TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Kola Abiola kwùrù nà kansụl ǹché Naijiria ézukọ̀bèghị̀ kém̀gbè 1999. Ǹké à àbụ̀ ézíókwu? 
Share
Latest News
Ṣé àwọn ọmọ ológun Nàìjíríà lo àwòrán tó ti pẹ́ gẹ́gẹ́bí àwòrán iṣẹ́ igbanisilẹ̀ tí wọ́n se láìpẹ́ yìí?
Na true sey di Nigerian army use old foto for recent rescue operation?
Shin sojojin Najeriya sun yi amfani da tsofaffin hotuna don aikin ceto kwanan nan?
Ọ̀rọ̀ tí Tinubu sọ lórí owó orí tí Trump fi síta ni àwọn sa sìse pè ní ọ̀rọ̀ Ààrẹ Nàìjíríà lórí àwọn tí Amẹ́ríkà ń ṣọ́
Tinubu speech ontop Trump tariff dey misrepresented as recent comment ontop US watchlist
Maganan Tinubu akan sharhi na baya-bayan nan akan jerin sa ido na Amurka
FACT CHECK: Did Nigerian army use old pictures for recent rescue operation?
FACT CHECK: Tinubu’s speech on Trump’s tariff misrepresented as recent comment on US watchlist
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Kola Abiola kwùrù nà kansụl ǹché Naijiria ézukọ̀bèghị̀ kém̀gbè 1999. Ǹké à àbụ̀ ézíókwu? 

Mmachukwu Anyakora
By Mmachukwu Anyakora Published November 18, 2022 3 Min Read
Share

Kola Abiola, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Redemption Party (PRP) maka ntuli aka nke 2023, kwuru na National Security Council (NSC) ezukọbeghị ótù ụbọchị kemgbe afọ 1999.

Abiola kwuru ókwú à na nzukọ ndi na-azọ ọchịchị mere, nke Arise TV na Centre for Democracy and Development (CDD) haziri, na Abuja.

Abiola bụ̀ ótụ̀ n’ime mmadụ anọ na-azọ oche onyeisi obodo gara nya bụ nzukọ ìzìzì, nke ndị kwadoro ya kpọrọ presidential town hall meeting, n’ụbọchị nke isii n’ọnwa Novemba.

Ndị gakwara nzukọ à bụ Peter Obi, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour party (LP); Rabiu Kwankwaso, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị New Nigeria Peoples Party (NNPP); na Ifeanyi Okowa, osote onye ndọrọ ndọrọ ọkwa onyeisi oche Peoples Democratic Party (PDP) nke bụ Atiku Abubakar.

Ha niile turu aro maka nchekwa obodo, ma nye atụmatụ gbasara akụ n’ụba, ǹkè há bù n’uche imejuputa ma ọ bụrụ na ha banye ọchịchị.

Reuben Abati, onye jụrụ ha ajụjụ, jụrụ ihe pụrụ iche ha ga-eme ma ọ bụrụ ha nọ n’ọkwa onye isi mgbe ndị ohi wakporo ụgbọ oloko gbara ụzọ Kaduna-Abuja na Maachị 2022.

Ka Abiola na-aza ajụjụ gbasara nchekwa obodo, ọ sị na NSC ezukọbeghị kemgbe 1999.

Ọ sị na okwu nchekwa bụ nke kachasị enye obodo Naijiria nsogbu.

“Ọ dị ḿkpà ka anyị nagachie azụ, ma dozie òtù ndị nche anyị niile,” ihe a kà Abiola kwuru.

ŃCHỌ́PỤ̀TÁ

TheCable nyochara section 153, subsection 25 nke akwụkwọ iwu 1999. Nya bụ ìwú guzosiri ike ndị na-achị NSC.

Dịka ngalaba siri kọwaa: “NSC ga-agụnye (a) onyeisi obodo ga-abụ onyeisi oche; (b) osote onyeisi obodo ga-abụkwa osote onyeisi oche; (c) onyeisi ndị ọrụ nchekwa; (d) minista na-ahụ maka ihe gbasara ime obodo; (e) minista na-ahụ maka nchekwa; (f) minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi; (g) onye ndụmọdụ nchekwa obodo; (h) onye nyocha izugbe nke ndị uwe ojii; na (I) ndị ọzọ onyeisi oche nwere ike ihọpụta site n’uche ya.”

