TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńgósị́ ébé ózú ńdị́ mmadụ̀ nọ n’àlà ílì ọ̀hà ésighị nà Naijiria
Share
Latest News
Did Tinubu attend same school as Alexander Zingman? Here is what we know
FACT CHECK: No, Nigeria didn’t deploy peace support mission to Israel
FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?
FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?
FACT CHECK: Ndume erred. 22 governors didn’t endorse Jonathan in 2015
Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé
Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá
No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńgósị́ ébé ózú ńdị́ mmadụ̀ nọ n’àlà ílì ọ̀hà ésighị nà Naijiria

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 11, 2024 5 Min Read
Share

Ótù ihe nkiri na-egosị ózú mmadụ n’elu ibe ya n’ala ili dị obosara bụ nke a sịrị na ọ sitere na Naijiria.

Na ụbọchị iri atọ nke ọnwa August, ótù asafe na X nke aha ya bụ @emmasocket bipụtara ihe ngosị ebe ụmụ nwoke yì uwe ndị soja, na-agba ndị na-agba ọsọ egbe.

Asafe ahụ nwere ihe ngosị Simon Ekpa, onye na-ekwupụta onwe ya dịka onye na-eso ụzọ Nnamdi Kanu, onye ndu ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) nọ na nga.

N’ihe ngosị a esere na mpaghara na-enweghị mmadụ ọbụla na ya, a hụrụ ọtụtụ ozu ndị mmadụ juru n’ala ili.

“Ka ụwa mara agha nzuzo na-eme na ala Biafra,” onye a biputara na X.

“Anyị enweghịzị ike ịnagide nke a ọzọ. Naanị ụzọ esi apụta n’ara ọgbụgba a bụ ka obodo a bụ ogige ụmụ anụmanụ a na-akpọ Naijiria ikewa. BIAFRAN n’ụwa niile @simon_ekpa na ndị otu kabinet ya nọ ebe a iji nyere anyị aka.”

Dịka oge e dere akụkọ a, ozi ahụ enwetala ihe karịrị nkiri otu puku (1000 views), nkwenye iri asaa n’isii (76 likes), na nkesa iri isii (60 retweets).

N’ụbọchị iri atọ n’otu nke ọnwa August, @AmadiohaOd3671, otu asafe na X nke nwere nnukwu ndị na-ege ya ntị kesara nya bụ ihe ngosị ma kwuo sị na “atụmatụ ha abụghị naanị ime ka obodo niile bụrụ ndị okpuperechi Allah, kama ọ bu ịnakọrọcha ala niile yana ịchị Niajiria.”

N’agbanyeghị na asafe ahụ ekwughị onye ọ na amaikpe site na mbipụta ahụ, ọtụtụ okwu n’oge gara-aga egosịla n’ótú ọnọdụ okpukperechi nke onye isi ala na osote ya bụ mbo ime ka Niajiria bụrụ obodo okpukperechi Allah.

Ozi ahụ enwetala nkirị ruru puku iri anọ na atọ na ụma narị atọ (48.3k views), nkesa narị asatọ na iri na itolu (819 retweets), ntụnye ọnụ narị isii na iri abụọ n’asaa (627 comments), yana nchekwa ịgụ mgbe ọzọ na nkwenye kariri otu narị (100 likes and bookmark)

Mànà ògbúgbú ndị mmadụ à ò mèrè na Naijiria?

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

Iji chọpụta mgbe mbụ ihe ngosị a pụtara, TheCable jiri ngwa ọrụ Google Reverse Image Search were nyochaa ọtụtụ akụkụ nke ihe ngosị ahụ.

Ihe anyị chọpụtara gosịrị na nya bụ ihe nkiri pụtara n’ụbọchị iri abụọ n’ise nke ọnwa August.

Dịka ozi nke na-esochi ya kwuru, ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ a bụ nke á sị̀ na ọ bụ ndị agha militant Jama’at Nusrat al-Islam wal Muslimeen (JNIM), ótù ndị agha yana Al Qaeda nwere njikọ, nke dị na obodo Burkina Faso kpatara.

