TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńgósị́ ébé ózú ńdị́ mmadụ̀ nọ n’àlà ílì ọ̀hà ésighị nà Naijiria
Share
Latest News
FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated
MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńgósị́ ébé ózú ńdị́ mmadụ̀ nọ n’àlà ílì ọ̀hà ésighị nà Naijiria

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published September 11, 2024 5 Min Read
Share

Ótù ihe nkiri na-egosị ózú mmadụ n’elu ibe ya n’ala ili dị obosara bụ nke a sịrị na ọ sitere na Naijiria.

Na ụbọchị iri atọ nke ọnwa August, ótù asafe na X nke aha ya bụ @emmasocket bipụtara ihe ngosị ebe ụmụ nwoke yì uwe ndị soja, na-agba ndị na-agba ọsọ egbe.

Asafe ahụ nwere ihe ngosị Simon Ekpa, onye na-ekwupụta onwe ya dịka onye na-eso ụzọ Nnamdi Kanu, onye ndu ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) nọ na nga.

N’ihe ngosị a esere na mpaghara na-enweghị mmadụ ọbụla na ya, a hụrụ ọtụtụ ozu ndị mmadụ juru n’ala ili.

“Ka ụwa mara agha nzuzo na-eme na ala Biafra,” onye a biputara na X.

“Anyị enweghịzị ike ịnagide nke a ọzọ. Naanị ụzọ esi apụta n’ara ọgbụgba a bụ ka obodo a bụ ogige ụmụ anụmanụ a na-akpọ Naijiria ikewa. BIAFRAN n’ụwa niile @simon_ekpa na ndị otu kabinet ya nọ ebe a iji nyere anyị aka.”

Dịka oge e dere akụkọ a, ozi ahụ enwetala ihe karịrị nkiri otu puku (1000 views), nkwenye iri asaa n’isii (76 likes), na nkesa iri isii (60 retweets).

N’ụbọchị iri atọ n’otu nke ọnwa August, @AmadiohaOd3671, otu asafe na X nke nwere nnukwu ndị na-ege ya ntị kesara nya bụ ihe ngosị ma kwuo sị na “atụmatụ ha abụghị naanị ime ka obodo niile bụrụ ndị okpuperechi Allah, kama ọ bu ịnakọrọcha ala niile yana ịchị Niajiria.”

N’agbanyeghị na asafe ahụ ekwughị onye ọ na amaikpe site na mbipụta ahụ, ọtụtụ okwu n’oge gara-aga egosịla n’ótú ọnọdụ okpukperechi nke onye isi ala na osote ya bụ mbo ime ka Niajiria bụrụ obodo okpukperechi Allah.

Ozi ahụ enwetala nkirị ruru puku iri anọ na atọ na ụma narị atọ (48.3k views), nkesa narị asatọ na iri na itolu (819 retweets), ntụnye ọnụ narị isii na iri abụọ n’asaa (627 comments), yana nchekwa ịgụ mgbe ọzọ na nkwenye kariri otu narị (100 likes and bookmark)

Mànà ògbúgbú ndị mmadụ à ò mèrè na Naijiria?

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

Iji chọpụta mgbe mbụ ihe ngosị a pụtara, TheCable jiri ngwa ọrụ Google Reverse Image Search were nyochaa ọtụtụ akụkụ nke ihe ngosị ahụ.

Ihe anyị chọpụtara gosịrị na nya bụ ihe nkiri pụtara n’ụbọchị iri abụọ n’ise nke ọnwa August.

Dịka ozi nke na-esochi ya kwuru, ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ a bụ nke á sị̀ na ọ bụ ndị agha militant Jama’at Nusrat al-Islam wal Muslimeen (JNIM), ótù ndị agha yana Al Qaeda nwere njikọ, nke dị na obodo Burkina Faso kpatara.

Ozi ahụ kwuru na JNIM egbuola ndị karịrị narị abụọ, ma nwee mmerụ mmadụ ruru otu narị na iri anọ ahụ, mgbe ndị obodo ahụ na-enyere ndị nchekwa obodo ahụ aka igwu ala iji rụọ ụlọ ebe nche ha.

Ụfọdụ asafe teknuzu bekee na-akpọ bot account kesakwara nya bụ ihe ngosị.

N’ụbọchị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa August, War Noir, onye nnyocha ngwa agha nà nsogbu, biputara ihe ngosị ahụ. Ọ gbakwunye na ihe ngosị ahụ bụ nke mere na obodo Burkinabe nke Barsalogho.

Ọtụtụ ụlọ mgbasa ozi kwadoro nà mwakpo ahụ mere n’ụbọchị iri abụọ n’anọ nke ọnwa August. O tinyere na ụmụ nwanyị na ụmụaka sò na ndị e gburu.

Ụlọ ọrụ United Nations (UN) kọwara mwakpo ahụ dịka ihe nwute, ma gwa ọchịchị Burkina Faso ka ha hụ na a kpọchiri ndị mere nya bụ nwakpo na nga.

Na mgbakwunye, Edward Buba, onye ndu nke ọrụ mgbasa ozi nchekwa, wepụtara ozi nkwupụta na ụbọchị Mọnde nke na-akọwa na ihe ngosị ahụ esighị Naijiria.

“Ọ kwesịrị ka onye ọbụla mata na nwakpo ahụ emeghị na Naijiria. Kama, ọ bụ ihe nwute na ọ mere na obodo Afrịka dị nso na Naijiria, nke na-enwe nsogbu nchekwa,” Buba kwuru.

“Na òzùzú òkè, anyị na-arịọ ndị mmadụ ka ha gbado anya ịhụ na ha akwadoghị omume ndị omekome site n’ịgbasa ozi na-ezighị ezi,” o tinyere.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozi na nwakpo ahụ nke gosịrị ózú ọtụtụ ndị mmadụ nke a sịrị na o mere na Naijiria abụghị eziokwu. Mwakpo ahụ mere na Burkina Faso.

TAGGED: Burkina Faso, fact check in Igbo, mass grave, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu September 11, 2024 September 11, 2024
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print
Leave a comment Leave a comment

Leave a Reply Cancel reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated

A video showing a bridge collapse incident is circulating across social media platforms, especially on…

July 24, 2025

MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021

The Nigerian Army says a viral video claiming the arrest of a foreign arms dealer…

July 24, 2025

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?