TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńkírí à ébé á gbatùrù ụ́gbọ́élu helikopta ágbasaghị ághá Isreal nà Hamas
Share
Latest News
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Ǹjẹ́ Nàìjíríà dá àjọṣe lórí àwọn àlùmọ́ọ́nì láàárín òhun àti Amẹ́ríkà dúró nítorí visa?
Nigeria stop ‘mineral deal’ with US afta visa restriction?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńkírí à ébé á gbatùrù ụ́gbọ́élu helikopta ágbasaghị ághá Isreal nà Hamas

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published November 2, 2023 5 Min Read
Share

Onyonyoo ndị mmadụ na-ekesa nà sọshal midia egosila ebe ogbunigwe gbátùrù ụgbọ elu helikopta.

Ndị na-ekesa ya na-akọwa nà ọ́ bụ ụgbọelu Isreal ndị agha Hamas nke mba Palestine gbaturu n’agha obodo abụọ à na-alụ.

“Ụgbọelu Isreal kà há gbaturu,” bụ ihe ozi nke @Sentletse, onye ọba ozi X, deputara nye mmadụ puku abụọ n’iri asaa na atọ n’ụbọchị asatọ nke ọnwa October.

Mgbe anyị dere akụkọ a, ozi ahụ enwetala nkiri ruru nde iri na narị puku isii, mmasị karịrị puku asatọ, ntụnye ọnụ puku atọ, na nchekwa izisa oge ọzọ ruru ótù puku.

Israeli helicopters getting smashed ???? pic.twitter.com/po5AL4PRoo

— Sentletse ???????????????????????? (@Sentletse) October 8, 2023

 

N’ụbọchị asatọ nke ọnwa October, Arun Gangwar, onye nta akụkọ sịrị nà ọrụọla n’ọtụtụ ụlọ nzisa ozi, nke gụnyere India Daily Live, sokwara zisaa ya bụ ozi, ma jiri ákàrà hashtag kwàdó obodo Isreal.

“#HamasTerrorists, Ụgbọelu helikopta abụọ nke Isreal nwe bụ nke há gbaturu,” nke à bụ ihe Gangwat zipuru.

Ozi ya enwetala nkiri narị abụọ nà iri n’anọ, mmasị narị anọ n’iri asatọ n’itoolu, ntụnye okwu narị iri ise na itoolu, nkegharị iri itoolu n’ise, yana nchekwa ịgụ mgbe ọzọ ruru iri abụọ nà ise.

#HamasTerrorists
Two helicopters of Israel Shot down by Hamas#IsraelUnderAttack #Gaza #Sderot #Israël #Palestine #Israel #Hamas #War #AlMayadeen #Palestine #AlAqsaFlood #طوفان_الأقصى #IsraelUnderAttack #mosad #IndiaWithIsrael #TelAviv #KuShiv #IStandWithIsrael #savas pic.twitter.com/ryeisXoax0

— Arun Gangwar (@AG_Journalist) October 7, 2023

“Ndi agha Hamas gbaturu ụgbọelu abụọ ọ́zọ ndị Isreal na Gaza nke Palestine,” ka ótù ozi á hụrụ nà X nke @its_ishaq_khan kwùrù.

Hamas fighter shot down two more helicopter of Israel in Gaza Palestine ✌️#طوفان_الأقصى #อิสราเอล #IsraelUnderAttack #طوفان_الأقصى #طوفان_القدس #อิสราเอล #PalestineUnderAttack #Palestinian #IStandWithIsrael #IsraelAtWar #GazaUnderAttack #Gaza #Hamas pic.twitter.com/N3brnAz5Sx

— Muhammad Ishaq Khan (@ishaq_Mindset) October 8, 2023

Ozi ahụ nwetara ihe nkiri ruru puku iri abụọ n’asaa, ntụnye ọnụ iri abụọ, na nkesa iri na anọ.

ŃDÀBÉRÉ ÓKWU

N’ubọchị asaa nke ọnwa October, ndị agha Hamas sì Gaza bàtá Isreal ibuso isreal agha. Ha sì n’elu, ala, na mmiri wèré bàtá, nke butere ọgbaghara ọhụrụ n’etịti Isreal nà Palestine.

Ka ńwákpò ahụ bịara ná njedebe, ihe ruru mmadụ ótù puku na narị anọ bụ ndị há gburu, ebe mmadụ narị abụọ bụ ndị há nwụ̀chìrì.

