TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Nchụanwụ ọ ga-eme kà akụrụ dị ọcha?
Share
Latest News
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?
FACT CHECK: Did Nigeria halt ‘mineral deal’ with US after visa restrictions?
FACT CHECK: Viral image depicting ‘Obasanjo prostrating for Ladoja’ photoshopped
Wike tụ̀rụ̀ àsị́. Peter Obi mèrè ńtụ̀líáká ọ̀chị́chị́ ḿpághárá m̀gbè ọ́ bụ̀ gọ́vánọ̀ Anambra
Irọ́ ni Wike pa. Peter Obi ṣètò ìdìbò ìjọba ìbílẹ̀ nígbà tí ó jẹ́ gómìnà Ìpínlẹ̀ Anambra
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Nchụanwụ ọ ga-eme kà akụrụ dị ọcha?

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published July 5, 2022 3 Min Read
Share

Akụkọ dị na mgbasa ozi ọha nke ndi békèe ná akpọ Facebook na WhatsApp kwụrụ na  mmadụ nwèrè íké iji nchụanwụ were méé kà akụrụ dị ọcha ná enweghị ihe mgbu.

Ozi ochié ekegharịrị na Facebook kwuru sị: “Áfọ̀ nà-àgá. Akụrụ anyị na áyọ̀ ọbara, n’ewepu ńnú, ńsí na ihe ọbụla ga-enye nsogbụ na ahụ anyị.”

Ozi a na-ekwu na oge na-abịa mgbe ńnú ga-àdọ́kọ̀ n’akụrụ, chọọ ọgwụgwọ nhicha.

Ozi a dụrụ ndị mgbasa ozi ndụmọdụ, sị na otu ha ga-esi wéé hicha akụrụ ha bụ isi

akwụkwọ nchụanwụ n’ọkụ, ṅụọ tii ya azara aza.

Nya bụ ozi kọwara na ịṅụọ ótù iko n’ótù ubọchị, ị gà-ahụ na ńnú na nsi jùrù na akụrụ gị gá egosị ma ị chọọ ịnyụ mamịrị. A mara ya dịka ụzọ kachasị mma iji hicha akụrụ.

Aha sayensị ya bu Ocimum gratisimum. Aha békèe ya bụ “wild basil” ma ọbu “tree basil”.

Ndị Yoruba na-akpọ yá “Ewe Efinrin”. Ndị Igbo na akpọ yá Nchụanwu. Ndị Hausa na-akpọ yá “Daidoya”.

Etinyere ozi a na WhatsApp, wee sị ka ndị mmadụ gbásàá ya.

Akụrụ so na akụkụ ahụ mmadụ nke ka dị ḿkpà. 

Ọ bụ akụkụ kpụrụ agwa nọ na akụkụ abụọ ọ́kpụ́kpụ́ azụ, n’okpuru agaraahu.

Ọrụ akụrụ bụ ịyọ ọbara, iwepu ihe ọjọọ ma jikwa mmịrị itule na-ahụ mmadụ.

 

Nchoputa 

TheCable kpọrọ onye ọkachamara ahụ ịchọpụta màkà akụkọ nchụanwụ na nhicha akụrụ ònwèrè ihe ákáébe na sayensị.

Theophilus Umeizudike, dọkịta ọkachamara nke ndị bekee na-akpọ nephrologist na Lagos State Teaching Hospital, sị na onweghị ihe akaebe sayensị kwéré na nchụanwụ na-ehicha akụrụ.

Ọ gbárá ndị Naijiria ume sị ka ha kpachara anya ha màkà ozi ha na-enweta na mgbasa ozi ọha, karịsịa ọ bụrụ na osighị na aka ụlọ ọgwụ ámà àma.

 

Ilekota Akuru 

TheCable kpọtụrụ Awofeso Opeyemi, onye nnyocha na Harvard Medical School, na Dana-Farber Cancer Institute na Massachusetts, USA.

Ọ sị na onweghị akaebe na sayensị kwuru na enwerụ ike iji nchụanwụ wéé hicha akụrụ.

Ọ kwuru na otu esị eme ka akụrụ dị ọcha bụ ịṅụ mmiri zuru òkè.

Dị ka Awofeso sị kwuo, ihe na-eweta ahụike akụrụ bụ iri obere ńnu, ịṅụ mmiri zuru oke na igwọ ọbara mgbali elu n’ógè.

Dị ka osiri kwuo, ọbụrụ na a gwọ́ro ọbara mgbali elu, onwere ike imebi akụrụ.

 

Ikpe 

Mgbarakwa na nchụanwụ nwéré ike ihicha akụrụ bụ okwu adịgboroja. Onweghị ihe akaebe dị na sayensị iji kwàdó mgbarakwa a.

 

TheCable ng · Igbo: Nchụanwụ ọ ga-eme kà akụrụ dị ọcha?
TAGGED: Awofeso Opeyemi, health Fact-Check, scent leaf, Theophilus Umeizudike

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora July 5, 2022 July 5, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?

Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n'ịkwụsị…

July 18, 2025

Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára ti sọ pé…

July 18, 2025

Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?

One Facebook user claim sey Nigeria revenge against di recent United States visa restriction by…

July 18, 2025

Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa Najeriya ta mayar da martani…

July 18, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?

Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n'ịkwụsị nkwekọrịta azụmahịa akụ ọnatarachi dị…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára ti sọ pé orílẹ̀ èdè Nàìjíríà hùwà sí…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?

One Facebook user claim sey Nigeria revenge against di recent United States visa restriction by stopping one alleged mineral deal…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

Shin Najeriya ta dakatar da ‘yarjejeniyar ma’adinai’ da Amurka bayan hana biza?

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa Najeriya ta mayar da martani ne kan takunkumin da Amurka…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 18, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?