Subsection 26 kọwara na kansụl a ga-ahụ maka inye onye isi ala ndụmọdụ n’ihe gbasara nchekwa ọha, “gụnyere ihe gbasara òtù ọbụla ìwú guzosiri maka nchekwa obodo.”

TheCable kọrọ akụkọ n’ụbọchị iri na anọ na ọnwa Oktoba mgbe Muhammadu Buhari, onye isi Naijiria, chịburu ọgbakọ NSC na presidential villa na Abuja.

Akụkọ a dere na osote onyeisi bụ Yemi Osinbajo na ọtụtụ ndị isi nchekwa nọ na nzukọ ahụ.

Nakwa, ụbọchi iri atọ na otu n’ọnwa Oktoba, a kọrọ na onyeisi Naijiria kpọkọtara ọgbakọ nchekwa na mberede.

E mere nzukọ ahụ na Abuja iji nyochaa òtù nchekwa dị iche iche na Naijiria.

ÍKPÉ

Okwu Abiola kwùrù na NSC ezukọbeghị kemgbe 1999 bụ okwu adịgboroja. Onyeisi Naijiria kpọkọtara ndị otu NSC na Abuja na ụbọchị iri atọ na otu n’ọnwa Oktoba, na afọ 2022

TAGGED: ARISE TV, Kola Abiola

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Mmachukwu Anyakora November 18, 2022 November 18, 2022
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ṣé àwọn ọmọ ológun Nàìjíríà lo àwòrán tó ti pẹ́ gẹ́gẹ́bí àwòrán iṣẹ́ igbanisilẹ̀ tí wọ́n se láìpẹ́ yìí?

Ní ọjọ́ ajé, àwọn òṣìṣẹ́ ológun orílẹ̀ èdè Nàìjíríà fi ọ̀rọ̀ kan síta pẹ̀lú àwọn…

November 5, 2025

Na true sey di Nigerian army use old foto for recent rescue operation?

On Monday, di Nigerian army publish one statement togeda wit some pictures across dia official…

November 5, 2025

Shin sojojin Najeriya sun yi amfani da tsofaffin hotuna don aikin ceto kwanan nan?

A ranar Litinin din da ta gabata ne rundunar sojin Najeriya ta fitar da sanarwa…

November 5, 2025

Ọ̀rọ̀ tí Tinubu sọ lórí owó orí tí Trump fi síta ni àwọn sa sìse pè ní ọ̀rọ̀ Ààrẹ Nàìjíríà lórí àwọn tí Amẹ́ríkà ń ṣọ́

Ní ọjọ́ ìsinmi, Politics Nigeria, wẹbusaiti kan fi fídíò tí kò pé ìṣẹ́jú kan síta…

November 5, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ṣé àwọn ọmọ ológun Nàìjíríà lo àwòrán tó ti pẹ́ gẹ́gẹ́bí àwòrán iṣẹ́ igbanisilẹ̀ tí wọ́n se láìpẹ́ yìí?

Ní ọjọ́ ajé, àwọn òṣìṣẹ́ ológun orílẹ̀ èdè Nàìjíríà fi ọ̀rọ̀ kan síta pẹ̀lú àwọn àwòrán lórí àwọn ohun ìgbàlódé…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 5, 2025

Na true sey di Nigerian army use old foto for recent rescue operation?

On Monday, di Nigerian army publish one statement togeda wit some pictures across dia official social media platform to announce…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 5, 2025

Shin sojojin Najeriya sun yi amfani da tsofaffin hotuna don aikin ceto kwanan nan?

A ranar Litinin din da ta gabata ne rundunar sojin Najeriya ta fitar da sanarwa tare da wasu hotuna a…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 5, 2025

Ọ̀rọ̀ tí Tinubu sọ lórí owó orí tí Trump fi síta ni àwọn sa sìse pè ní ọ̀rọ̀ Ààrẹ Nàìjíríà lórí àwọn tí Amẹ́ríkà ń ṣọ́

Ní ọjọ́ ìsinmi, Politics Nigeria, wẹbusaiti kan fi fídíò tí kò pé ìṣẹ́jú kan síta lórí Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 5, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?