TheCable Fact Check
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Reading: Íhé ńgósị́ ébé Ibrahim Traore nà-ákàgbú ị́na ụ̀tụ́ nà Burkina Faso bụ̀ áká ọ́rụ AI
Share
Latest News
FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020
FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀
Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok
Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC
È nwélá ọ́nwụ́ ńdị́ ụ́kà nà Naijiria n’áfọ̀ 2025 kárị́á ọ́nụ́ ọ́gụ́gụ́ ndị́ Palestinian é gbụ́rụ́ na Gaza?
Na true sey dem kill Christians for Nigeria dis year pass Palestinians for Gaza?
Ǹjẹ́ àwọn ẹlẹ́sìn ìgbàgbọ́ tí wọ́n pa ní Nàìjíríà ju àwọn ọmọ Palestine tí wọ́n pa ní Gaza lọ ní 2025?
Yi Kiristoci da aka kashe a Nijeriya a 2025 sunfi na faltunawan dake Gaza?
Advertisement
Aa
TheCable Fact CheckTheCable Fact Check
Search
  • Home
  • Fact Check
  • Fake News
  • Check Am For Wazobia
Follow US

Íhé ńgósị́ ébé Ibrahim Traore nà-ákàgbú ị́na ụ̀tụ́ nà Burkina Faso bụ̀ áká ọ́rụ AI

Janefrances Chibundu
By Janefrances Chibundu Published April 17, 2025 4 Min Read
Share

Ótù asafe na TikTok bụ @panafrica069 ebipụtala ihe onyonyo na-ekwu na Ibrahim Traore, onye isi ndị agha mịlịtrị na-achị obodo Burkina Faso, kagburu ndị mmadụ bi n’obodo ahụ ịkwụ ụtụ.

N’ime ihe onyonyo ahụ ebiputara na TikTok n’ụbọchị mbụ nke ọnwa April, a nụrụ ka otu olu na-ekwu na Traore agbanwela Burkina Faso ka ọ bụrụ òbòdò mbụ na Afrịka nke anaghị ana ụtụ.

Ihe ngosị a nke isiokwu ya bụ “Traore ekwupụtala Burkina Faso Dịka òbòdò anaghị ana ụtụ” bụ nke e kesagoro ihe karịrị ugbọrọ puku asaa (7,000 shares), ma nwetakwa nkwenye iri abụọ n’itoolu (29,000 likes) na ntụnye ọnụ puku abụọ (2,000 comments).

N’ime ihe ngosị ahụ, otu onye nta akụkọ ejiri ngwa ọrụ AI mepụta ka a hụtara ka ọ na-agụpụta nya bụ ozi, ebe ótù olu n’okpuru gara n’ihu na-ekwu, dịka ọtụtụ ihe ngosị ndị ọzọ na-egosi na ihe onyonyo ahụ.

Ozi ahụ kwukwara na Elon Musk, onye nwe ọba ozịi X, na-akwado iwebata uloọrụ ya na obodo ahụ n’ihi iwu ụtụ nke Burkina Faso.

Ozị ahụ kwukwara na obodo ndị ọcha na-akwado ntaramahụhụ nye Burkina Faso iji kwụsị nya bụ atụmatụ.

Otu asafe a na TikTok biputakwara atụmatụ ọchịchị aka ike nke Traore ekwupụtabeghị.

Kamgbe Traore were oche dịka onye isi obodo Burkina Faso n’ọnwa Septemba nke afọ 2022, ọtụtụ ihe ngosị e jiri AI mepụta apụtala ihe na soshal media, iji gosị ọchịchị ya n’ụdị dị mma.

Iwu nke onye isi obodo ahụ ekwuputaghị bụ nke ndị mmadụ kwuru na o kwuputara. Ndị nnyocha okwu kwụru na ọ bụ aka ọrụ ndị si mba Russia nọ na ogige ahụ.

ŃNYÒCHÁ

Ótù akụkụ na nya bụ ihe ngosị si TikTok gosịrị Traore ebe o na-ekwu okwu na ọgbakọ. CableCheck jiri ígwè Google Lens were nyocha nya bụ ihe ngosị ma chọpụta n’otu ozi ahụ bụ nke si na webusite Africa24TV.

Ihe ngosị ebe Traore na-ekwu okwu na ọgbakọ Academic Excellence Day bụ́ ńké é jiri wee sochie okwu ahụ nke na-ekwu na onye isi obodo ahụ ekwupụtala iwu na-akagbu ina ụtụ n’obodo ahụ.

