TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east
Share
Latest News
FACT CHECK: No evidence US struck Burkina Faso with missiles
FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020
FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀
Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok
Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC
È nwélá ọ́nwụ́ ńdị́ ụ́kà nà Naijiria n’áfọ̀ 2025 kárị́á ọ́nụ́ ọ́gụ́gụ́ ndị́ Palestinian é gbụ́rụ́ na Gaza?
Na true sey dem kill Christians for Nigeria dis year pass Palestinians for Gaza?
Ǹjẹ́ àwọn ẹlẹ́sìn ìgbàgbọ́ tí wọ́n pa ní Nàìjíríà ju àwọn ọmọ Palestine tí wọ́n pa ní Gaza lọ ní 2025?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ǹché nà-ákpáká ụ́lọ̀ ésiteghị nà south-east

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published August 7, 2025 3 Min Read
Share

Ótù onye na Facebook ekwuola na ihe ngosị ebe mmadụ na-agbaka ụlọ obibi mmadụ mere na south-east.

N’ụbọchị iri abụọ n’isii nke ọnwa Julaị, Uche Nworah, onye ji Facebook ebipụta ozị, jiri ihe ngosị were kwupụta ótú “àgwà tigbuo zogbuo” si arị elu na south-east n’aha na a “na-ememila enweghị nchekwa”.

“Anyị emeputala omenala tigbuo zọgbuo na oghere ime mpụ na mpaghara south-east n’aha n’anyị na-ememila enweghị nchekwa. Onye ọbụla nwere egbe nke kpuchiri ịsị ya nweziri ike ịwakpo mmadụ n’ụlọ ya, ma mee ihe n’adịghị mma dịka anyị hụrụ na ihe ngosị a,” isiokwu ihe ngosị ahụ dere.

“Enweghị ụzọ ziri ezi ejizi eme ihe, ùgwù ndị mmadụ bụzi nke anaghịzị asọpụrụ. Kedu mgbe ihe ndị a ga-akwụsị? Ọ bụrụkwanụ na ụmụaka nọ n’ụlọ ahụ.”

A screenshot of the Facebook post

Ozi ahụ nwetara ntụnye ọnụ karịrị narị abụọ, nkwenye narị anọ na nkesa iri anọ n’asatọ.

Onye a, bipụtara ozi a n’ihu nnukwu enweghị nchekwa ana ahụta n’ufọdụ mpaghara south-east.

ŃNYÒCHÁ

CableCheck jiri ngwa ọrụ Google Lens were nyochaa akụkụ ihe ngosị ahụ nke Nworah bipụtara ma chọpụta na otu onye akpọrọ @MichealFrosh32 bụrụ ụzọ bipụta nya bụ ihe ngosị na X n’ụbọchị iri abụọ n’ise nke ọnwa Julaị.

Onye a ji X ebipụta ozi, kwụrụ na ndị uwe ojii n’aha “operation flush” na Adọ Ekiti, wakporo ụlọ mmadụ na okporo ụzọ Adebayo nke dị na isi obodo Ekiti steeti.

A screenshot of the X post

“Taa, ndị uweoji ‘operation flush’ nwara izu ohi n’ihu onye ọbụla n’okporo ụzọ Adebayo dị na Adọ Ekiti, site na-ịwakpo ụlọ ahụ n’ike.
Nke a abụghị mbụ ha na-eme ihe dị ótú a, mana taa, anyị nwere ihe akaebe iji kwuru ọnụ anyị,” onye a dere na X.

N’ihe ngosị ahụ, otu n’ime ndị uweoji ahụ yi ákwà oji e dere “special force”.

Ozi ahụ kpalitere ọtụtụ ntụnye ọnụ na X, ebe ndị uweoji tụnyere ọnụ na nya bụ ihe ngosị.

Ka ótù ụbọchị e jiri bipụta ihe ngosị ahụ gasịrị, ndị uweoji Ekiti steeti bipụtara ozi na onweghị ngalaba ọbụla a na-akpọ “operation flush” dịka ihe ngosi X ahụ kwụrụ.

Na mbiputa ahụ, Abutu Sunday, onye nkwuchịta ọnụ ndị uweoji na Ekiti, kwuru na Joseph Eribo, onye komịshọna uweoji na steeti ahụ, enyela iwu ka-enyocha ebe ihe ngosị ahụ si.

“Ndi uweoji enweghị ngalaba a kpọrọ operation flush,” Sunday dere oge ahụ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Nwakpo ahụ emeghị na south-east.

TAGGED: Ekiti state, fact check in Igbo, news in Igbo, Security operatives, soutj-east

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu August 7, 2025 August 7, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

FACT CHECK: No evidence US struck Burkina Faso with missiles

A social media user has claimed that United States missiles hit Burkina Faso, prompting Ibrahim…

August 27, 2025

FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020

Ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) akọwala n'ihe ngosi ebe onye ọ̀kwà ụgbọala ụkwụ atọ…

August 22, 2025

FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀

Àjọ tó ń rí sí ààbò àwọn awakọ̀, àwọn tí wọ́n ń rìn lójú ọ̀nà…

August 22, 2025

Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok

The Federal Road Safety Corps (FRSC) don describe one viral video wey show as keke…

August 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020

Ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) akọwala n'ihe ngosi ebe onye ọ̀kwà ụgbọala ụkwụ atọ na ndị ọrụ ya na-enwe…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀

Àjọ tó ń rí sí ààbò àwọn awakọ̀, àwọn tí wọ́n ń rìn lójú ọ̀nà tí ọkọ̀ ń rìn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok

The Federal Road Safety Corps (FRSC) don describe one viral video wey show as keke rider dey open eye for…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC

Hukumar kiyaye hadurra ta kasa (FRSC) ta bayyana wani faifan bidiyo da ke nuna wani direban babur mai uku yana…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?