TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó
Share
Latest News
Bidiyon AI-gyara na Peter Obi ya amfani yana tallata dandalin saka hannun jari
Dem use AI video of Peter Obi take advertise investment platform
AI ni wọ́n fi yí fídíò Peter Obi padà láti polówó ibi ìdókòwò kan
DISINFO ALERT: Obi dismisses photoshopped pictures with Donald Trump, MC Oluomo
FACT CHECK: AI-edited video of Peter Obi used to advertise investment platform
Mbà, á gághị̀ ágbáchị́bị́dó ákántụ̀ ńdị́ Naijiria n’énwéghị́ TIN sị́té Jánúwarị́ 2026
No, Nigerians without TIN no go lose dia bank accounts from January 2026
A’a, ‘yan Najeriya ba tare da TIN ba ba za su rasa damar shiga asusun banki ba daga Janairu 2026
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 24, 2025 5 Min Read
Share

Ị́hé ngosi ebe Peter Obi, onye jiri Labour Party zọ ọkwa onye ịsị ala na 2023, na-ágwá ndị mmadụ ka ha tinye ego ha na ụlọrụ mmụba akụ akpọrọ AfriQuantumX, aputala ihe na soshal midia.

N’ihe ngosi ahụ, Obi na-agwa ndị mmadụ n’ọburu na ha tinye ego ha na AfriQuantumX na ha ga-enweta mmụba nde Naira asaa(N7 million) kwa ọnwa.

Obi, onye bụ bụrụ onye gọvanọ Anambra steetị, kwụrụ n’ihe ngosi ahụ na-emepụtara ọ́bá mmụba ego ahụ na ntụziaka ya ma bụrụkwa nke nwere nkwado gọọmenti etiti.

“Ọ dila k’oga adị, ndị Naijiria kwesịrị ka ha nwe nwere onwe nke akụ n’ụba ha. Onye Naijiria ọbụla, kwesịrị ka ọ mata eziokwu taa. Ị nwere ike ịnweta ihe rụrụ nde Naira asaa (N7 million) kwa ọnwa,” olu ahụ kwụrụ.

“Ịhe karịrị iri puku (10,000) mmadụ akwụsịla ọrụ ha n’ihi na ha achọtala ebe mmụba ego ha.

“Ha lara ezumike ńká n’oge, ugbu a ha na-ebi ofuma. Nke a bu nke pụtara ìhè n’ihi ọ́bá mmụba aku bụ AfriQuantumX, nke nwere nkwado m na nke ọchịchị etiti.”

Ótú asafe a kpọrọ News24 bipụtara ihe ngosi ahụ.

Ozi ahụ dere: “AfriQuantumX— ohere ịkwesghị ịkwe ka ọgbanaghị gị! Jiri puku narị Naira anọ (N400,000) were bido ya, n’ụbọchị asaa ịnweta nde Naira abụọ(2,000,000) n’oba ego gị. Nke a abughi nkwa, ọ bụ ịhe pụtara ìhè nke ndị Naịjirịa rụrụ puku na-enweta. Ohere ebughi ịbụ, ndenye aha ga-emechị na nso-nso a. — mee ngwa ngwa.”

ŃNYÓCHÁ

É tinyere linkị n’ozi ahụ. Ị pịa aka n’ozi ahụ webusitị yiri nke Channels Television, oba nzisa izi ihe onyonyo na Naijiria, ga-emepe mana njiri mara dị na webusitị agaghị ebuga onye ahụ n’asafe nke ezigbo ya.

Webusitị ahụ nwere ihe ngosi Seun Okinbaloye, onye nta akụkọ nke ihe omume Politics Today na Channel Television, ebe ọ na ajụ Peter Obi ajụjụ ọnụ.

E nwòghàrị̀rị̀ ihe ngosi ahụ k’odi ka Okinbaloye na Obi ana-ekwu maka oba mmụba aku ahu.

Ihe ọzọ mere anyị jiri mara na ihe ngosi bụ adigboroja bụ n’ọnụ Obi anaghị emegharị — njiri mara ihe ngosi e jiri AI nwogharia.

Anya anyị nyomiri n’ihu Obi gosịrị na-enwere ihe a tụkwasịrị n’ọnụ ya.

