TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: INEC émefùghị̀ ₦355bn n’élú BVAS díkà Dele Momodu kwùrù
Share
Latest News
Did Tinubu attend same school as Alexander Zingman? Here is what we know
FACT CHECK: No, Nigeria didn’t deploy peace support mission to Israel
FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?
FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?
FACT CHECK: Ndume erred. 22 governors didn’t endorse Jonathan in 2015
Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé
Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá
No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

INEC émefùghị̀ ₦355bn n’élú BVAS díkà Dele Momodu kwùrù

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 23, 2023 7 Min Read
Share

Dele Momodu, onye mbipụta akụkọ n’ụlọ ọrụ Ovation Magazine, kwuru nà ndị Independent National Electoral Commission (INEC) mefuru ego ruru ijeri Naira narị atọ n’iri ise n’ise n’elu ígwè há jì ábị̀ànyé áká ndị na-atụ votu bụ́ BVAS.

“Kedu ihe mere eji atufu ego, ebe anyị nwèrè ike ísi n’ọchịchị onye kwuo uche ya banye n’ọchịchị ndi ézè na lọọlọ,” bụ ihe ụfọdụ isiokwu ihe mbipụta à pụtara n’ọba ozi Instagram.

Ókwú à masịrị mmadụ puku atọ nà narị atọ n’iri abụọ n’ise, ma hụ́ ntụnye ọnụ narị asaa n’iri itoolu n’atọ.

“Ọnụ ego ₦355 billion kà INEC mefuchara n’elu BVAS, mmadụ wèré kwuo sị nà ọdịghị ḿkpà iji ya mee ntuliaka. Ọ bụghị ihe na-atọ ọchị. Kedu ụdị obodo dị ihe à?” ihe mbipụta à chịkọtara.

Momodu sònyèrè nà ntuliaka ímé òtù nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) hàzìrì iji họrọ onye ga-anọchite anya há ná ntụlịaka ịzọ ọkwa onye isi obodo. Nke à mèrè n’ọnwa May, n’afọ 2022.

Kà omerighị na ntụlịaka ímé òtù PDP, ndị isi mkpọsa òtù PDP màkà ọzịzọ ọkwa onye isi obodo bịara méé ya onye ntụziaka nyere mkpọsa nya bụ òtù. Ọ́rụ́ yá pụtara inenye anya nà ihe gbasara nzikọrịta ozi.

BVAS

BVAS, nke pụtara Bimodal Voter Accreditation System, bụ̀ ngwa nka n’ụzụ INEC họpụtara n’afọiji kwalịte ntuliaka, n’enweghị nrụrụ aka ọbụla.

Igwe a, ga-ebuzọ debanye ndị niile bịara ịbịanye aka n’akwụkwọ, site n’isere ihu ha.

BVAS à na-edekọkwa ozi ndị mmadụ. Ọ na-eserekwa akwụkwọ nson’azụ ntuliaka, ǹkè akpọrọ Form EC8A. BVAS à bụkwa ngwa ọrụ e jì eziga ihe nsere nson’azụ ntuliaka n’ime IReV.

ŃDÍ NA-AMA Ọ̀CHỊ́CHỊ́ ÁKÁ ÀGBÁRỤ̀Ọ́LÁ ÍHU ŃYÉ ÁDỊGHỊ ÍKÉ ǸKÈ INEC ÍZÌGÀ ḾPỤ̀TÁ ŃTÙLÍÁKA SÍTÉ N’ÍGWÈ BVAS

Tupu emee ntuliaka, INEC kwùrù sị na há dị ikikere iziga mpụta nya bụ ntuliaka site n’ígwè BVAS. Mana há emeghị kà há kwùrù n’iziga ǹkè ntuliaka ọzịzọ ọkwa onye isi ala.

Nke a kpalitere íwé n’óbì ndị mmadụ, mà kpátá nà ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ ga-emecha kọ́tọ̀ọ́ ḿmérí Bola Tinubu n’ụlọ ikpe.

Kà ótù ọnwa emechara ntuliaka gachara, Festus Okoye, onye nkwuchite ọnụ ụlọrụ INEC, kwùrù sị́ nà “ọdịghị mma” ị́sị na-ego ndị ọha lara n’íyì màkà nsogbu BVAS nwèrè n’iziga mpụta ntuliaka nke onye isi ala.

ḾKPÉBÌ ÚLÒ ÍKPÉ NTULIAKA

N’ụbọchị isii nke ọnwa September, ụlọ ikpe màkà ntuliaka bú election tribunal nabatara mmeri Bola Tinubu site ná ntuli aka emere n’ụbọchị iri n’ise nke ọnwa February.

Nya bụ ikpe, nke onye nọ n’isi ya bụ Haruna Tsammani, tufuru mkpesa Atiku Abubakar nke PDP, Peter Obi nke òtù LP, nakwa mkpesa nke ótù Allied Peoples Movement (APM). Ha niile bụ ndị na-ama mmeri Tinubu aka.

