TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńkírí ụ́lọ̀ élu nà-ádà ésighị nà àlà.ọ̀má jìjìjì ǹké Taiwan
Share
Latest News
Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́
Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar
Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́
Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu
FACT CHECK: Viral photos of Nigerian Christians bearing arms in churches are misleading
Da’awar cewa Davido da Chioma suna tsammanin ɗansu na uku karya ne
Òótọ́ kọ́ ni ọ̀rọ̀ tó sọ pé Davido àti Chioma ń gbaradì fún ọmọ wọn kẹta
Evidence no dey sey Davido and Chioma dey expect dia third pikin
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńkírí ụ́lọ̀ élu nà-ádà ésighị nà àlà.ọ̀má jìjìjì ǹké Taiwan

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published April 15, 2024 4 Min Read
Share

Ihe nkiri na-ewu ewu gosịrị ebe ogologo ụlọ elu nà-èzé. Ndị mmadụ sị na ọ sì n’ihe mgberede ala ọma jijiji mere n’obodo Taiwan.

Na ihe ngosị ahụ, a hụrụ ka ogologo ụlọ na-eze, ma na-abọlị aja elu, ebe ndị mmadụ nọ n’akụkụ ya na-eti mkpụ.

Ihe nkiri nkeji iri n’atọ a, nke pụtara na X, enwetala nkiri puku iri ise n’ise (55,000), nkesa iri atọ (30), nkwenye iri isii n’asaa (67), na nchekwa ịgụ mgbe ọzọ iri atọ n’atọ (33).

“Ọtụtụ ụlọ dara mgbe nnukwu ala ọma jijiji ike ya ruru asaa na ụma ise (7.5) mere, nke kpaliri nnukwu ide mmiri nke ndị oyibo na-akpo tsunami,” @patrickhsu0906, onye ji X agbasa ozi dere n’okpuru ihe ngosị ahụ.

Ihe ngosị ahụ bu nke ọtụtụ ndị ndị ọzọ na X kwuru n’osị na ala ọma jijiji nke Taiwan.

“Ala ọma jijiji nke Taiwan nke owụwa anyanwu Asia! Ajọ ihe ebe ogologo ụlọ nà-ádà. Ala ọma jijiji a, nke mebiri ụlọ ma mee ka ana zéé, bụ ihe mgberede kacha metụta Taiwan kámgbè afọ iri abụọ n’ise. Ọ bụ nke so kwa metụta ụfọdụ akụkụ China, Philippines, na Japan.

“Taipei, isi obodo Taiwan. Alà ọma jijiji nke íké ya ruru asaa na ụma ise (7.5) bidoro n’osimiri ọwụwa anyanwụ nke Taiwan. Nke a gburu mmadụ itoolu (9) ma merụọ mmadụ ruru narị itoolu na iri isii n’atọ (963) ahụ, dịka ndị mmenyụ ọkụ ogbụgbu Taiwan kwụrụ,” @ZubairSpanish dere na X.

ÀLÀ Ọ̀MÁ JÌJÌJÌ ǸKÉ TAIWAN

N’ụbọchị Wednesday gara aga, ala ọma jijiji nke ike ya ruru asaa n’ụma abụọ (7.2) mere n’obodo Taiwan, nke kpatara ọdịda ọtụtụ ụlọ, gbuo mmadụ itoolu, ma merụọ ihe karịrị mmadụ otu puku ahụ.

Central Weather Administration (CWA), ụlọrụ na-ahụ maka ihu igwe n’obodo Taiwan, kwuru na ọ bụ mmegharị n’ime óké osimiri Philippine n’ebe dị ala nsọ kpatara nya bụ ihe mgberede.

N’agbanyeghị na ala ọma jijiji abụghị ihe ọhụrụ na Taiwan, nke ụbọchị Wednesday bụ nke kacha metụta obodo ahụ kamgbe afọ iri abụọ n’ise gara aga.

N’afọ 1999, ala ọma jijiji nke ike ya ruru asaa n’ụma asaa (7.7) kpatara ọnwụ mmadụ puku abụọ na narị anọ (2,400), ebe mmadụ puku iri (11,000) merụrụ ahụ. Ihe mgberede a mebiri ụlọ puku iri.

Taiwan bụ obodo dị na ọdịda anyanwụ nke etiti osimiri Pacific Ocean. Ọ nọ n’elu ebe a na-enwekarị ala ọma jijiji (nke akpọrọ ring of fire).

ÍNYÒCHÀ ÍHÉ ŃGÓSỊ́ À

TheCable jiri ngwa ọrụ InVID nyochaa akụkụ niile nọ na ihe ngosị a, ma chọpụta na e bipụtara ya kamgbe ụbọchị iri abụọ n’asaa nke afọ 2021 n’ọba ozi The Paper Yunan Information Platform nke China.

Dịka ọba ozi a kwuru, ogologo ụlọ iri na ise bụ nke ama ụma kutuo n’ọnọdụ nlezị anya na Kunming, isi obodo Yunnan dị na China.

A kuturu ụlọ ndị a n’ihi na ha erughị ógó ụlọ obibi na ihe ndị mmadụ na-achọ. Ụlọ ndị a nwekwara óké mmebi, dịka a hapụrụ ịrụcha ha ngwa ngwa.

Ebibutakwara nya bụ ihe ngosị na YouTube n’oba ozi USA TODAY n’ụbọchị iri atọ n’otu nke ọnwa August nke afọ 2021.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe ngosị ebe ụlọ ogologo na-ada esighị na ala ọma jijiji nke mere n’obodo Taiwan. Kama, ọ bụ nkutu ụlọ a ma ụma kutuo na China n’afọ 2021.

TAGGED: earthquake, Taiwan

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu April 15, 2024 April 15, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke…

December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church…

December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní…

December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku…

December 4, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ị́hé ńgósị́ ébé ńdị́ ụ́ká Naijiria jị́ égbè n’ụ́lọ́ ụ́ká ézị́ghị́ézị́

Ka ndị omekome wakpochara ndị gara ụka na Christ Apostolic Church (CAC) dị na Oke Isegun n'obodo Eruku nke Kwara…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Hotunan da ke yawo na kiristocin Najeriya rike da makamai a coci suna yaudarar

Biyo bayan harin da wasu ‘yan bindiga suka kai kan mabiya cocin Christ Apostolic Church (CAC) a reshen cocin Christ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Àwọn fọ́tò tó sàfihàn àwọn ọmọ Nàìjíríà ẹlẹ́sìn Kristẹni tí wọ́n di nnkan ìjà mọ́ra kò seé gbàgbọ́

Lẹ́hìn ìgbà tí àwọn oníwà jàgídíjàgan kan kọlu àwọn ènìyàn tí wọ́n ń jọ́sìn ní ẹ̀ka Christ Apostolic Church (CAC)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

Viral foto wey show as Nigerian Christians dey cari gun for church dey mislead pipu

Afta bandits attack worshippers Christ Apostolic Church (CAC) branch for Oke Isegun inside di Eruku community for Kwara state on…

CHECK AM FOR WAZOBIA
December 4, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?