TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńgósị́ ébé Thomas Partey tàrà ị́kpa óké àgbụ̀rụ̀ ụ́tá maka íkpé àkwàmìkó n’íké bụ̀ áká ọ́rụ AI
Share
Latest News
Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI
AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa
Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á
Bidiyon da ke nuna ‘gada ta rushe a Nasarawa’ AI ce ta samar
FACT CHECK: No, Nwifuru didn’t suspend officials for failing to attend child’s birthday party
FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated
MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńgósị́ ébé Thomas Partey tàrà ị́kpa óké àgbụ̀rụ̀ ụ́tá maka íkpé àkwàmìkó n’íké bụ̀ áká ọ́rụ AI

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published July 11, 2025 4 Min Read
Share

Ótù ihe ngosị ebe Thomas Partey, onye midfielder na onye na-akụrụ Arsnal bọọlụ, nà-àtá ị́kpa óké àgbụ̀rụ̀ ụ́tá maka íkpé ịkwaso nwanyị iko n’ike apụtala ihe na soshal midia.

N’ihe ngosị ahụ, ólú nke atụkwasara n’elu ihe ngosị Partey ebe o na-ekwu na ebubo akwamiko n’ike e bòrò ya bụ maka na ọ jụrụ ka nya na Arsenal banye na nkwekọrịta akum bọọlụ ọhụrụ.

“E meghị m ya, otela mgbe ha jiri chọọ ibo m na á kwasoro m nwanyị iko n’ike, mana ihe a bụ ihe na-eme mgbe ị bụ onye agbụrụ ojii ma jụ ịbanye na nkwekọrịta ọhụrụ,” olu ahụ kwụrụ.

“Mana ọ ga akara m mma na a gara m nga kama m ga akụrụ Arsenal bọọlụ ọzọ.”

E bipụtara ịhe ngosị ahụ na X, Facebook na TikTok.

CableCheck chọpụtara na ọtụtụ ihe ngosị dị ka ya sì sitere n’asafe TikTok a kpọrọ @sserona12.

Asafe a, nke nwere ndị na-eso ya dị ótù pụku narị na iri ise (150,000 followers), bipụtara nya bụ ihe ngosị n’ụbọchị Saturday.

A screenshot of the video on TikTok

Isi okwu ya kwuru: “Thomas Partey bụ onye ana-ebo ebubo na ọ kwasoro nwanyị ịko n’ike”.

Ihe ngosị ahụ enwetala nkiri karịrị nde ise (50 million views).

E bipụtakwara ihe ngosị ahụ ebe a, n’ebe a.

Ihe ngosị a pụtara ìhè dịka a kpọpụrụ Partey ụlọ ikpe n’ebubo ise na ọ kwasoro nwanyị iko n’ike nakwa na ọ kpasoro ụmụ nwanyị omume dịka ọ̀ chọ̀rọ̀ ịkwasoya ha iko n’ike.

Dịka ndị uwe ojii UK kwuru, o mere mpụ ndị a n’etiti afọ 2021 na 2022.

Ebubo a metụtara ụmụ nwanyị atọ ndị kwuru na nya bụ nwaamaadị kwasoro ha iko n’ike.

Partey ga-apụta n’ihu ụlọ ikpe Westminster Magistrates Court n’ụbọchị ise nke ọnwa August.

Nkwekọrịta nke Partey na Arsenal nwere bịara na njedebe n’ụbọchị iri atọ nke ọnwa June nke afọ 2025.

Akụkọ àsị̀rị̀ kọ̀rọ̀ nà nkwekọrịta nke Partey na nya bụ òtù akum bọọlụ nọ́ nà North London nwere ḿgbátị́. Nke a pụtara na Partey enweghị òtù ọbụla ọ na-akụrụ bọọlụ.

ŃNYÒCHÁ

CableCheck chọpụtara na ọnụ Partey n’ihe ngosị ahụ apụtachaghị ihe ọfụma. Nke pụtara na e jiri olu dịka nke ya were nwogharịa ihe ngosị ahụ.

Ịmata ebe e sere ihe ngosị nke ezigbo ya, CableCheck jiri Ngwa ọrụ Google Lens were nyochaa ya.

Anyị chọpụtara na e bipụtara ihe ngosị nke ezigbo ya Instagram n’ụbọchị asatọ nke ọnwa October nke afọ 2020, nwantiti oge ọ kwụsịrị nkwekọrịta ya na Atletico Madrid, ma kweta ịkụrụ Arsenal bọọlụ.

Na ihe ngosị nke ezigbo, Partey na-agwa ndị nsoye Arsenal na óbì dị ya ụtọ ịgbara òtù ahụ bọọlụ.

Ụfọdụ ọba nzisa ozi bipụtara nya bụ ihe ngosị.

Mfokasị anyị mere gosịrị na Partey atụnyebeghị ọnụ na ebubo akwamiko n’ike e boro ya.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe ngosị ebe Partey na-ebo okwu gbasara akwamiko asị n’omere n’elu ịkpa oke agbụrụ bụ

Ihe ngosị ebe Thomas Partey tàrà ị́kpa óké àgbụ̀rụ̀ ụ́tá maka ikpe akwamiko n’ike ya bụ̀ nke ejiri AI nwogharịa.

TAGGED: fact check in Igbo, news in Igbo, Thomas Partey

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu July 11, 2025 July 11, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI

One video wey show as bridge dey collapse dey waka for social media, especially Facebook.…

July 29, 2025

AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa

Àwọn ènìyàn ti ń pín fídíò kan tí ó ṣe àfihàn afárá tí ó wó…

July 29, 2025

Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á

Ótù ihe ngosị na-agbasa na sosha midia, ma na-egosị ebe àkwà mmịrị na-ada. A kọwara…

July 29, 2025

Bidiyon da ke nuna ‘gada ta rushe a Nasarawa’ AI ce ta samar

Bidiyon da ke nuna yadda wata gada ta ruguje ta ke yawo a shafukan sada…

July 29, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Video wey show as ‘bridge collapse for Nasarawa’ na AI

One video wey show as bridge dey collapse dey waka for social media, especially Facebook. For di five-second video, di…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 29, 2025

AI ni wọ́n fi se fídíò afárá ti wọ́n ní ó wó ní Nasarawa

Àwọn ènìyàn ti ń pín fídíò kan tí ó ṣe àfihàn afárá tí ó wó lórí àwọn ohun ìgbàlódé íbaraẹnise…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 29, 2025

Íhé ńgósị́ ébé àkwà ḿmíri nà-ádà bụ̀ ǹkè é jìrì AI wòghárị́á

Ótù ihe ngosị na-agbasa na sosha midia, ma na-egosị ebe àkwà mmịrị na-ada. A kọwara na ọ bụ na India…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 29, 2025

Bidiyon da ke nuna ‘gada ta rushe a Nasarawa’ AI ce ta samar

Bidiyon da ke nuna yadda wata gada ta ruguje ta ke yawo a shafukan sada zumunta musamman a Facebook a…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 29, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?