Ozi ahụ kwuru na JNIM egbuola ndị karịrị narị abụọ, ma nwee mmerụ mmadụ ruru otu narị na iri anọ ahụ, mgbe ndị obodo ahụ na-enyere ndị nchekwa obodo ahụ aka igwu ala iji rụọ ụlọ ebe nche ha.

Ụfọdụ asafe teknuzu bekee na-akpọ bot account kesakwara nya bụ ihe ngosị.

N’ụbọchị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa August, War Noir, onye nnyocha ngwa agha nà nsogbu, biputara ihe ngosị ahụ. Ọ gbakwunye na ihe ngosị ahụ bụ nke mere na obodo Burkinabe nke Barsalogho.

Ọtụtụ ụlọ mgbasa ozi kwadoro nà mwakpo ahụ mere n’ụbọchị iri abụọ n’anọ nke ọnwa August. O tinyere na ụmụ nwanyị na ụmụaka sò na ndị e gburu.

Ụlọ ọrụ United Nations (UN) kọwara mwakpo ahụ dịka ihe nwute, ma gwa ọchịchị Burkina Faso ka ha hụ na a kpọchiri ndị mere nya bụ nwakpo na nga.

Na mgbakwunye, Edward Buba, onye ndu nke ọrụ mgbasa ozi nchekwa, wepụtara ozi nkwupụta na ụbọchị Mọnde nke na-akọwa na ihe ngosị ahụ esighị Naijiria.

“Ọ kwesịrị ka onye ọbụla mata na nwakpo ahụ emeghị na Naijiria. Kama, ọ bụ ihe nwute na ọ mere na obodo Afrịka dị nso na Naijiria, nke na-enwe nsogbu nchekwa,” Buba kwuru.

“Na òzùzú òkè, anyị na-arịọ ndị mmadụ ka ha gbado anya ịhụ na ha akwadoghị omume ndị omekome site n’ịgbasa ozi na-ezighị ezi,” o tinyere.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozi na nwakpo ahụ nke gosịrị ózú ọtụtụ ndị mmadụ nke a sịrị na o mere na Naijiria abụghị eziokwu. Mwakpo ahụ mere na Burkina Faso.

TAGGED: Burkina Faso, fact check in Igbo, mass grave, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 11, 2024 September 11, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

Did Tinubu attend same school as Alexander Zingman? Here is what we know

During the launch of the renewed hope mechanisation programme in Abuja on Monday, President Bola…

June 24, 2025

FACT CHECK: No, Nigeria didn’t deploy peace support mission to Israel

A Facebook video purports that Nigeria deployed troops for a joint peace support mission in…

June 24, 2025

FACT CHECK: Did lawmakers skip the national anthem during Tinubu’s Democracy Day speech?

A viral X post claims that Nigeria’s new national anthem was not recited during the…

June 13, 2025

FACT CHECK: Did a military coup oust Paul Biya as Cameroon’s president?

Reports of a military coup in Cameroon ousting President Paul Biya have gone viral on…

June 13, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Rárá, Pope Leo kò bẹ Tinubu kó tú Nnamdi Kanu sílẹ̀ ní àtìmọ́lé

Ẹni kan tí ó ń lo Facebook, ohun ìgbàlódé ibaraẹnisọrẹ orí ayélujára sọ pé Robert Francis Prevost, Pope Leo XIV…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

Ḿbà, Pope Leo áyọghị Tinubu kà ọ́ tọ́pụ̀ Nnamdi Kanu nà ǹgá

Ótù onye na Facebook ekwuola na Pope Leo na ụfọdụ ndị Bishop yọrọ onye isiala Bola Tinubu ka ọ tọpụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

No, Pope Leo no beg Tinubu to release Nnamdi Kanu

One Facebook user claim sey Pope Leo XVI and oda bishops join mouth beg President Bola Tinubu to release Nnamdi…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

A’a, Paparoma Leo bai nemi Tinubu ya saki Nnamdi Kanu ba

Wani mai amfani da Facebook ya yi ikirarin cewa Paparoma Leo na 16 da wasu limaman coci sun roki shugaban…

CHECK AM FOR WAZOBIA
June 10, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?