Ótù onye nà Facebook ekwuola na Naijiria emegwarụla mgbachibido visa nke mba US site n’ịkwụsị nkwekọrịta azụmahịa akụ ọnatarachi dị n’etiti obodo abụọ a.
N’ihe ngosị nkeji iri abụọ n’otu nke e bipụtara n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Julaị, Dabreezy Comedy, ótù asafe na Facebook, kwuru na Naijiria kpebiri imegide US site na ịkwusị nya bụ nkwekọrịta.
Ihe ngosị ahụ enwetala nkiri narị n’abụọ (102k views), nkwenye puku atọ n’ụma narị atọ (3.3k likes), na ntụnye ọnụ narị abụọ n’iri isii n’ise (265 comments).
Nya bụ ihe ngosị bidoro n’asafe First Post, ọba nzisa ozi dị na Durban, South Africa.
First Post kwuru na ha na-eweta ozi si n’ụwa site n’anya mba Afrika.
Na tikom tikom mbụ nke ihe ngosị ahụ, Alyson le Grange, onye nta akụkọ, na-agụpụta ozi ahụ nke isi okwu ya kwuru: Naijiria adọọla US aka ná ntị na ha nwere ike itufu ohere inwe akụ ọnatarachi n’ala Afrịka.
Ihe ngosị ndị ọzọ bụ nke a nụrụ kà olu ótù nwoke na-ekwu na Naijiria akwụsịla nkwekọrịta ya na US nwere ebe akụ egwuputara n’àlà dị, n’ihi mgbachibido visa.
Olu nwoke ahụ na-ádà ka ihe é jiri AI nwogharịa.
ŃTỌ́GHÉ ÁKỤ́KỌ́
N’ụbọchị anọ nke ọnwa June, onye isi ala mba US bụ Donald Trump, bịanyere aka n’akwụkwọ ịnapụ obodo iri n’abụọ ikike ịbata n’obodo ya.
Obodo asaa ndị ọzọ ka Trump akwụsịchaghị ịbata na mba US.
Obodo iri n’abụọ ndị amabidoro gụnyere Afghanistan, Chad, Congo, Yemen, Eritrea, Haiti, Iran, Sudan, Myanmar, Somalia, Libya, na Equatorial Guinea. A bịara nwee mmabido sịrị ike ebe obodo ndịa nọ Burundi, Cuba, Laos, Sierra Leone, Togo, Turkmenistan, and Venezuela.
N’ụbọchị iri n’asatọ nke ọnwa June, otu akwụkwọ enyobọrọ gosịrị na Trump na-akwado ịmabido ụfọdụ obodo nọ na Afrịka, nke Naijiria sò n’ime ya, ịbata na mba US.
Yusuf Tuggar, onye minista Naijiria nye mba ndị ọzọ, kwụrụ na nya bụ atụmatụ ga-enwe k’ọdị n’ihi na mpaghara West Afrịka dị nkwadobe ka ya na US rụkọọ.
N’ụbọchị asatọ nke ọnwa Julaị, US kwuputara mgbachibido visa nye Naijiria na ụfọdụ obodo ndị ọzọ.
US kwuru na nwebilọta n’oge onye Naijiria nwere ịnọ n’obodo ha bụ maka nwogharị US na-eme n’ihe gbasara mbata obodo ọzọ n’ala ha. Mana TheCable bipụtara ozi na-ekwu na ọjụjụ Naijiria ịnabata ndị na-achọ nchekwa na mba US bụ ya kpatara nya bụ mmabido.
US mechara sị na ọ bụ maka ọnọdụ nchekwa obodo ahụ ka ha jiri nye nya bụ ìwú.
ŃNYÒCHÁ
Na nzaghachi, Naijiria kwuru na mkpebi US esonyeghị na-usoro nkwanye ùgwù na ịha n’otu nke ejiri mara obodo abụọ bụ enyi.
Onye minista ahụ yọrọ US ka ha nwee nchegharị uche ebe mkpebi ahụ nọ na mmụọ ịzụkọ ahịa, na imekọ ihe ọnụ nke dị n’etiti obodo abụọ ahụ.
Mgbe ọzọ, Tuggar kwụrụ na e nwere mkpakọrịta ụka nke ha na-enwe iji nye US oghere ịkọwa ya bụ mkpebị ọfụma.
Ọ bịara kwuo na US na-amabịdọ ụfọdụ obodo iwu ka ha nabata ndị obodo Venezuela na-acho nchekwa na mba US — ụfọdụ ndị bụ ndị nọ na ǹgá— o kwuru na Naijiria agaghị abụ ebe a na awufu ndị mmadụ n’enweghị akwụkwọ ikike ibi n’obodo.
Ọchịchọ anyị jiri isiokwu nya bụ nkwekọrịta ọnatarachi me ewepụtaghị ihe ọbụla.
Onwebeghị okwu nke sitere ebe Tuggar nọ, ụlọrụ n’ahụ maka ndị bi mba ofesi, ụlọrụ onye isi ala Naijiria, maọbụ ụlọ nkwado US dị na Naijiria gbasara nya bụ okwu.
Ọbụrụ na ihe dị otú a mere, a ga-eme ka ụwa niile mara.
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Onweghị ihe aka ebe na-egosị na Naijiria akwụsịla nkwekọrịta ya na US nwere dịka ụzọ ịmegwara nbelata oge visa ndị Naijiria.