TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńgósị́ ébé Peter Obi sékpù àlà n’íhú Tinubu bụ̀ ǹkè é jìrì AI nwóghàrị̀á
Share
Latest News
FACT CHECK: Video wey show sey gunmen bin seize armoured vehicles na for Burkina Faso — NO BE Nigeria
FACT CHECK: Video showing people using ropes to cross river NOT from Nigeria
Burkina Faso ni ìṣẹ̀lẹ̀ nínú fídíò tó sàfihàn àwọn agbébọn pẹ̀lú ọkọ̀ ogun jíjà ti ṣẹlẹ̀ — kìí se Nàìjíríà
Íhé ńgósị́ ébé ndị́ ómékómè nà-éwèghárá ụ́gbọ́àlà ndị́ ághá sì Burkina Faso
Bidiyon da ke nuna yan ta’adda na kwace motoci masu sulke daga Burkina Faso – BA Najeriya ba
FACT CHECK: Video showing gunmen seizing armoured vehicle from Burkina Faso — NOT Nigeria
Viral post wey claim sey dem don pass ‘Cybercrimes Act 2025’ no correct
Ózí na-ekwu nà é mepụ̀tálá ìwú megidere cybercrime bụ̀ àsị́
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńgósị́ ébé Peter Obi sékpù àlà n’íhú Tinubu bụ̀ ǹkè é jìrì AI nwóghàrị̀á

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published May 24, 2025 4 Min Read
Share

Ótù ihe ngosị nke a na-ekesa na soshal midia na-egosị ebe Peter Obi, onye jiri Labour Party zọ ọkwa onye isi ala n’afọ 2023, sekpu ala n’ihu onye isi Ala Bola Tinubu.

Ndị ji soshal midia kesa nya bụ ihe ngosị kọwara na Obi sekpuru ala were yọ Tinubu n’ụbọchị Pope Leo nke iri n’anọ were oche dịka onye isi ụlọ ụka Catholic na Rome, isi obodo Italy.

N’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa December, otu onye na Facebook a kpọrọ Atu Lazarus bipụtara nya bụ ihe ngosị nke isi okwu ya kwuru: “Peter eritala ịhụnanya obi m. O sekpurula nna m ala, o kwesịrị ka ọ leghachie anya azụ, ma tikọọ aka ọnụ iji nyere Tinubu aka idozi Naijiria.

Onye ọzọkwa a kpọrọ Pankwaye Bulus Kanam bipụtakwara nya bụ ihe ngosị, ma dee dịka isiokwu ya: “Peter Obi sekpuru n’ihu Tinubu n’ụlọ ụka Vatican. Ótù Obi nke na-ekwu na ọ chọrọ itikota aka wepụ Tinubu.”

E bipụtara nya bụ ihe ngosị ebe a, ebe a, n’ebe a.

ŃKỌ́WÁ ÁKỤ́KỌ́

Mmeme ihibe Pope Leo dịka onye isi ụlọ ụka Roman Catholic mere na Saint Peter’s Square nke Vatican City, n’ụbọchị iri n’asatọ nke ọnwa May.

A họpụtara Leo dịka onye isi ndu ụlọ ụka Catholic n’ụbọchị asatọ nke ọnwa May, n’ihi ọnwụ Pope Francis.

Ọtụtụ ndị ǹdú obodo, dịka Tinubu, bịara nya bụ mmemme.

Na nya bụ mmemme, Tinubu zutere ma kelee Kayode Fayemi, onye bụburu onye gọvanọ Ekiti steeti na Obi, ndị bụ ezigbo ndị ụka Catholic.

Bayo Onanuga, onye nkwuchita ọnụ Tinubu, biputara ozi ótú Tinubu siri kelee Obi na Fayemi n’ọgbakọ ahụ.

Onanuga kwuru na Fayemi hụrụ Tinubu ebe ya na ndị ǹdú ọzọ dụnọ ala, ma sị Obi ka ha ga kelee ya.

“Dịka ha rutere ebe Tinubu nọ, Fayermi bidoro mkpakọrịta ụka n’etiti Obi na Tinubu. O kwuru: “Onye isiala, anyị n’anabata gị n’ụlọ ụka anyị, daalụ kwa maka ịnabata nzịte Pope’, Onye isi ala, onye nwere otu osi akpa ndị mmadụ ọchị kwuru: ọ bụ m kwesịrị ịnabata gị na Obi, n’ihi na ọ bụ m bụ onye isi ndị niile si Naijiria bịa ọgbakọ a. Okwu Tinubu nke Obi kwetara tọrọ ya ọchị,” Onanuga bipụtara na X.