Mgbe CableCheck jiri ígwè nyocha Google Lens were nyochara akụkụ ihe ngosi ahụ anyị chọpụtara na ihe ngosi anyị si na okwu Obi nyere n’ọnwa May nke afọ 2017  na ihe mmeme a kpọrọ ‘The Platform Nigeria’.

Ụlọ ụka Covenant Nation hibere ihe mmeme ahụ iji nwe mkpakorita ụka gbasara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe ndị ọzọ n’emetuta mmadụ.

Ị nwere ịke ịhuta ihe ngosi nke ezigbo ya ebe a.

Ihe ngosi akaebe dị na webusitị ahụ bụ nke ejiri AI mepụta.

Ọchịchọ anyị jiri aha AfriQuantumX mee gosiri n’otu ọ́bá akụ Ghana akpọrọ GCB agọnaghịla ọ́bá mmụba aku ahụ.

Ụlọ akụ ahụ kwụrụ na AfriQuantumX jiri njiri mara ha were na-arata ndị mmadụ.

“GCB Bank PLC chọrọ ịji ohere a ágwá ndị mmadụ na ozị nke na-efegharị na soshal midia nke ji GCB ere ọ́bá mmụba aku a kpọrọ AfriQuantumX bụ adigboraja,” Ozi ahụ kwụrụ.

“Ozi ahụ ji njiri mara ụlọ akụ GCB n’ụzọ n’ezighi ezi, ma na àgwà ndị mmadụ ka ha banye na webusitị na abụghị nke anyị.

“GCB enweghi mmụba aku dị otú ahụ, anyị na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara itinye ozi gbasara ha na webusitị ahụ maọbụ ti ye ego ha na oba nchekwa aku ahụ.”

Ihe AfriQuantumX mere site n’iji ihu Obi na njiri mara ụlọ akụ Ghana na egosi na ha bụ ndị wayo.

NCHỊ́KỌ́TÁ

Ị́hé ngósị́ ébé Obi na-ayo ndị mmadụ ka ha tinye ego ha na AfriQuantumX bu asiị E mepụtara ihe ngosi ahụ k’odughe ndị mmadụ.

TAGGED: AfriQuantumX, Factcheck in igbo, news in Igbo, peter obi

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 24, 2025 September 24, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Bidiyon AI-gyara na Peter Obi ya amfani yana tallata dandalin saka hannun jari

Bidiyon da ke nuna Peter Obi, dan takarar shugaban kasa na jam'iyyar kwadago (LP) a…

September 24, 2025

Dem use AI video of Peter Obi take advertise investment platform

One video wey show as Peter Obi, presidential candidate of di Labour Party (LP) for…

September 24, 2025

AI ni wọ́n fi yí fídíò Peter Obi padà láti polówó ibi ìdókòwò kan

Fídíò kan tí ó ní Peter Obi, olùdíje fún ipò Ààrẹ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà nínú…

September 24, 2025

DISINFO ALERT: Obi dismisses photoshopped pictures with Donald Trump, MC Oluomo

Peter Obi, presidential candidate of Labour Party in 2023, has dismissed the doctored pictures showing…

September 24, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Bidiyon AI-gyara na Peter Obi ya amfani yana tallata dandalin saka hannun jari

Bidiyon da ke nuna Peter Obi, dan takarar shugaban kasa na jam'iyyar kwadago (LP) a zaben 2023, yana tallata wani…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

Dem use AI video of Peter Obi take advertise investment platform

One video wey show as Peter Obi, presidential candidate of di Labour Party (LP) for di 2023 elections, dey allegedly…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

AI ni wọ́n fi yí fídíò Peter Obi padà láti polówó ibi ìdókòwò kan

Fídíò kan tí ó ní Peter Obi, olùdíje fún ipò Ààrẹ orílẹ̀ èdè Nàìjíríà nínú ẹgbẹ́ òsèlú Labour Party (LP)…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 24, 2025

DISINFO ALERT: Obi dismisses photoshopped pictures with Donald Trump, MC Oluomo

Peter Obi, presidential candidate of Labour Party in 2023, has dismissed the doctored pictures showing him with United States President…

Fact CheckTop Stories
September 24, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?