N’ụbọchị iri abụọ n’ise nke ọnwa January, Chinonso Egemba, onye dọkịta Naijiria a mara dịka Aporoko doctor, kwuru nà Naijiria nwe ọkwa abụọ n’obodo nwekarịchara ndị bu ọrịa obiri n’ájáọcha nke bekee na-akpọ human immunodeficiency virus (HIV).
Aporoko Doctor bipụtara ozi a n’asafe X ya, nke nwere ndị na-eso ya rụrụ nde abụọ n’uma puku narị atọ (2.3 million), na nzaghachi nye mkpebi onyeisiala mba US bụ Donald Trump nyere gbasara ịkwụsị ego e ji agwọ ọrịa obiri n’ájáọcha na obodo ndị na-emepe emepe, dịka otu n’ime iwu na-emegide enyemaka si mba ofesi.
Site n’iwu Trump, ngalaba Department of State nke mba US kwụsịrị nkwado si n’atụmatụ mgberede nke onyeisiala maka ị belata ọrịa obirị n’ájáọcha a kpọrọ president’s emergency plan for AIDS relief (PEPFAR).
Dịka ụlọrụ na-akwado ahụike n’ụwa niile bụ World Health Organisation (WHO) kwuru, PEPFAR n’enye nkwado ọgwụgwọ ọrịa HIV nye ndị karịrị nde iri abụọ (20 million) ndị bụ ọrịa a n’ụwa niile, nke gụnyere ụmụaka dị puku narị ịrị ịse n’ịrị isii n’isii (566,000 children) nọ n’okpụrụ afọ ịrị na ịse (15 years old).
N’ozi ahụ, onye dọkịta a depụtara òtù nya bụ nkwụsi enyemaka si mba US ga-emetụta nweta ọgwụ eji ebelata ọrịa obirị n’ájáọcha.
Mgbe ndị mmadụ màrà Aporoko Doctor áká n’ihu gbasara ebe o sịrị weta ozị ya, o kwụrụ na ọ bụ site na mbipụta sitere na webusite ngalaba United Nations Children’s Fund (UNICEF).
“Naijiria nwere ọkwa abụọ n’onuogugu obodo nwekarịchara ndị bụ ọrịa HIV n’ụwa niile,” Aporoko Doctor dere na X.
N’ozi nke UNICEF bipụtara n’afọ 2018, o kwụrụ na Naịjiria nwere mbufe ọrịa obirị n’ájáọcha dị otú pụku narị na iri itoolu na narị itoolu na iri ise (190,950) kwa afọ — nke bụ ógó abụọ n’ụwa niile.
Ngalaba ụwa niile a kwụrụ na Naijiria nwere ọnọdụ nke abụọ n’onuogugu ndị bụ́ ọrịa obirị n’ájáọcha nke ọnụogugu ha rụrụ nde atọ (3 million). Ozi ahụ gbakwunyere na nya bụ ọnụogugu bụ kámgbè afọ 2015.
Ọ dị mkpa k’anyị mata na ọnụ ọgụgụ íbú arụ ọrịa ọbụla nwere n’obodo dị iche nye ọnụọgụgụ ndị bụ nya bụ ọrịa. Ị́bú arụ ọrịa obirị n’ájáọcha gunyere mmetụta nya bụ ọrịa nye ọbodo, nke bu ọnụgugu ndị bụ nya bụ ọrịa, ngwa-ngwa ndị mmadu ji ébụ́té ọrịa ahu, na ọnwụ ole nya bụ ọrịa kpatara.
ŃNYÒCHÁ
Ịnyọcha nya bụ okwu, TheCabke lebara anya na webusite ụlọọrụ WHO na-edoko ozi gbasara ọrịa obirị n’ájáọcha nke ụwa niile. Dịka n’afọ 2023, a hụtara ozi ndị mmadụ bụ HIV n’obodo otu narị n’ịrị atọ n’anọ (134 countries).
Ozi ahụ kwuru na South Africa nwerekarịchara ọnụogugu ndị mmadụ bụ ọrịa obirị n’ájáọcha n’ụwa niile nwere mmadu dị nde asaa na uma puku narị asaa (7.7 million), sonyere India nke nwere mmadu nde abụọ n’uma puku nari ise (2.5 million), na Mozambique nke nwere mmadu nde abụọ na ụma puku nari anọ (2.4 million) ebe Niajiria bụ obodo nke anọ nke nwere ndị mmadụ nde abụọ (2 million) bụ nya bụ ọrịa.
Òbòdò | Onụogugu ndị bụ ọrịa obirị n’ájáọcha |
South African | 7,700,000 |
India | 2,500,000 |
Mozambique | 2,400,000 |
Nigeria | 2,000,000 |
United Republic of Tanzania | 1,700,000 |
Uganda | 1,500,000 |
Kenya | 1,400,000 |
Zambia | 1,300,000 |
Zimbabwe | 1,300,000 |
Brazil | 1,000,000
|
Ozi na-egosị obodo iri nwekarịchara ọnụọgụgụ ndị bụ ọrịa obiri n’ájáọcha
Ozi a sitere na WHO
Ozi ahụ gosịrị na Naịjiria bụ obodo anọ nke nwekarịchara ọnụọgụgụ ndị bụ ọrịa HIV n’ụwa niile ma bụrụkwa atọ na mba Afrịka.
N’ozi WHO bipụtara n’ọnwa July nke afọ 2024, ndị mmadụ rụrụ nde ịrị atọ n’itoolu n’uma puku narị itoolu (39.9 million) bụ ọrịa obirị n’ájáọcha na ngwụcha afọ 2023. Ozi ahụ enyeghị ọnụgugu obodo ọbụla. Mana ndị mmadụ ruru nde iri abụọ n’isii (26 million) bụ nya bụ ọrịa na mba Afrịka.
ḾKPÉBÌ
Ozị na Naijiria nwere ọnọdụ nke abụọ n’obodo nwekarịchara ndị bụ ọrịa obirị n’ájáọcha abụghị eziokwu. Ozi e biputara nso-nso a sị n’ụlọọrụ WHO ekwụghị nkea.