Onanuga biputakwara ihe ngosị mmadụ atọ ahụ  nke ha sere n’ọgbakọ ahụ.

Obi biputakwara ozi n’asafe X ebe ọ kwuru na o kelere Tinubu na Fayemi na mmemme ahụ.

Ihe ngosị na ihe nkiri nke Tinubu na ndị isi ala ahụ bịakwara pụta ìhè na soshal midia, dịka e mechara nya bụ mmemme.

Nsọnazụ nya bụ mmemme kpalitere nrụrịtaụka n’etiti ndị nkwado Tinubu na Obi.

Dịka nke a na-eme ihe ngosị a e nwogharịrị bịaziri pụta ìhè na soshal midia.

ŃNYÒCHÁ

Ị lezie nya bụ ihe ngosị anya ọfụma, ị ga-ahụ na e nwogharịrị ya ka ọ dabata n’okwu a na-enwe gbasara mmadụ abụọ ahụ.

Na ihe ngosị ahụ, aka Obi ka o sekpu ala dịka a sụkwụnyere ya asụkwịnye — nke na-egosị na a kpachara anya nwogharịa ya.

Nnyocha ọzọ anyị mere gosịrị na ihe ngosị nke ezigbo ya bụ nke Olusegun Dada, onye enyemaka pụrụ iche nye Tinubu n’ihe gbasara soshal mịdia, biputara na asafe X ya n’ụbọchị iri n’asatọ nke Ọnwa May.

N’ihe ngosị ahu, a hụrụ ka Tinubu dụnọ ala n’ihu oche, ebe Obi na Fayemi na amatị anya ịhụ ma kelee onye isiala.

Ozi Valentine Obienyem, onye nkwuchita ọnụ Obi, biputara kwuru na nya bụ ozi bụ nke ejiri AI nwogharịa.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe ngosị ebe obi sekpu ala n’ihu Tinubu na Rome bụ nke e jiri AI nwogharịa.

TAGGED: Bola Tinubu, Factcheck in igbo, news in Igbo, peter obi, Pope Leo XIV's inauguration

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu May 24, 2025 May 24, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video wey show sey gunmen bin seize armoured vehicles na for Burkina Faso — NO BE Nigeria

Some pesin for social media don dey put Naija name on top one video wey…

September 3, 2025

FACT CHECK: Video showing people using ropes to cross river NOT from Nigeria

On August 9, a Facebook user identified as Asare Obed posted a video showing people…

September 3, 2025

Burkina Faso ni ìṣẹ̀lẹ̀ nínú fídíò tó sàfihàn àwọn agbébọn pẹ̀lú ọkọ̀ ogun jíjà ti ṣẹlẹ̀ — kìí se Nàìjíríà

Àwọn ènìyàn kan tí wọ́n ń lo ohun íbaraẹnise orí ayélujára tí sọ pé fidio…

September 2, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ndị́ ómékómè nà-éwèghárá ụ́gbọ́àlà ndị́ ághá sì Burkina Faso

Ótù ihe ngosi ebe ndị ojiegbe egbu na-ákụ̀rụ́ ụgbọala ndị agha bụ nke ndị ji…

September 2, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

FACT CHECK: Video wey show sey gunmen bin seize armoured vehicles na for Burkina Faso — NO BE Nigeria

Some pesin for social media don dey put Naija name on top one video wey show some men wey mount…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 3, 2025

Burkina Faso ni ìṣẹ̀lẹ̀ nínú fídíò tó sàfihàn àwọn agbébọn pẹ̀lú ọkọ̀ ogun jíjà ti ṣẹlẹ̀ — kìí se Nàìjíríà

Àwọn ènìyàn kan tí wọ́n ń lo ohun íbaraẹnise orí ayélujára tí sọ pé fidio kan tí ó sàfihàn àwọn…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 2, 2025

Íhé ńgósị́ ébé ndị́ ómékómè nà-éwèghárá ụ́gbọ́àlà ndị́ ághá sì Burkina Faso

Ótù ihe ngosi ebe ndị ojiegbe egbu na-ákụ̀rụ́ ụgbọala ndị agha bụ nke ndị ji soshal midia ebipụta ozi sịrị…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 2, 2025

Bidiyon da ke nuna yan ta’adda na kwace motoci masu sulke daga Burkina Faso – BA Najeriya ba

Wani faifan bidiyo da ke nuna yadda wasu ‘yan bindiga ke karbar motocin sulke na da alaka da wani lamari…

CHECK AM FOR WAZOBIA
September 2, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?