TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ òmékómè bù ńgwúgwú égo émeghị nà Naijiria
Share
Latest News
FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated
MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army
Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́
Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true
Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà
Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne
FACT CHECK: Kemi Badenoch’s claim that her children can’t get Nigerian citizenship is false
Naijiria ọ̀ kàgbùrù ńkwékọ́rị́tá àzụ́máhị́á àkụ̀ ọ̀nàtàràchí yá nà US nwèrè n’íhì ḿmáchí visa?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ òmékómè bù ńgwúgwú égo émeghị nà Naijiria

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published May 22, 2025 4 Min Read
Share

Ótù ihe ngosị nà soshal mịdia na-egosị ebe ndị omekome na-eke ngwugwu ego.

N’ihe ngosị chọrọ iru nkeji abụọ, a nụrụ ka olu nwaanyị na-akọtọ ndị ǹdú Naijiria maka ịnwe aka ná nya bụ ego a na-eke.

“Naijiria agwụla,” nwanyị ahụ kwuru.

“Kedụ ndị na-akwado ndi omekome a?”

Nwanyị ahụ ahụ gakwara n’ihu kwụọ na ndị ọjọọ a ka ndị Naijiria nwee ikike ime ihe ọbụla ha chọrọ ime n’enweghị ntaramahụhụ ọbụla.

Ọchịchị Naijiria gịnị na-eme, ọchịchị Tinubu kedu ihe na-eme?

E kesara nya bụ ihe ngosị nà WhatsApp.

CableCheck chọpụtara na e bipụtara nya bụ ihe ngosị nà YouTube n’ụbọchị abụọ nke ọnwa May.

Ebe ka ihe a mere, ótù onye jụrụ na soshal mịdia.

Ọtụtụ n’ime ntụnye ọnụ iri abụọ n’atọ kwuru na ọ bụ na Naijiria, ma jụọ ma ụlọrụ nchekwa Naịjiria bụ Department of State Services (DSS) ọ ma anya nya bụ ego a na-eke.

Kamgbe e bipụtara nya bụ ihe ngosị, o nwetala nkiri puku atọ na narị iri asaa n’iri asaa n’abụọ (3,772 views) na nkwenye iri ise n’ise (55 likes).

Na mbipụta ọzọ na ọba ozi Instagram, ótù onye ọnụ na-eru n’okwu á màrà dịka Olamisharp, bipụtara nya bụ ihe ngosị ma kọtọ ọchịchị Naijiria maka nkịtị ọ gbara nye nya bụ ozi.

“Ihe a bụ obodo ebe ndị na-emekpa ndị mmadụ ahụ na-egosi onwe ha…”Ọ dere dịka isiokwu nye ndị na-eso ya ruru puku iri abụọ n’abuo na ụma narị anọ (22.4k followers).

Ihe ngosị ahụ e nwetala nkiri karịrị narị isi.

Mana esere nya bụ ihe nkiri na Naịjiria?

ŃNYÒCHÁ

Cablecheck nyochara ụfọdụ akụkụ nya bụ ihe nkiri ma chọpụta na e buru ụzọ bipụta ya na ígwè ozi Facebook n’ụbọchị uri n’isii nke ọnwa December nke afọ 2024.

Na nya bụ ihe ngosị, a nụrụ ka olu nwoke na-ekwu na asụsụ Arabic. Anyị bịara jiri ìgwè ntụgharị asụsụ bụ Google Translate were tụgharịa nya bụ asụsụ.

“Lee ihe nkiri ebe ndị agha mịlịtrị a kpọrọ Al-Dagalo’s militia na ezu ego na ụlọ oba ego,” ịsiokwu sochịrị nya bụ ihe ngosị kwuru na asụsụ Arabic.

“Anyị n’eche na ndị agha Al-Dagalo’s militia bụ naanị izu ohi na imebisi ihe ka ha na-eme.”

Ihe ngosị ahụ nwetara nkiri puku ise n’uma narị isii (5.6k views).

Na ihe ngosị ahụ, ụmụ nwoke yi akwa ndi mịlịtrị na-egosi ngwugwu ego n’ime akpa, ugboala, tinyere ndị a wụsara n’ala.

CableCheck chọpụtara na ego ndị ahụ abụghị Naira.

Dịka olu ahụ kwuru, ozi ahụ na gosi ndị agha Sudan Rapid Support Forces (RSF), mgbe obodo ahụ gbanwere ego ha.

Òtù ahụ, nke onye ndú ha bụ Mohamed Dagalo, na-aluso òtù ndị agha obodo ahụ ághá ịji nara ha ọchịchị. Ọnọdụ a egbuọla ndị mmadụ ruru narị pụku ma chụpụ puku n’ebe obibi ha.

E nweela ọtụtụ izu ohi n’obodo ahụ n’ihi nya bụ agha nke a sịrị na ọbụ RSF na-ezu.

N’ọnwa Novemba gara-aga, ụlọ oba ego etiti obodo ahu bụ Sudan’s Central Bank, kwupụtara mbiputa ego ọhụrụ.

Ụlọ oba ego ahụ kwuru na nke a bu iji mee ka ndị obodo ha mepe akantu n’ụlọ oba ego iji beleta izu ohi ego n’obodo Sudan.

Otú RSF kọtọrọ mbiputa ego ọhụrụ, ma kwanye echiche n’ekwu na ndị nọ n’ọchịchị nwere uche óbì ọzọ ha ji ewebata ego ọhụrụ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe ngosị ebe ụmụ nwoke na egosi ngwugwu ego esighi na Naijiria, ọ mere na obodo Sudan.

TAGGED: bandits with cash, Factcheck in igbo, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu May 22, 2025 May 22, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: Video showing ‘bridge collapsing in Nasarawa’ is AI-generated

A video showing a bridge collapse incident is circulating across social media platforms, especially on…

July 24, 2025

MISINFO ALERT: Viral video of ‘foreign arms dealer’ in Zamfara is from 2021, says army

The Nigerian Army says a viral video claiming the arrest of a foreign arms dealer…

July 24, 2025

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị…

July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass…

July 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

Ókwú Badenoch nà ụ́mụ̀ yá ápụ̀ghị̀ ínwétá íkíké ị́bụ ńdị́ Naijiria bụ̀ àsị́

Kemi Badenoch, onye ndú òtù Conservative Party nke obodo United Kingdom, ekwuola na ọ gaghị enyenwu ụmụ ya ikike ịbụ…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Kemi Badenoch claim sey her children no fit get Nigerian citizenship but she no tok true

Kemi Badenoch, leader of di United Kingdom Conservative Party, claim sey she no fit pass her right of Nigerian citizenship…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Irọ́ ni Kemi Badenoch pa pé òfin kò fààyè gba àwọn ọmọ òhun láti di ọmọ Nàìjíríà

Kemi Badenoch, arábìnrin tó jẹ́ olórí ẹgbẹ́ òsèlú alátakò tí wọ́n ń pè ní Conservative Party ní orílẹ̀ èdè United…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

Maganar Kemi Badenoch na cewa ‘ya’yanta ba za su iya samun shaidar zama dan Najeriya ba karya ne

Kemi Badenoch, shugabar jam'iyyar masu ra'ayin rikau ta Burtaniya, ta yi ikirarin cewa ba za ta iya mika hakkinta na…

CHECK AM FOR WAZOBIA
July 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?