmma ha ọkachasị n’ihu ihe isi ike a.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

TheCable nyochara ihe ngosị nke sochịrị okwu ahụ, ma chọpụta na e biputara ya n’ụbọchị asaa nke nke ọnwa Septemba nke afọ 2022, mgbe ndị uwe ojii ógó nta akpọrọ constabulary mere ngagharị iwe na Oshogbo nke dị na Osun steeti, maka ụgwọ ọnwa iri na asaato eji ha.

Ịgbakwunye, onwebeghị ụlọ ozi ama-ama bipụtara nya bụ ozi.

TheCable gakwara n’ihu inyocha asafe bipụtara nya bụ ozi, ma hụ na ọ bụ nke ótù n’ime ndị nkwado òtù Indigenous People of Biafra (IPOB).

N’ihe mbiputa nke onye isi ndị uwe ojii bipụtara, site n’ọnụ Olumuyiwa Adejobi, onye nkwuchite ọnụ ndị uwe ojii na Naijiria, ọ sịrị na nya bụ ozi abụghị eziokwu, kama ọ bụ ụzọ e sị chọọ imegide ndị uwe ojii.

Adejobi kwuru na ndị ńdú ngalaba ndị uwe ojii na-agba mbọ ịhụ na ha lebara anya na nsogbu maọbụ mkpa ndị otu ha niile.

Ọ kọwara na ọ bụ ngala ministry na-ahụ maka akụ na ụba bụ ministry of finance na-ahụ ma ịkwụ ụgwọ ndị uwe ojii site na atụmatụ Integrated Personnel Payroll System (IPPIS).

“Ndị uwe ojii Niajiria akọwala ozi a dịka nke n’ezighi ezi, nke ụfọdụ ndị nta akụkọ na-ekesa na-ekwu na ụfọdụ ndị inspektọ zutere ha na ụlọ nzukọ ndị nta akụkọ di na Uyo, ebe ha kwuputara iwe ha gbasara akwụghị ugwo ọnwa kámgbè ewegoro ha n’ọkwá ọzọ dị elụ dịka ụzọ itetọ ngalaba ndị uwe ojii.

“K’osiladi, ọ pụtara ihe na ọ bụghị onye isi ndị uwe ojii maọbụ ngalaba ndị uwe ojii n’akwụ ndi uwe ojii ụgwọ ọnwa ha. Kama, ọ bụ ọrụ ministri na-ahụ maka akụ n’ụba, site n’atụmatụ Integrated Personnel and Payroll Information System (IPPIS).

“Onye isi ndị uwe ojii na-akwado onye ọbụla nwere nsogbu ọbụla gbasara nlekwa ha, ka ọ ga kpesa na ngalaba ha dị iche-iche, iji belata nsogbu ọbụla ga-ebute ihe ihere nye ngalaba ndị uwe ojii.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na ndị uwe ojii na Akwa Ibom mere ngagharị iwe gbasara akwughị ụgwọ ọnwa nke ọnwa iri n’otu bụ asị.

Ihe ngosị nke na-esote nya bụ ozi bụ ihe ngosị ochie mgbe ndị uwe ojii ogo nta a kpọrọ constabulary mere ngagharị iwe akwụghị ụgwọ ọnwa afọ iri na asatọ na Osun steeti n’afọ 2022.

TAGGED: Akwa Ibom state, fact check in Igbo, news in Igbo, Police, police protest in Akwa Ibom

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 23, 2024 August 23, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east

One Facebook user don claim sey video wey show as hooded armed security operatives dey…

August 7, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east

Ótù onye na Facebook ekwuola na ihe ngosị ebe mmadụ na-agbaka ụlọ obibi mmadụ mere…

August 7, 2025

Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára sọ pé fídíò…

August 7, 2025

Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa wani faifan bidiyo da ke…

August 7, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east

One Facebook user don claim sey video wey show as hooded armed security operatives dey break into residential apartment hapun…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east

Ótù onye na Facebook ekwuola na ihe ngosị ebe mmadụ na-agbaka ụlọ obibi mmadụ mere na south-east. N'ụbọchị iri abụọ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára sọ pé fídíò tí ó se afihan àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa wani faifan bidiyo da ke nuna jami’an tsaro dauke da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?