TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó
Share
Latest News
Anambra guber: Six misconceptions about BVAS, IREV voters should know
Ṣé àwọn ọmọ ológun Nàìjíríà lo àwòrán tó ti pẹ́ gẹ́gẹ́bí àwòrán iṣẹ́ igbanisilẹ̀ tí wọ́n se láìpẹ́ yìí?
Na true sey di Nigerian army use old foto for recent rescue operation?
Shin sojojin Najeriya sun yi amfani da tsofaffin hotuna don aikin ceto kwanan nan?
Ọ̀rọ̀ tí Tinubu sọ lórí owó orí tí Trump fi síta ni àwọn sa sìse pè ní ọ̀rọ̀ Ààrẹ Nàìjíríà lórí àwọn tí Amẹ́ríkà ń ṣọ́
Tinubu speech ontop Trump tariff dey misrepresented as recent comment ontop US watchlist
Maganan Tinubu akan sharhi na baya-bayan nan akan jerin sa ido na Amurka
FACT CHECK: Did Nigerian army use old pictures for recent rescue operation?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Ị́hé ńgósị́ Peter Obi é jị̀rị̀ AI nwógháriá bụ̀ ńkè é jị̀-éré ọ́bá mmụ́bá égó

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 24, 2025 5 Min Read
Share

Ị́hé ngosi ebe Peter Obi, onye jiri Labour Party zọ ọkwa onye ịsị ala na 2023, na-ágwá ndị mmadụ ka ha tinye ego ha na ụlọrụ mmụba akụ akpọrọ AfriQuantumX, aputala ihe na soshal midia.

N’ihe ngosi ahụ, Obi na-agwa ndị mmadụ n’ọburu na ha tinye ego ha na AfriQuantumX na ha ga-enweta mmụba nde Naira asaa(N7 million) kwa ọnwa.

Obi, onye bụ bụrụ onye gọvanọ Anambra steetị, kwụrụ n’ihe ngosi ahụ na-emepụtara ọ́bá mmụba ego ahụ na ntụziaka ya ma bụrụkwa nke nwere nkwado gọọmenti etiti.

“Ọ dila k’oga adị, ndị Naijiria kwesịrị ka ha nwe nwere onwe nke akụ n’ụba ha. Onye Naijiria ọbụla, kwesịrị ka ọ mata eziokwu taa. Ị nwere ike ịnweta ihe rụrụ nde Naira asaa (N7 million) kwa ọnwa,” olu ahụ kwụrụ.

“Ịhe karịrị iri puku (10,000) mmadụ akwụsịla ọrụ ha n’ihi na ha achọtala ebe mmụba ego ha.

“Ha lara ezumike ńká n’oge, ugbu a ha na-ebi ofuma. Nke a bu nke pụtara ìhè n’ihi ọ́bá mmụba aku bụ AfriQuantumX, nke nwere nkwado m na nke ọchịchị etiti.”

Ótú asafe a kpọrọ News24 bipụtara ihe ngosi ahụ.

Ozi ahụ dere: “AfriQuantumX— ohere ịkwesghị ịkwe ka ọgbanaghị gị! Jiri puku narị Naira anọ (N400,000) were bido ya, n’ụbọchị asaa ịnweta nde Naira abụọ(2,000,000) n’oba ego gị. Nke a abughi nkwa, ọ bụ ịhe pụtara ìhè nke ndị Naịjirịa rụrụ puku na-enweta. Ohere ebughi ịbụ, ndenye aha ga-emechị na nso-nso a. — mee ngwa ngwa.”

ŃNYÓCHÁ

É tinyere linkị n’ozi ahụ. Ị pịa aka n’ozi ahụ webusitị yiri nke Channels Television, oba nzisa izi ihe onyonyo na Naijiria, ga-emepe mana njiri mara dị na webusitị agaghị ebuga onye ahụ n’asafe nke ezigbo ya.

Webusitị ahụ nwere ihe ngosi Seun Okinbaloye, onye nta akụkọ nke ihe omume Politics Today na Channel Television, ebe ọ na ajụ Peter Obi ajụjụ ọnụ.

E nwòghàrị̀rị̀ ihe ngosi ahụ k’odi ka Okinbaloye na Obi ana-ekwu maka oba mmụba aku ahu.

Ihe ọzọ mere anyị jiri mara na ihe ngosi bụ adigboroja bụ n’ọnụ Obi anaghị emegharị — njiri mara ihe ngosi e jiri AI nwogharia.

Anya anyị nyomiri n’ihu Obi gosịrị na-enwere ihe a tụkwasịrị n’ọnụ ya.

