TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ńdị́ ná-émé ńgághárị́ ị́we àgbághị ụ́lọ̀ ụ́wé ójíi dị́ nà Nyanya ọ́kụ́
Share
Latest News
HOAX ALERT: Cross River disowns viral Cally Air ‘boobs safety’ assurance advert
Seven ways to detect an AI-generated video
BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams
The rise of deepfakes and the fight for digital truth
DISINFO ALERT: Health ministry debunks AI video claiming free nationwide diabetes treatment
Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east
Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east
Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ńdị́ ná-émé ńgághárị́ ị́we àgbághị ụ́lọ̀ ụ́wé ójíi dị́ nà Nyanya ọ́kụ́

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 6, 2024 4 Min Read
Share

Ótù ihe ngosị e kesara na soshal mịdia ekwuola na ndị na-eme ngagharị iwe gbara ụlọ ndị uwe ojii dị na Nyanya ọkụ.

Ihe ngosị nkeji iri anọ n’atọ a nke ahụtara ebe niile gosịrị ótù onye ntorobịa ka ọ na-emebisi ihe n’ụlọ ndo ebe ndị uwe ojii na-enyocha ụgbọala n’okporo ụzọ Abuja gawara Keffi.

Ótù olu n’ihe ngosị ahụ kwuru na ndị na-eme ngagharị iwe maka ihe isike na Naijiria agbaala ụlọ uwe ojii nke dị na Nyanya ọkụ.

Ihe ngosị a nke otu Okezie Atani bipụtara na X enwetala nkiri karịrị puku iri n’asatọ (18,000 views), nkwenye otu narị na iri ise n’otu (151 likes), na nkesa otu narị na iri n’ise (115 reposts).

E kesakwara nya bụ ozi na Facebook nakwa WhatsApp.

ŃGÁGHÁRỊ́ IWE “End Bad Governance”

N’ụbọchị Thursday, ndị ntorobịa Naijiria bidoro ngagharị iwe ikwuputa obi ha maka oke ọnụ ihe na-ada, ọrịrị ọnụ ego a na-ere petrol, enweghị ezi nchekwa, ya na oke ego ndị na-achị obodo na-emefu.

Gọọmentị etiti yọrọ ndị ntorobịa a ka ha ghara ime ngagharị iwe ọbụla, ma yọ ha ka ha nwere ha ndidi.

Ndị uwe ojii yọkwara ka ha bịa denye aha ndị nkwado ha, iji hụ na ha nwere ezi nchekwa oge ha na-eme nya bụ ngagharị iwe.

Na Abuja, a gwara ndị na-eme ngagharị iwe ka ha nọrọ na ụlọ egwuregwu MKO Abiola Stadium, mana ndị ntorobịa a jụrụ ịnabata nya bụ arịrịọ. Ha gara n’ihu nọdụ n’ogige Eagle Square, Unity Fountain n’ụfọdụ ebe ndị ọzọ.

ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ À

Ịmata ma ndị na-eme ngagharị iwe ọ gbara ụlọ uwe ojii a ọkụ, TheCable jiri ngwa ọrụ Google Map na Google Earth mee nnyocha.

Google Map gosịrị na ụlọ uwe ojii Nyanya dị kilomita abụọ na ụma otu (2.1km), nke ruru nkeji asaa ma ọ bụrụ na i si n’ebe ndị uwe ojii na-enyo ụgbọala gawa ụlọ uwe ojii a.

—Google Map photo showing the distance between Nyanya police station and the checkpoint

— Google Earth image: There’s no police station in the vicinity

TheCable gakwara n’ihu kpọtụrụ Josephine Adeh, onye nkwuchita ọnụ ndị uwe ojii na Abuja. Adeh kwuru na agbaghị ụlọ uwe ojii ahụ ọkụ.

Ndị uwe ojii nọ na Abuja gara n’ihu kọwaa na ọ bụ obere ụlọ ndị uwe ojii na-ano n’ime ya mgbe ha na-enyocha ụgbọala ka a gbara ọkụ.

“Megide ozi a hụrụ na soshal mịdia na a gbara ụlọ uwe ojii Nyanya oku, anyị chọrọ ime ka onye ọbụla mata n’ọbụghị ụlọ uwe ojii Nyanya ka agbara ọkụ. Kama, ọ bụ obere nchedo ndo ebe ndị uwe ojii na-enyocha ụgbọala ka agbara ọkụ,” ozi a kwụrụ.

“Mmadụ anọ ndị bụ Mathias Jude (29) nke Nyanya Area D, Mohammad Ahmed (23), Abba Jibril (18), na Mohammad Haruna (18) nwara imebi ebe a na-edebe ụgbọala ndị uwe ojii, mana anwụchiri ha.”

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na a gbara ụlọ uwe ojii Nyanya ọkụ bụ asị. Ndị omekome ahụ bụ ụlọ ndo ebe ndị uwe ojii na-anọ enyocha ụgbọala ka ha gbara ọkụ.

TAGGED: fact check in Igbo, nationwide protest, news in Igbo, protest

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 6, 2024 August 6, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

HOAX ALERT: Cross River disowns viral Cally Air ‘boobs safety’ assurance advert

The Cross River state government has disowned a viral image of a purported Cally Air…

August 15, 2025

Seven ways to detect an AI-generated video

A video announcing the launch of a free nationwide diabetes treatment recently went viral across Nigerian…

August 13, 2025

BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams

It sounded exactly like her, but it was not. Adeola Fayehun was thousands of miles…

August 12, 2025

The rise of deepfakes and the fight for digital truth

BY PRUDENCE OKEOGHENE EMUDIANUGHE On May 30, 2025, a 49-minute video surfaced on a YouTube…

August 12, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east

One Facebook user don claim sey video wey show as hooded armed security operatives dey break into residential apartment hapun…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east

Ótù onye na Facebook ekwuola na ihe ngosị ebe mmadụ na-agbaka ụlọ obibi mmadụ mere na south-east. N'ụbọchị iri abụọ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára sọ pé fídíò tí ó se afihan àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa wani faifan bidiyo da ke nuna jami’an tsaro dauke da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?