TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Naijiria ò nwè ọ́kwá àbụ̀ọ́ n’ọ́nụ́ ọ̀gụ́gụ́ ńdị́ bu HIV n’ụ̀wà níile?
Share
Latest News
Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya
No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party
Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀
A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro
Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI
AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa
Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á
Bidiyon da ke nuna ‘gada ta rushe a Nasarawa’ AI ce ta samar
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Naijiria ò nwè ọ́kwá àbụ̀ọ́ n’ọ́nụ́ ọ̀gụ́gụ́ ńdị́ bu HIV n’ụ̀wà níile?

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published February 10, 2025 5 Min Read
Share

N’ụbọchị iri abụọ n’ise nke ọnwa January, Chinonso Egemba, onye dọkịta Naijiria a mara dịka Aporoko doctor, kwuru nà Naijiria nwe ọkwa abụọ n’obodo nwekarịchara ndị bu ọrịa obiri n’ájáọcha nke bekee na-akpọ human immunodeficiency virus (HIV).

Aporoko Doctor bipụtara ozi a n’asafe X ya, nke nwere ndị na-eso ya rụrụ nde abụọ n’uma puku narị atọ (2.3 million), na nzaghachi nye mkpebi onyeisiala mba US bụ Donald Trump nyere gbasara ịkwụsị ego e ji agwọ ọrịa obiri n’ájáọcha na obodo ndị na-emepe emepe, dịka otu n’ime iwu na-emegide enyemaka si mba ofesi.

Site n’iwu Trump, ngalaba Department of State nke mba US kwụsịrị nkwado si n’atụmatụ mgberede nke onyeisiala maka ị belata ọrịa obirị n’ájáọcha a kpọrọ president’s emergency plan for AIDS relief (PEPFAR).

Dịka ụlọrụ na-akwado ahụike n’ụwa niile bụ World Health Organisation (WHO) kwuru, PEPFAR n’enye nkwado ọgwụgwọ ọrịa HIV nye ndị karịrị nde iri abụọ (20 million) ndị bụ ọrịa a n’ụwa niile, nke gụnyere ụmụaka dị puku narị ịrị ịse n’ịrị isii n’isii (566,000 children) nọ n’okpụrụ afọ ịrị na ịse (15 years old).

N’ozi ahụ, onye dọkịta a depụtara òtù nya bụ nkwụsi enyemaka si mba US ga-emetụta nweta ọgwụ eji ebelata ọrịa obirị n’ájáọcha.

Mgbe ndị mmadụ màrà Aporoko Doctor áká n’ihu gbasara ebe o sịrị weta ozị ya, o kwụrụ na ọ bụ site na mbipụta sitere na webusite ngalaba United Nations Children’s Fund (UNICEF).

“Naijiria nwere ọkwa abụọ n’onuogugu obodo nwekarịchara ndị bụ ọrịa HIV n’ụwa niile,” Aporoko Doctor dere na X.

N’ozi nke UNICEF bipụtara n’afọ 2018, o kwụrụ na Naịjiria nwere mbufe ọrịa obirị n’ájáọcha dị otú pụku narị na iri itoolu na narị itoolu na iri ise (190,950) kwa afọ — nke bụ ógó abụọ n’ụwa niile.

Ngalaba ụwa niile a kwụrụ na Naijiria nwere ọnọdụ nke abụọ n’onuogugu ndị bụ́ ọrịa obirị n’ájáọcha nke ọnụogugu ha rụrụ nde atọ (3 million). Ozi ahụ gbakwunyere na nya bụ ọnụogugu bụ kámgbè afọ 2015.

Ọ dị mkpa k’anyị mata na ọnụ ọgụgụ íbú arụ ọrịa ọbụla nwere n’obodo dị iche nye ọnụọgụgụ ndị bụ nya bụ ọrịa. Ị́bú arụ ọrịa obirị n’ájáọcha gunyere mmetụta nya bụ ọrịa nye ọbodo, nke bu ọnụgugu ndị bụ nya bụ ọrịa, ngwa-ngwa ndị mmadu ji ébụ́té ọrịa ahu, na ọnwụ ole nya bụ ọrịa kpatara.