Mgbe CableCheck jiri ígwè nyocha Google Lens were nyochara akụkụ ihe ngosi ahụ anyị chọpụtara na ihe ngosi anyị si na okwu Obi nyere n’ọnwa May nke afọ 2017  na ihe mmeme a kpọrọ ‘The Platform Nigeria’.

Ụlọ ụka Covenant Nation hibere ihe mmeme ahụ iji nwe mkpakorita ụka gbasara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe ndị ọzọ n’emetuta mmadụ.

Ị nwere ịke ịhuta ihe ngosi nke ezigbo ya ebe a.

Ihe ngosi akaebe dị na webusitị ahụ bụ nke ejiri AI mepụta.

Ọchịchọ anyị jiri aha AfriQuantumX mee gosiri n’otu ọ́bá akụ Ghana akpọrọ GCB agọnaghịla ọ́bá mmụba aku ahụ.

Ụlọ akụ ahụ kwụrụ na AfriQuantumX jiri njiri mara ha were na-arata ndị mmadụ.

“GCB Bank PLC chọrọ ịji ohere a ágwá ndị mmadụ na ozị nke na-efegharị na soshal midia nke ji GCB ere ọ́bá mmụba aku a kpọrọ AfriQuantumX bụ adigboraja,” Ozi ahụ kwụrụ.

“Ozi ahụ ji njiri mara ụlọ akụ GCB n’ụzọ n’ezighi ezi, ma na àgwà ndị mmadụ ka ha banye na webusitị na abụghị nke anyị.

“GCB enweghi mmụba aku dị otú ahụ, anyị na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara itinye ozi gbasara ha na webusitị ahụ maọbụ ti ye ego ha na oba nchekwa aku ahụ.”

Ihe AfriQuantumX mere site n’iji ihu Obi na njiri mara ụlọ akụ Ghana na egosi na ha bụ ndị wayo.

NCHỊ́KỌ́TÁ

Ị́hé ngósị́ ébé Obi na-ayo ndị mmadụ ka ha tinye ego ha na AfriQuantumX bu asiị E mepụtara ihe ngosi ahụ k’odughe ndị mmadụ.

TAGGED: AfriQuantumX, Factcheck in igbo, news in Igbo, peter obi

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 24, 2025 September 24, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Anambra guber: Six misconceptions about BVAS, IREV voters should know

Elections in Nigeria have always been defined by controversies. Electoral malpractice, ranging from ballot snatching…

November 7, 2025

Ṣé àwọn ọmọ ológun Nàìjíríà lo àwòrán tó ti pẹ́ gẹ́gẹ́bí àwòrán iṣẹ́ igbanisilẹ̀ tí wọ́n se láìpẹ́ yìí?

Ní ọjọ́ ajé, àwọn òṣìṣẹ́ ológun orílẹ̀ èdè Nàìjíríà fi ọ̀rọ̀ kan síta pẹ̀lú àwọn…

November 5, 2025

Na true sey di Nigerian army use old foto for recent rescue operation?

On Monday, di Nigerian army publish one statement togeda wit some pictures across dia official…

November 5, 2025

Shin sojojin Najeriya sun yi amfani da tsofaffin hotuna don aikin ceto kwanan nan?

A ranar Litinin din da ta gabata ne rundunar sojin Najeriya ta fitar da sanarwa…

November 5, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ṣé àwọn ọmọ ológun Nàìjíríà lo àwòrán tó ti pẹ́ gẹ́gẹ́bí àwòrán iṣẹ́ igbanisilẹ̀ tí wọ́n se láìpẹ́ yìí?

Ní ọjọ́ ajé, àwọn òṣìṣẹ́ ológun orílẹ̀ èdè Nàìjíríà fi ọ̀rọ̀ kan síta pẹ̀lú àwọn àwòrán lórí àwọn ohun ìgbàlódé…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 5, 2025

Na true sey di Nigerian army use old foto for recent rescue operation?

On Monday, di Nigerian army publish one statement togeda wit some pictures across dia official social media platform to announce…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 5, 2025

Shin sojojin Najeriya sun yi amfani da tsofaffin hotuna don aikin ceto kwanan nan?

A ranar Litinin din da ta gabata ne rundunar sojin Najeriya ta fitar da sanarwa tare da wasu hotuna a…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 5, 2025

Ọ̀rọ̀ tí Tinubu sọ lórí owó orí tí Trump fi síta ni àwọn sa sìse pè ní ọ̀rọ̀ Ààrẹ Nàìjíríà lórí àwọn tí Amẹ́ríkà ń ṣọ́

Ní ọjọ́ ìsinmi, Politics Nigeria, wẹbusaiti kan fi fídíò tí kò pé ìṣẹ́jú kan síta lórí Facebook, ohun ìgbàlódé íbaraẹnisọrẹ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
November 5, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?