TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńkírí ụ́lọ̀ élu nà-ádà ésighị nà àlà.ọ̀má jìjìjì ǹké Taiwan
Share
Latest News
Seven ways to detect an AI-generated video
BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams
The rise of deepfakes and the fight for digital truth
DISINFO ALERT: Health ministry debunks AI video claiming free nationwide diabetes treatment
Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east
Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east
Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà
Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńkírí ụ́lọ̀ élu nà-ádà ésighị nà àlà.ọ̀má jìjìjì ǹké Taiwan

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published April 15, 2024 4 Min Read
Share

Ihe nkiri na-ewu ewu gosịrị ebe ogologo ụlọ elu nà-èzé. Ndị mmadụ sị na ọ sì n’ihe mgberede ala ọma jijiji mere n’obodo Taiwan.

Na ihe ngosị ahụ, a hụrụ ka ogologo ụlọ na-eze, ma na-abọlị aja elu, ebe ndị mmadụ nọ n’akụkụ ya na-eti mkpụ.

Ihe nkiri nkeji iri n’atọ a, nke pụtara na X, enwetala nkiri puku iri ise n’ise (55,000), nkesa iri atọ (30), nkwenye iri isii n’asaa (67), na nchekwa ịgụ mgbe ọzọ iri atọ n’atọ (33).

“Ọtụtụ ụlọ dara mgbe nnukwu ala ọma jijiji ike ya ruru asaa na ụma ise (7.5) mere, nke kpaliri nnukwu ide mmiri nke ndị oyibo na-akpo tsunami,” @patrickhsu0906, onye ji X agbasa ozi dere n’okpuru ihe ngosị ahụ.

Ihe ngosị ahụ bu nke ọtụtụ ndị ndị ọzọ na X kwuru n’osị na ala ọma jijiji nke Taiwan.

“Ala ọma jijiji nke Taiwan nke owụwa anyanwu Asia! Ajọ ihe ebe ogologo ụlọ nà-ádà. Ala ọma jijiji a, nke mebiri ụlọ ma mee ka ana zéé, bụ ihe mgberede kacha metụta Taiwan kámgbè afọ iri abụọ n’ise. Ọ bụ nke so kwa metụta ụfọdụ akụkụ China, Philippines, na Japan.

“Taipei, isi obodo Taiwan. Alà ọma jijiji nke íké ya ruru asaa na ụma ise (7.5) bidoro n’osimiri ọwụwa anyanwụ nke Taiwan. Nke a gburu mmadụ itoolu (9) ma merụọ mmadụ ruru narị itoolu na iri isii n’atọ (963) ahụ, dịka ndị mmenyụ ọkụ ogbụgbu Taiwan kwụrụ,” @ZubairSpanish dere na X.

ÀLÀ Ọ̀MÁ JÌJÌJÌ ǸKÉ TAIWAN

N’ụbọchị Wednesday gara aga, ala ọma jijiji nke ike ya ruru asaa n’ụma abụọ (7.2) mere n’obodo Taiwan, nke kpatara ọdịda ọtụtụ ụlọ, gbuo mmadụ itoolu, ma merụọ ihe karịrị mmadụ otu puku ahụ.

Central Weather Administration (CWA), ụlọrụ na-ahụ maka ihu igwe n’obodo Taiwan, kwuru na ọ bụ mmegharị n’ime óké osimiri Philippine n’ebe dị ala nsọ kpatara nya bụ ihe mgberede.

N’agbanyeghị na ala ọma jijiji abụghị ihe ọhụrụ na Taiwan, nke ụbọchị Wednesday bụ nke kacha metụta obodo ahụ kamgbe afọ iri abụọ n’ise gara aga.

N’afọ 1999, ala ọma jijiji nke ike ya ruru asaa n’ụma asaa (7.7) kpatara ọnwụ mmadụ puku abụọ na narị anọ (2,400), ebe mmadụ puku iri (11,000) merụrụ ahụ. Ihe mgberede a mebiri ụlọ puku iri.

Taiwan bụ obodo dị na ọdịda anyanwụ nke etiti osimiri Pacific Ocean. Ọ nọ n’elu ebe a na-enwekarị ala ọma jijiji (nke akpọrọ ring of fire).

ÍNYÒCHÀ ÍHÉ ŃGÓSỊ́ À

TheCable jiri ngwa ọrụ InVID nyochaa akụkụ niile nọ na ihe ngosị a, ma chọpụta na e bipụtara ya kamgbe ụbọchị iri abụọ n’asaa nke afọ 2021 n’ọba ozi The Paper Yunan Information Platform nke China.

Dịka ọba ozi a kwuru, ogologo ụlọ iri na ise bụ nke ama ụma kutuo n’ọnọdụ nlezị anya na Kunming, isi obodo Yunnan dị na China.

A kuturu ụlọ ndị a n’ihi na ha erughị ógó ụlọ obibi na ihe ndị mmadụ na-achọ. Ụlọ ndị a nwekwara óké mmebi, dịka a hapụrụ ịrụcha ha ngwa ngwa.

Ebibutakwara nya bụ ihe ngosị na YouTube n’oba ozi USA TODAY n’ụbọchị iri atọ n’otu nke ọnwa August nke afọ 2021.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe ngosị ebe ụlọ ogologo na-ada esighị na ala ọma jijiji nke mere n’obodo Taiwan. Kama, ọ bụ nkutu ụlọ a ma ụma kutuo na China n’afọ 2021.

TAGGED: earthquake, Taiwan

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu April 15, 2024 April 15, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Seven ways to detect an AI-generated video

A video announcing the launch of a free nationwide diabetes treatment recently went viral across Nigerian…

August 13, 2025

BLIND SPOT: Nigeria’s shortcomings in the age of AI scams

It sounded exactly like her, but it was not. Adeola Fayehun was thousands of miles…

August 12, 2025

The rise of deepfakes and the fight for digital truth

BY PRUDENCE OKEOGHENE EMUDIANUGHE On May 30, 2025, a 49-minute video surfaced on a YouTube…

August 12, 2025

DISINFO ALERT: Health ministry debunks AI video claiming free nationwide diabetes treatment

The ministry of health and social welfare has dismissed a viral claim alleging the launch…

August 12, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Video wey show as ‘security operatives’ dey break into apartment no be from south-east

One Facebook user don claim sey video wey show as hooded armed security operatives dey break into residential apartment hapun…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east

Ótù onye na Facebook ekwuola na ihe ngosị ebe mmadụ na-agbaka ụlọ obibi mmadụ mere na south-east. N'ụbọchị iri abụọ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Ìṣẹ̀lẹ tí àwọn ‘òṣìṣẹ́ elétò ààbò’ fẹ́ fipá wọ ibùgbé kan kò ṣẹlẹ̀ ní gúúsù ilà oòrùn Nàìjíríà

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ lórí ayélujára sọ pé fídíò tí ó se afihan àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

Bidiyon da ake dangantawa da ‘jami’an tsaro’ da suka kutsa cikin gida ba daga kudu maso gabas ba ne

Wani ma’abocin amfani da shafin Facebook ya yi ikirarin cewa wani faifan bidiyo da ke nuna jami’an tsaro dauke da…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 7, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?