Ndị ọka iwu a bịakọtara ọnụ, mà kpebie sị nà mkpesa ha n’ile “enweghị mmiri n’ime ya”. Ha sịkwara nà INEC nwèrè ikikere ikpebi otu ọbụla há chọrọ isi ziga mpụta ntuliaka ọbụla.

Ọka ikpe mmadụ ise à gbakwunyere sị na iwu ntuliaka amabidoghị ụlọrụ INEC iziga mpụta ntuli aka site n’igwe teknuzu.

ÉGÓ OLE ÉMEFÙRÙ N’ÉLÚ BVAS

N’afọ 2021, onye ísí oche INEC, kà ọ nà-gbachitere budget ụlọrụ ha n’ihu senate kọmitii na-ahụ màkà budget, kwùrù sị na há ga-eji ego ruru ijeri narị Naira atọ n’ise méé ntuli aka nke afọ 2023.

N’afọ 2022, Yakubu gàrà n’ihu kọwaa nà ewepu ego há kwadoro iji me ntuli aka, ọnụ ego ijeri Naira iri ise bụ ihe ụlọrụ ahụ chekwubere imefu n’ọnwa 2023. Ọ kọwara nà ọnụ ego à bụ mmụba ijeri Naira iri site nà ijeri Naira iri anọ nke há mefuru nà 2022.

Ágbàkọ́ọ́ ijeri Naira iri ise nke budget 2023 pụtara, n’akụkụ ijeri Naira narị atọ n’ise nke edekọtara màkà nkuliaka ọkwa ón`yé isi obodo, ọnụ ego INEC depụtara nà há ga-emefu n’afọ 2023 pụtara ijeri Naira narị atọ nà iri ise n’ise.

Kọmitii INEC kwadobere ịhụ màkà ńkwádó ntuliaka bụ́ Election Project Planning (EPP) kwùrù sị nà, n’ime ijeri Naira narị atọ n’ise há depụtara màkà nya bụ ntuliaka, INEC tụrụ ányá iji “ijeri Naira ótù nari n’iri isii na ótù n’ụma nde narị itoolu màkà ihe n’ile gbasara nhazi ntuliaka, ijeri ótù narị Naira nà iri n’asaa n’ụma nde ótù narị maka ihe gbasara teknuzu, yana mmefu ego ndị ọzọ pụtara ijeri Naira iri na asatọ n’ụma nde narị iri ise.

N’ịga n’ihu, kọmitii à kwùrù nà ọnụ ego ijeri Naira asaa n’ụma nde narị iri anọ bụ nke há debere n’akụkụ màkà mmefu ego nke atụghị ányá.

Ego é ji zụta ígwè BVAS sònyèrè nà ijeri Naira ótù nari nà iri n’asaa n’ụma nde ótù narị, nke dabara n’ego edepụtara ịgbachi màkà tekunuzu.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ókwú na-ewu nà INEC mefuru ijeri Naira narị atọ na iri ise n’ise n’elu ígwè BVAS, dịka Dele Momodu kwùrù, bụ àsí.

Ijeri Naira narị atọ na iri ise n’ise bụ mgbakọta ọnụego ụlọrụ INEC kwadoro iji me ntuliaka nke afọ 2023. Nke à pụtara nà ijeri Naira narị atọ na ise bụ màkà ntuli aka. Ijeri Naira iri ise wèré bụ́rụ́ màkà budget ụlọrụ INEC ǹkè afọ ahụ.

N’ime ijeri Naira narị atọ n’ise ǹkè akwadobere màkà ntuli aka, ụlọrụ INEC mabidoro nà ego niile gbasara tekunuzu agaghị agafe ijeri Naira ótù narị n’iri na asaa n’ụma nde ótù narị. Nke à pụtara na nanị obere ego n’ime ijeri Naira ótù nari na iri n’asaa n’ụma nde ótù narị bụ nke há mefuru n’elu BVAS.

TAGGED: BVAS, Dele Momodu, Igbo, INEC

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 23, 2023 September 23, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Did Tinubu attend same school as Alexander Zingman? Here is what we know

During the launch of the renewed hope mechanisation programme in Abuja on Monday, President Bola…

June 24, 2025

FACT CHECK: No, Nigeria didn’t deploy peace support mission to Israel

A Facebook video purports that Nigeria deployed troops for a joint peace support mission in…

June 24, 2025

FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?

A viral X post claims that Nigeria’s new national anthem was not recited during the…

June 13, 2025

FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?

Reports of a military coup in Cameroon ousting President Paul Biya have gone viral on…

June 13, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé ibaraẹnisọrẹ orí ayélujára sọ pé Robert Francis Prevost, Pope Leo XIV…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá

Ótù onye na Facebook ekwuola na Pope Leo na ụfọdụ ndị Bishop yọrọ onye isiala Bola Tinubu ka ọ tọpụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu

One Facebook user claim sey Pope Leo XVI and oda bishops join mouth beg President Bola Tinubu to release Nnamdi…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

A’a, Paparoma Leo bai nemi Tinubu ya saki Nnamdi Kanu ba

Wani mai amfani da Facebook ya yi ikirarin cewa Paparoma Leo na 16 da wasu limaman coci sun roki shugaban…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?