Na ọgbakọ Academic Excellence Day ahụ, Traore ekwughị ihe ọbụla gbasara ụtụ, kama ọ kelere ndị nkuzi maka ọrụ ha na ịhụnanya ha nye Burkina Faso.

A screenshot of the TikTok video

CableCheck nyochakwara ụlọ ozi nke obodo ahụ nakwa asafe soshal mịdia ndị isi ọchịchị na Burkina Faso, ma onweghị nke gosịrị ebe Traore kwupụtara nkagbụ ịna ụtụ n’obodo ahụ.

A screenshot of Traore on the Academic Excellence Day event

N’ọnwa Decemba nke afọ 2024, ụlọ omeiwu nke obodo ahụ kwadoro iwu ego nke Burkina Faso. Obodo ahụ nwere ọtụtụ iwu gbasara ụtụ nke a na-atụgharị uche ma ga-akwado n’ụlọ omeiwu ha. Otu n’ime iwu ndịa bụ na site n’ọnwa Januwari nke afọ 2025, ndị niile n’ere ihe na webusite ọbụla ga-akwụ ụtụ tax.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe onyonyo na-ekwu na Traore kagburu ịkwụ ụtụ tax na Burkina Faso bụ nke aka ọrụ AI.

TAGGED: Burkina Faso, Factcheck in igbo, Ibrahim Traore, news in Igbo

Please send your feedback, claims to fact check and corrections requests to [email protected]

Janefrances Chibundu April 17, 2025 April 17, 2025
Share this Article
Facebook Twitter Email Copy Link Print

POPULAR POSTS

Advertisement

FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020

Ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) akọwala n'ihe ngosi ebe onye ọ̀kwà ụgbọala ụkwụ atọ…

August 22, 2025

FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀

Àjọ tó ń rí sí ààbò àwọn awakọ̀, àwọn tí wọ́n ń rìn lójú ọ̀nà…

August 22, 2025

Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok

The Federal Road Safety Corps (FRSC) don describe one viral video wey show as keke…

August 22, 2025

Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC

Hukumar kiyaye hadurra ta kasa (FRSC) ta bayyana wani faifan bidiyo da ke nuna wani…

August 22, 2025
Advertisement
Advertisement

YOU MAY ALSO LIKE

FRSC sị̀ nà íhé ńgósị́ ébé ńdị́ ọ́rụ́ ha nà ónyé ọ̀kwà ụ́gbọ́àlà nà-ènwé ńsògbụ́ mèrè n’áfọ̀ 2020

Ngalaba Federal Road Safety Corps (FRSC) akọwala n'ihe ngosi ebe onye ọ̀kwà ụgbọala ụkwụ atọ na ndị ọrụ ya na-enwe…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

FRSC sọ pé 2020 ni ìjà láàárín àwọn òṣìṣẹ́ àwọn àti onikẹkẹ maruwa tí áwọn ènìyàn ń pín fídíò rẹ̀ ṣẹlẹ̀

Àjọ tó ń rí sí ààbò àwọn awakọ̀, àwọn tí wọ́n ń rìn lójú ọ̀nà tí ọkọ̀ ń rìn àti…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

Viral video wey show kasala between keke rider and our officers na from 2020, na so FRSC tok

The Federal Road Safety Corps (FRSC) don describe one viral video wey show as keke rider dey open eye for…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

Bidiyon bidiyo na arangama tsakanin direban babur, jami’an mu daga 2020, in ji FRSC

Hukumar kiyaye hadurra ta kasa (FRSC) ta bayyana wani faifan bidiyo da ke nuna wani direban babur mai uku yana…

CHECK AM FOR WAZOBIA
August 22, 2025

CableCheck seeks to provide reliable tools and resources for readers to tackle the menace of fake and misleading materials constantly pushed into the public space from various sources. We monitor the accuracy of claims made in traditional and social media. We also provide a tracker to hold politicians and policymakers accountable for the plans and promises they make to the public. CableCheck is a project of the Cable Newspaper Journalism Foundation (CNJF), supported by the MacArthur Foundation and implemented by TheCable newspaper.

Follow US: 

LINKS

  • Contact
  • About Us
  • Non-Partisanship Policy
  • Funding
  • Correction Policy
© Copyright TheCable. All Rights reserved.
Welcome Back!

Sign in to your account

Lost your password?