Gaza, nke ndị agha Hamas na-achị, bụ obere obodo nọ n’etiti Isreal nà osimiri Mediterranean, nke yana ọdịda anyanwụ ḿbà Isreal nwèrè àgbàtà óbì.

Ndị agha Hamas kpọrọ nwakpo ahụ “Operation Al-Aqsa Storm”. Há sị nà há àkwádólá ya kamgbe afọ abụọ gara-aga.

Ndị isi Hamas kwùrù sị́ nà há tụ̀rụ̀ ogbunigwe karịrị puku ise n’ime Isreal. Há sị̀ nà nke à bụ ibo ubo megide “mmerụ” Isreal merụrụ ebe ekpere Al-Aqsa nke dị nà Jerusalem. Hamas kwukwara nà nya bụ agha bịara ịkwụchiga Isreal ụgwọ màkà ọnwụ ndị Palestine rúrú ọ̀tụ́tụ́ narị.

Isreal, n’aka ǹkè há, ṅụrụ iyi site n’ọnu Benjamin Netanyahu, ónyé prime minister obodo há, nà há ga-ememila ndị agha Hamas. Há si ndị obodo Gaza pụọ be ha màkà na ndị agha Isreali Defence Force (IDF) ga-eji ike wákpò há.

Mana ihe onyonyo ahụ ahụtara na ịntanetị ò nwèrè ihe jikọtara yana ńwákpò Hamas wakporo Isreal?

ŃNYÒCHÁ

Anyị nyochara isi okwu ya bụ onyonyo n’ọba ozi X, nke gosịrị nà ihe nkiri ahụ gazuru ebe niile na ịntanetị n’ụbọchị asaa nke ọnwa October. Nke à bụ ụbọchị Hamas wakporo Isreal n’ike. Onyonyo a bịara bụrụkwa nke dịgoro na ịntanetị ruo kà ekesara ya ọzọ n’ụbọchị iri nke ọnwa October.

Nnyocha ọzọ, nke anyị jiri ngwa ọrụ á na-akpọ reverse image search mé, gosịrị nà ekesara ihe onyonyo ahụ m̀bụ́ n’ụbọchị atọ nke ọnwa October n’ọba ozi YouTube site n’aka Kazinka Warrior, asafe onyonyo egwuregwu.

“Ihe a, abụghị ihe ngosị dị ire. Ọ bụ nnọọ ihe aka mere,” ihe à bụ ihe onyonyo egwuregwu ahụ kwuru.

Nlele ihe mbipụta gásị́rị́ n’asafe egwuregwu ahụ gòsị̀rị̀ onyonyo ndị ọzọ dị ótú ahụ nke Arma 3, ihe egwuruegwu á nà-agba n’etiti ncheputa, dịkà ebe a na-alụ agha nà 2035.

N’afọ 2022, Bohemia Interactive, ndị nwe Arma 3, ebe á na-arụpụta ihe egwuregwu ndị ahụ, bipụtara ókwú sị na onyonyo ahụ dị́ ebeniile na ịntanetị bụ nke si na ihe egwuregwu ha rụpụtara. Há sị nà o metụtara há nà ndị mmadụ na-atụ asị amaghị àmá nà n’ ó sì n’agha Russia na-anụso Ukraine.

Iji weta òkè n’etiti ihe onyonyo egwuregwu nà ihe nkiri agha dị ire, Bohemia Interactive gwara ndị mmadụ kà há lepu anya màkà ihe ngosị n’apụtaghị ihe ọfụma, ngosi ihe n’adịghị ire dịka ịgosị ụfọdụ akụkụ eligwe k’ọnorọ onwe ya, ihe nkiri na-ama jìjìjì, yana nke n’eseteghị ndị mmadụ na-aga íjè ọfụma.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe onyonyo ahụ na-egosị ebe ogbunigwe gbaturu ụgbọelu helikopta abụọ enweghị kà ó sì gbasa agha dị n’etiti Isreal nà Hamas. Ihe ngosị ahụ bụ onyonyo ihe egwuregu ndị Arma 3 rụpụtara.

TAGGED: Hamas, Igbo, Igbo Fact Check, Iseral, palestine, TheCable factcheck

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu December 13, 2023 November 2, 2023
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative…

July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?