Ótù ihe ngosị nke a na-ekesa na soshal midia na-egosị ebe Peter Obi, onye jiri Labour Party zọ ọkwa onye isi ala n’afọ 2023, sekpu ala n’ihu onye isi Ala Bola Tinubu.
Ndị ji soshal midia kesa nya bụ ihe ngosị kọwara na Obi sekpuru ala were yọ Tinubu n’ụbọchị Pope Leo nke iri n’anọ were oche dịka onye isi ụlọ ụka Catholic na Rome, isi obodo Italy.
N’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa December, otu onye na Facebook a kpọrọ Atu Lazarus bipụtara nya bụ ihe ngosị nke isi okwu ya kwuru: “Peter eritala ịhụnanya obi m. O sekpurula nna m ala, o kwesịrị ka ọ leghachie anya azụ, ma tikọọ aka ọnụ iji nyere Tinubu aka idozi Naijiria.
Onye ọzọkwa a kpọrọ Pankwaye Bulus Kanam bipụtakwara nya bụ ihe ngosị, ma dee dịka isiokwu ya: “Peter Obi sekpuru n’ihu Tinubu n’ụlọ ụka Vatican. Ótù Obi nke na-ekwu na ọ chọrọ itikota aka wepụ Tinubu.”
E bipụtara nya bụ ihe ngosị ebe a, ebe a, n’ebe a.
ŃKỌ́WÁ ÁKỤ́KỌ́
Mmeme ihibe Pope Leo dịka onye isi ụlọ ụka Roman Catholic mere na Saint Peter’s Square nke Vatican City, n’ụbọchị iri n’asatọ nke ọnwa May.
A họpụtara Leo dịka onye isi ndu ụlọ ụka Catholic n’ụbọchị asatọ nke ọnwa May, n’ihi ọnwụ Pope Francis.
Ọtụtụ ndị ǹdú obodo, dịka Tinubu, bịara nya bụ mmemme.
Na nya bụ mmemme, Tinubu zutere ma kelee Kayode Fayemi, onye bụburu onye gọvanọ Ekiti steeti na Obi, ndị bụ ezigbo ndị ụka Catholic.
Bayo Onanuga, onye nkwuchita ọnụ Tinubu, biputara ozi ótú Tinubu siri kelee Obi na Fayemi n’ọgbakọ ahụ.
Onanuga kwuru na Fayemi hụrụ Tinubu ebe ya na ndị ǹdú ọzọ dụnọ ala, ma sị Obi ka ha ga kelee ya.
“Dịka ha rutere ebe Tinubu nọ, Fayermi bidoro mkpakọrịta ụka n’etiti Obi na Tinubu. O kwuru: “Onye isiala, anyị n’anabata gị n’ụlọ ụka anyị, daalụ kwa maka ịnabata nzịte Pope’, Onye isi ala, onye nwere otu osi akpa ndị mmadụ ọchị kwuru: ọ bụ m kwesịrị ịnabata gị na Obi, n’ihi na ọ bụ m bụ onye isi ndị niile si Naijiria bịa ọgbakọ a. Okwu Tinubu nke Obi kwetara tọrọ ya ọchị,” Onanuga bipụtara na X.
Onanuga biputakwara ihe ngosị mmadụ atọ ahụ nke ha sere n’ọgbakọ ahụ.
Obi biputakwara ozi n’asafe X ebe ọ kwuru na o kelere Tinubu na Fayemi na mmemme ahụ.
Ihe ngosị na ihe nkiri nke Tinubu na ndị isi ala ahụ bịakwara pụta ìhè na soshal midia, dịka e mechara nya bụ mmemme.
Nsọnazụ nya bụ mmemme kpalitere nrụrịtaụka n’etiti ndị nkwado Tinubu na Obi.
Dịka nke a na-eme ihe ngosị a e nwogharịrị bịaziri pụta ìhè na soshal midia.
ŃNYÒCHÁ
Ị lezie nya bụ ihe ngosị anya ọfụma, ị ga-ahụ na e nwogharịrị ya ka ọ dabata n’okwu a na-enwe gbasara mmadụ abụọ ahụ.
Na ihe ngosị ahụ, aka Obi ka o sekpu ala dịka a sụkwụnyere ya asụkwịnye — nke na-egosị na a kpachara anya nwogharịa ya.
Nnyocha ọzọ anyị mere gosịrị na ihe ngosị nke ezigbo ya bụ nke Olusegun Dada, onye enyemaka pụrụ iche nye Tinubu n’ihe gbasara soshal mịdia, biputara na asafe X ya n’ụbọchị iri n’asatọ nke Ọnwa May.
N’ihe ngosị ahu, a hụrụ ka Tinubu dụnọ ala n’ihu oche, ebe Obi na Fayemi na amatị anya ịhụ ma kelee onye isiala.
Ozi Valentine Obienyem, onye nkwuchita ọnụ Obi, biputara kwuru na nya bụ ozi bụ nke ejiri AI nwogharịa.
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Ihe ngosị ebe obi sekpu ala n’ihu Tinubu na Rome bụ nke e jiri AI nwogharịa.