ŃNYÒCHÁ

Ịnyọcha nya bụ okwu, TheCabke lebara anya na webusite ụlọọrụ WHO na-edoko ozi gbasara ọrịa obirị n’ájáọcha nke ụwa niile. Dịka n’afọ 2023, a hụtara ozi ndị mmadụ bụ HIV n’obodo otu narị n’ịrị atọ n’anọ (134 countries).

Ozi ahụ kwuru na South Africa nwerekarịchara ọnụogugu ndị mmadụ bụ ọrịa obirị n’ájáọcha n’ụwa niile nwere mmadu dị nde asaa na uma puku narị asaa (7.7 million), sonyere India nke nwere mmadu nde abụọ n’uma puku nari ise (2.5 million), na Mozambique nke nwere mmadu nde abụọ na ụma puku nari anọ (2.4 million) ebe Niajiria bụ obodo nke anọ nke nwere ndị mmadụ nde abụọ (2 million) bụ nya bụ ọrịa.

Òbòdò  Onụogugu ndị bụ ọrịa obirị n’ájáọcha
South African 7,700,000
India 2,500,000
Mozambique 2,400,000
Nigeria 2,000,000
United Republic of Tanzania 1,700,000
Uganda 1,500,000
Kenya 1,400,000
Zambia 1,300,000
Zimbabwe 1,300,000
Brazil 1,000,000

 

Ozi na-egosị obodo iri nwekarịchara ọnụọgụgụ ndị bụ ọrịa obiri n’ájáọcha

Ozi a sitere na WHO

Ozi ahụ gosịrị na Naịjiria bụ obodo anọ nke nwekarịchara ọnụọgụgụ ndị bụ ọrịa HIV n’ụwa niile ma bụrụkwa atọ na mba Afrịka.

N’ozi WHO bipụtara n’ọnwa July nke afọ 2024, ndị mmadụ rụrụ nde ịrị atọ n’itoolu n’uma puku narị itoolu (39.9 million) bụ ọrịa obirị n’ájáọcha na ngwụcha afọ 2023. Ozi ahụ enyeghị ọnụgugu obodo ọbụla. Mana ndị mmadụ ruru nde iri abụọ n’isii (26 million) bụ nya bụ ọrịa na mba Afrịka.

ḾKPÉBÌ

Ozị na Naijiria nwere ọnọdụ nke abụọ n’obodo nwekarịchara ndị bụ ọrịa obirị n’ájáọcha abụghị eziokwu. Ozi e biputara nso-nso a sị n’ụlọọrụ WHO ekwụghị nkea.

TAGGED: Aporoko Doctor, fact check in Igbo, HIV rate in Nigeria, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu February 10, 2025 February 10, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna…

August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and…

August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi…

August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru,…

August 1, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ḿbà, Nwifuru àkwụ́sịghị́ ńdị́ kọ̀mị́shọnà ya ọ́rụ́ màkà nà há ábịaghị ńchètá ọ̀mụ́mụ́ nwá ya

Ótù ozi na shoshal midia ekwuola na Francis Nwifuru, gọvanọ Ebonyi steeti, kwụsịrị ndị komịshọna iri abụọ n'ise (25 commissioners)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

No, Nwifuru no suspend officials becos dem no gree attend im pikin birthday party

One social media post claim sey Francis Nwifuru, govnor of Ebonyi, suspend 25 commissioners and oda appointees becos dem no…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

Nwifuru kò dá àwọn òṣìṣẹ́ dúró lẹ́nu iṣẹ́ nítorí pé wọ́n kò wá sí ibi ayẹyẹ ọjọ́ ìbí ọmọ rẹ̀

Ọ̀rọ̀ kan lórí ohun ìgbàlódé íbaraẹnise orí ayélujára sọ pé Francis Nwifuru, gómìnà Ìpínlẹ̀ Ebonyi dá àwọn kọmisọnna marundinlọgbọn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

A’a, Nwifuru bai dakatar da jami’ai ba saboda rashin halartar bikin ranar haihuwar yaro

Wani rubutu da aka wallafa a dandalin sada zumunta ya yi ikirarin cewa Francis Nwifuru, gwamnan Ebonyi, ya dakatar da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 1, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?