Ótú onye na TikTok ekwuola na ndị jihad a gbaala ụlọ ụka ọkụ na mpaghara ụ́gwụ́ nke Naịjiria.
@WakaWakaplanet jiri isi okwu kwụrụ — “mmekpa ahụ ndị ụka arikaricha elu na Naijiria” — were bipụta ihe ngosi ahụ na TikTok, n’ubochi abụọ nke ọnwa Novemba.
E jiri ozị ọzọ na-ekwu na “òtù ndị okpuperechi Allah a gbaala ụlọ ụka ọzọ ọkụ na Naijiria” were bipụta ihe ngosi ahụ.
N’ihe ngosi ahụ, ọtụtụ ụmụ agbobia ndị e chere na ha bụ ụmụ akwụkwọ, ndị yị ákwà akwụkwọ ọjị, ebe ndị ọzọ yị akwa ọcha na ọjị, ka a hụrụ ka ha na-ebe ákwá maka ọkụ ahụ na-gba nụ.
Ihe ngosi ahụ e nwetala ntụnye ọnụ otu narị (100 comments), nkesa otu narị n’iri isii (160 shares), na nkwenye otu nari (1,000 likes).
E bipụtara ihe ngosi ahụ ngwa ngwa onye ịsị ala mba US bụ Donald Trump gwara ndị agha obodo ya ka ha kwado maka obibia ha na Naijiria ịji memịla ndị omemekome na egbu ndị ụka.
Okwu Trump na-abịa ka mkpụrụ ụbọchị ole n’ole gachara dịka o kwuputachara Naijiria nke ugboro abụọ, dịka obodo dara iwu ịchekwa ótụ́ okpurechi maọbụ ọzọ nke a kpọrọ ‘country of particular concern’ n’ihi okwu na a na-egbu ndị okpuperechi ụka na Naijiria.
ŃNYÓCHÁ
CableCheck jiri ígwè nyocha Google Lens were nyocha akụkụ ihe ngosi ahụ ma chọpụta na ọtụtụ ọ́bá ozi ebipụtala ihe ngosi ahụ na Ghana kamgbe ụbọchị iri atọ n’otu nke ọnwa Ọktoba nke afọ 2025.
TV3 Ghana, oba ozi ihe onyonyo dị na Ghana, bipụtara ihe ngosi ahụ na Instagram.
Dịka TV3 Ghana kwụrụ, ọkụ ọgbụgba ahụ bụ na ụlọ akwụkwọ Kwapong Nursing Training College di na Asunafo south district nke mpaghara Ahafo na Ghana ka o mere.
Ọtụtụ ọ́bá nzisa ozi ndị ọzọ bipụtakwara ya bụ ihe ngosi ebe ụlọakwụkwọ ndị nọrsu ahụ na-agba ọkụ. Ị ga-ahuta ozi ndị ahụ ebe a, ebe a n’ebe a.
NCHỊ́KỌ́TÁ
Okwu na ndị jihad gbara ụlọ ụka ọkụ na Naijiria bụ asị, ihe ngosị ahụ bụ na Ghana ka ọ mere.